Nnamdi Kanu's trial: Ọkaikpe amachiela ndị ọrụ nchekwa iwuju n'ụlọikpe n'Umuahia

Aloy Ejimakor

Ọkaikpe Anya Benson bụ onye kpere ikpe Nnamdi Kanu n'Ụmụahịa gbarụrụ ihu maka etu ndị ọrụ nchekwa siri majuo n'ụlọikpe, dika ha na-eme oge ọbụla ikpe ahụ na-aga n'ihu.

Ọkaịkpe Anya hụrụ ndị ọrụ nchekwa dịka ha jiri majuo n'ime nakwa gburu gburu ụlọikpe ahụ nakwa ụzọ Ikot Ekpene nyere iwu machiri ndi ọrụ nchekwa ịbịa ụlọikpe ahụ n'ọnụdụ ahụ n'oge ọzọ.

Ọ jụrụ ihe mere e jiri nwee ụdịrị nchekwa ahụ n'agbanyeghi na onweghị ọgbaghara ọbụla maọbụ agha.

Ọ dịkwa na itinye ụdịrị nchekwa ahụ dị ka ibuso ọha agha.

"Onye ka unu na-atu ụjọ na ihe na-ehi ndị ọrụ nchekwa ụdịrị egwu mere ha jiri juu n'ụlọikpe oge ọbụla ikpe a ruru?" bụ ajụjụ ọ jụrụ.

Ọkaikpe Anya sị na ndi Abia na-eruwe isi ma nye iwu ka anwakwana anwa nwuchie mamdu n'ime ụlọikpe ahụ.

Ọ sị na sọsọ ma ụlọikpe kpọọ ndi ọrụ nchekwa oku ka ha ga-eji bịa n'ụlọikpe ahụ.

Eyigharịala ikpe Kanu ruo ụbọchị iri nke ọnwa Decemba

Dịka eyigharịrị ikpe ahụ gaa ụbọchị iri nke ọnwa Decemba, Ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor kelere Ọkaikpe dịka o siri nye iwu ahụ o nyere.

Ọkaikpe Anya mere nyigharị ahụ dịka ndi ọkaiwu niile kwuru na ha chọrọ ka o mee etu ahụ.

Ndị ọrụ nchekwa juru Ụlọikpe Ukwu n'Ụmụahịa

Cheta a ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndị DSS, ndị uweojii, ndi agha na ndị Civil Defence amajuola n'ụzọ nakwa gburugburu ụlọikpe ukwu dị n'Ụmụahịa dịka ikpe Nnamdi Kanu ga-aga n'ihu taa bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Nọvemba.

Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ime ụgbọala Hilux atọ gbochiri ụzọ Ikot Ekpene n'ebe a na-akpọ BCA Junction, nakwa ebe ụzọ Ikot Ekpene zutere ụzọ Finbaars.

Ụzọ Ministrị Ikpe
Nkọwa foto, Ụzọ Ministrị Ikpe

Ndị na-esi ụzọ ahụ na-esizi ụzọ ọzọ ije laghachite ụzọ Ikot Ekpene.

Ndị ji ụkwụ agafe ụzọ ahụ, nke ọkankụ ha bụ ndị ọrụ oyibo, na-aza ọtụtụ ajụjụ tupu enye ha ohere maọbụ si ha laghachie.

Mgbochi ụzọ a butere ọtụtụ kpachi kpachi n'ụzọ Ministri of Justice, ụzọ Finbaars, ụzọ Stadium Avenue nakwa ụzọ Azikiwe.

Stadium Avenue
Nkọwa foto, Ụzọ Stadium Avenue

Ndị ọrụ nchekwa ruru iri ise nọ na gburu gburu ahụ nakwa n'ime Ụlọ Ikpe Ukwu ahụ ebe onye ntaakukọ anyi hụrụ ụgbọala ndị nchekwa ise.