Nnamdi Kanu Trial: Lee ihe ndị nwereike ịme ka ikpe ya ghara ịga n'ihu

Nnamdi Kanu na onye ọkaiwu

Ebe foto si, Reuters

Dịka ala Naịjirịa niile na-echebiri ụbọchị a ga-ekpe Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob ikpe, ihe ọhụrụ apụtala.

Ụlọikpe ukwu bụ ebe a nọ ekpe ikpe ahụ na-akwado ịga oge ezumike ha n'ụbọchị 26 nke Julai rue ụbọchị 17 nke Sepụtemba.

N'otu aka ahụ ewepụtakwara ụbọchị 26 ọnwa Julaị dịka ụbọchị a ga-amalitekwa ikpe Nnamdi Kanu.

Otu onye ọkaikpe achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC Igbo na usoro ezumike nke ụlọikpe na-aga kwa afọ abụghị ihe ọhụrụ.

Ọ sị "ezumike a na-adanyekarị n'etiti ọnwa Julaị maọbụ Ọgọst rue ọnwa Sepụtemba".

Gịnị ga-emezi ikpe Nnamdi Kanu?

Ndị ọkaikpe nọ n'ime ụlọikpe.

Ebe foto si, Nigerian Bar Association

Ọkaikpe ahụ gara ihu kọwaa ihe abụọ nwereike ime ka ikpe Nnamdi Kanu gaa ihu.

O kwuru sị "E nwere ọkaikpe ndị a na-ahọpụta iche ịnụrụ ikpe ndị mmadụ ma ụlọikpe gawa ezumike a

Ikpe ya ga-aga n'ihu maọbụru na ọkaikpe ji okwu ya aka eso na ndị ahọpụta iche ga-arụ ọrụ n'ezumike a"

O kwukwara na e nwereike gaa ihu n'ikpe a maọbụrụ na ekpebie na ikpe ya dị mkpa n'ala Naịjirịa niile.

"E wezụga ihe ndị a, Nnamdi Kanu ga-eche ka ndị ọkaikpe nata ezumike tupu a nụrụ ikpe ya" ka o kọwara.

Ihe mere anyị ji kpọọ Ohaneze oku n'ikpe Nnamdi Kanu - Malami

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkaikpe Binta Nyako nyere Nnamdi Kanu ohere isi be ya n'abịa ikpe n'afọ 2017

Ọkaikpe ukwu Naịjiria aha ya bụ Abubakar Malami anabatala etu otu Ohaneze ndị Igbo si hibee ọgbakọ ndị ọkaiwu ha ga-elebanya n'etu a ga-esi kpe onye ndu Ipob Nnamdi Kanu ikpe dịka iwu Naịjirịa kwadoro.

Malami kwuru ka otu a Ohaneze kpokọbara jiri obi ọcha were nyocha ma wegara ndị ime obodo mpụtara ikpe Nnamdi kanu n'asụsụ dị iche iche ha ga-aghọta n'ụbọchị Jụlaị iri abụọ na isii Jụlaị 26, 2021.

Akụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru Malami bụ Umar Jibrilu Gwandu nyere ndị nta akụkọ kwuru na otu Ohaneze Ndigbo egosila na ha kwenyere n'idi n'otu Naịjirịa,ma na-ekwukwa na ha kwenyere n'usoro inye ezi ikpe.

Akwụkwọ ozi ahụ kwụkwara Ohaneze ndị Igbo gosiri na ha ekwenyeghị n'etu otu Indigenous People of Biafra si achọ ihe ha na-achọ, ha ekwenyeghị n'iji ụzọ tiguo zọgbuo ekwu maka ihe ha chọrọ ka e mere ha.

Aha onyonyo, Paul Achalla

Mgbe BBC kpọtụrụ Ohaneze ndị Igbo ka ha mara ka ha si nabata ozi a, Alex Ogbonnia bụ ọnụ na-ekwuru Ohaneze ndị Igbo kwuru na ha nabara ozi a nkeọma.

O kwukwara na ndị ọkaiwu Ohaneze kpokọbara bụ ndị ga-aga nyochaa ka ikpe ahụ ga-esi ga.

Ogbonnia katọkwara etu ndị mmadụ si na-ekwu n'elu soshal midia na Ohaneze na Malami nwere nzụkọ ebe ọ gwara ha bia nyochaa ka ikpe Nnamdi Kanu ga-esi gaa.

Aha onyonyo, George Obiozor: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị

Cheta na Malami kwputere n'ụbọchị June 29 na gọọmentị etiti nwụchiri Nnamdi Kanu ụbọchị ụka(June 27, 2021) maka ebubo ịkpa nkata ikewapụ Biafra na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ọkaiwu nọchitere Gọọmentị etiti bụ Shuaibu Labaran gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ma rịọ ka e jichie Kanu.

Labaran kwuru na ọ dịghị mma ka a hapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa n'ihi na mbụ a hapụrụ ya n'afọ 2017 mana ọ gbara ọsọ.

Cheta na Kanu gbapụrụ ọsọ na Naijiria n'ọnwa Septemba afọ 2017 dịka ndị agha Naijiria wakpochara be nna ya n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

A kpụpụburu Kanu Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja maka ịzara ọnụ ya n'ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria site ikpọ oku ka e kepụta Biafra na Naijria.

Mana n'ọnwa Eprelu afọ 2017, a tọhapụrụ ya nwa oge maka ọnọdụ ahụike.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: