Information blackout: Ihe mere ọtụtụ ụlọ akwụkwọ mgbasa ozi na Naịjirịa jiri dee maka atụmatụ a

Ọtụtụ akwụkwọ mgbasaozi a kpọrọ "Nigerian Newspaper" na Bekee dere ozi gosiri ebumnuche ha banyere ụfọdụ iwu ga-etinye anya n'ọrụ ha ndị omeiwu na-eleba anya ugbua.
E tinyere ozi a n'ihu akwụkwọ mgbasa ozi dị iche iche dị ka Punch, Vanguard, The Nation, ThisDay, Guardian, Daily Sun.
Ọ bụ otu atọ na-ahu maka ndị ntaakụkọ bụ "Nigeria Union of Journalists", "Nigerian Guild of Editors" nakwa "Newspaper Proprietors' Association of Nigeria" tinyere ya.
Ozi a sị "Mkpuchi ozi", rụtụrụ aka na atụmatu a kpọrọ "NPC and NBC (Media) Act amendment bills" ndị omeiwu na-etinye anya bu nke a na-eche ga-egbochi ọha inwete ozi dịka ikike ruru ha.
Ha sị: "Ọ bụghị maka ndị ntaakụkọ. Ọ bụ maka ikike ọha nwere ịmata ihe na-eme na ikwu okwu."
Ọ bụ Olusegun Odebunmi bụ onyeisi ngalaba na-ahụ ma mgbasa ozi n'ụlọ omeiwu obele bu onye binyere aka n'iwu a.
Ya bụ iwu ka nọ n'ọnọdụ ndị ọha itinye ọnụ na ya ugbua.
Ọ bụ n'ogige otu a kpọrọ "Nigerian Press Organisation" (NPO) ka esi mee ozi a.
Kedụ ihe di n'iwu a?
Iwu a, dịka o siri kwụrụ, bụ iji gbanwe iwu na-achị ndị ntaakụkọ na Naịjirịa.
Ọ bụ iwu a kpọrọ Nigeria Press Council (NPC) ka atụmatụ a ga-esi bịa.
Atụmatụ mgbanwe NPC a sị na ọ ga-ahụ n'ụlọ ọrụ ntaakụkọ nke edemede ji eziokwu na ụzọ ziri ezi arụ ọrụ ha."
Atụmatụ nke NBC a dịkwa nke NPC mana ọ bụ ụlọ ntaakụkọ redio na televishọn.
Ikpuchi anyị ọnụ!
Otu Nigerian Press Organisation na-eche na atụmatụ a bu iji kpuchie ndị ọrụ ntaakụkọ na Naịjirịa ọnụ ka ha ghara ikwu ihe ha kwesiri ikwu.
Mana Sinetọ Ajibola Basiru kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.
Ọ sị: "Na anyị na-ahazi ọrụ ndị ntaakụkọ abụghị na anyị chọrọ ịpịchị ha ọnụ."














