Killings in Owerri: Etu onye omekome si gbuo nne m n'Owerri - Ambrose Nwaogwugwu

Ebe foto si, Ambrose Nwaogwugwu
Ambrose Nwaogwugwu bụ otu n'ime ụmụ ise Anna Nwaogwugwu mụrụ akọwaala ka e siri gbuo nne ha na New Owerri, dị n'Imo Steeti ụbọchị Tọzde.
Ambrose bụ onye ji anyammiri jụrụ n'anya gwara BBC na ya bụ ihe gbagwojuru ha anya.
Ọ sị "n'isi ụtụtụTọzde ka nwanne anyị ya na mama ya bi kpọrọ na-ekwu na otu nwoke bịara n'ụlọ were mma gbukasia mama ahụ".
Ambrose sị na nwaamadị ahụ kpara arụ ahụ bu ụzọ were ọkpa gbakachaa ụzọ ụlọ ha wee banye gbuwezie nne ya mma.
Nwata ya na nne ya bi gbapụrụ ma na-eti mkpu, nke mere ndị mmadụ jiri gbakọta bịa jide onye mgbuisi ahụ kpụga ya n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na New Owerri bụ ebe ha ji ya eji ugbua.
Mgbe BBC jụrụ Ambrose ka ndị ogbe ama onye mere ihe a, ọ sị na ndị ogbe ma ya bụ nwaamadị nke ọma.

Ebe foto si, Ambrose Nwaogwugwu
A jụkwara ya ka ahụ adịkwa ya bụ nwaamadị mma.
Ọ zakwara na ndị ogbe ma ya bụ nwaamadị ka onye ahụ dị nke ọma.
Ọ sị na ha amaghị ihe mere ya bụ nwaamadị ji kpaa ụdị agwa ahụ mana na ndị uweojii ka na-etinye anya na ya.
Ọ sị na kemgbe ha kpọgachara ya bụ nwaamadị n'aka ndị uweojii, na ha nwebeghi ohere mara ihe ndị uweojii chọpụtara na ya bụ okwu.

Ebe foto si, Ambrose Nwaogwugwu
Ọ sịkwa na ụdị ihe ahụ emetubeghị ebe ahụ mbụ.
Ọ sị na ya echeghị na ya bụ ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ambrose si PDP gafee APC n'ọnwa Febụwarị 2021.









