Nnamdi Kanu Update: Ihe Buhari gwara ndị ndu ala Igbo gara rịọ ya ka ọ tọhapụ Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ihe ndị ndu ala Igbo na-arịọ ya, nke bụ ka ọ tọhapụ Mazị Nnamdi Kanu, siri ike, mana ọ ga-ama ihe ọ ga-eme banyere ya.
Nke a bụ ihe si n'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina wepụtara n'ehihie Fraịde.
Buhari kwuru nke a dịka ya na ụfọdụ ndị ndu ala Igbo nwere ọgbakọ taa n'Aso Rock, Abuja.
O kwuru sị: "Kamgbe afọ isii m banyere n'ọchịchị, onwebeghị oge m tinyere anya maọbụ tinye aka n'ọrụ ndị ọkaikpe maọbụ n'ihe na-aga n'ụlọikpe."
"Oge Nnamdi Kanu gbapụrụ na Naịjirịa, e mechaa jide ya ọzọ ma kpụlata ya, ekwuru m na ọ ka mma ka ọ gaa ụlọikpe zara ọnụ ya."
"N'uche m, ọ bụ ihe ọma inye ya ohere ahụ ka ọ ga zara ọnụ ya."
Buhari gwara Mbazulike Amaechi bụ onyeisi ndị bịara izute ya sị: "Chineke enyela gị ogologo ndụ, nyekwa ume nakwa ụbụrụ zuru oke iji cheta ihe niile nke ọma.

Ebe foto si, Presidency
"Ihe a ị rịọrọ m tara nnukwu akpụ, mana aga m etinye ya anya."
N'okwu ya. Mbazulike Amaechi gwara Buhari na ya abụghị onye IPOB, mana ya bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ọma n'ala Igbo."
"Ọgaghị amasị m ịhapụ ụwa a ma ọ bụrụ na udo alaghachighi na Naịjirịa," Amechi kwuru.
"Achọrọ m ka gị bụ onyeisiala bụrụ onye a ga-echeta na ọ hụrụ ebe Naịjirịa na-agba ọkụ ma menyụọ ya bụ ọkụ."

Ebe foto si, Presidency
Ndị sonyere n'ọgbakọ a gụnyere: Bishọp Sunday Onuoha, Mazị Tagbo Amaechi, Ọkaiwu Goddy Uwazurike, aka chịburu Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife, na ichie Mbazulike Amaechi.
Ndị ọzọ gụnyere Mịnịsta Sayensị na Tekịnụzụ bụ Ogbonnaya Onu; Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige; Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi bụ Geoffrey Onyeama, na Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Chukwuemeka Nwajuiba.
Lee Etu ikpe Nnamdi Kanu si gaa na Novemba 10 n'Abuja

Ebe foto si, Alloy Ejimakor Facebook Page
Ikpe onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu agaghị n'ihu taa.
Ndị ọkaiwu ya ji iwe pụọ n'ụlọikpe High Court dị n'Abuja ebe a na-ekpe nwamadi ahụ ikpe.
Nnamdi Kanu gwara ọkaikpe na-ekpe ikpe ahụ bu Binta Nyako na e kweghị ka ọkaiwu si mba Amerịka bata ụlọikpe
E yighariala ikpe ya ruo January 19 na 20 nke fọ 2022.
Ndị ọkaiwu Mazi Kanu na-ewe iwe makana mgbe ha ji iwe pụọ n'ụlọikpe , ọkaikpe Nyako yigharịrịrị ikpe Nnamdi n'azụ ha.

Ka e yigharịri ikpe Kanu, ndị mmadụ malitere mewe ngagharịwe n'ihu ụlọikpe dị n'Abuja.
Ụfọdụ na-agụ na Nnamdi Kanu bụ onye nzọpụta ha, ebe ndị ọzọ na-agụ na ha chọrọ idi n'otu Naịjirịa.

E mechara ndị uweojii bia chụsasia ha ndị niile na-eme ngaghariwe ahụ.
Etu ndị mmadụ si nute Abuja ịbia hụ ka ikpe Nnamdi Kanu si aga

Taa ka a tụrụ anya ikpe gbasara etu a ga-esi wepụ onye ndụ Indigenous People of Biafra Ipob bụ Nnamdi Kanu site n'ụlọ mkpọrọ Department for State Service gaa n'ụlọ mkpọrọ nkịtị.
Ọkaiwu ya bụ Nnaemeka Ejiofor gwara BBC Igbo na ọ na-ahia ezigbo ihụ Nnamdi Kanu na mkpọrọ DSS.
N'ọnụ ya, " DSS chọrọ ka ha dosa kanu sọ ya ka ọ ghara inwe onye ọbụla ya na ya ga-enwe mmekọrịta , ka isi wee gbakaa ya."
O kwuru na ọkaikpe Justice Nyako ga-agwa ha ma ndị gọọmenti etiti a ga-erubere ya isi n'iwu ọbụla maọbụ ikpe ọ ga-ekpe taa."

Ọkaiwu Kanu bụkwa Maxwell ọkpara kwuru na gọọmenti etiti ga-agwa ọhaneze etu Nnamdi Kanu si bata na mkpọrọ DSS.
Ọ kwuru na ọ bụrụ na aghọtaghị etu Nnamdi Kanu si bata n'aka DSS site na mba Kenya , " o nweghị ikpe a na-ekpe anyị."

O kwuru na et ihe si dị njọ bụ na, ndị DSS enyeghị Kanu ohere ka dọkịta nke ya lekọta ya.
O kwukwara na ọ bụrụ na gọọmenti etiti na-eme ihe ziri ezi ha kwesiri inye ndị mmadụ gụnyere ndị ọkaiwu nakwa ndị ntaakụkọ ha banye n'ụlọikpe hụ ka ya bụ ikpe si aga.
Ihe mere ndị Igwe biara Ikpe Nnamdi Kanu taa
Ụfọdụ ndị igwe ala Igbo biara ihụ ka ikpe nke taa ga-esi gaa.
Ụfọdụ n'ime kwuru na ndị DSS ekwebeghị ka ha banye ụlọikpe belụ ma ha kọwara onwe ha ọfụma.
DSS mechara kwuo na ha ga-ekwe ka naani ndị igwe abụọ nke gụnyere Chukwuemeka Ezeife banye n'ụlọikpe.
Cheta na ọkaiwu Kanu bụ Alloy Ejimakor kwuru na a naghị atụ anya na Nnamdi Kanu ga-apụta n'ụloikpe taa.
E yigharịrị ikpe Nnamdi Kanu ruo Novemba 10 n'ụbọchị October 21, 2021 mgbe DSS kpọtara ya n'ụlọikpe ma kwuo na aka ya dị ọcha.

Lee ka ihu na anya dị mpaghara ọwụwa anyanwụ taa Nnamdi Kanu gara ụlọikpe
Enugu

Umuahia

Ahia zụrụ n'Umuahia taa agbanyeghị na Ipob tinyere mmachị.
Ebonyi steeti

Awka isi obodo Anambra steeti

Imo steeti

Okporoụzọ Owerri Okigwe tọgbọ chakoo.












