Chukwuma Charles Soludo: Ihe ndị cheere ya aka mgba dịka Gọvanọ ọhụrụ Anambra Steeti

Charles Soludo

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Oke ifufe nke ọtụtụ ndị mmadụ tụrụ uche na ọ ga-emebi nnukwu ihe na ntuliaka gọvanọ Anambara atụghị, kama ndị Anambara họpụtara Charles Soludo n'udo dịka Gọvanọ ọhụrụ ha.

Na ntuliaka a nke e mere malite n'abalị isii ruo abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba, Soludo meriri mmadụ iri na asaa ndị ọsọ soro ya zọọ ya bụ ọkwa.

Ndị ọkachamara n'okwu ndọrọndọro ọchịchị na-ekwu na ọtụtụ ihe kwụ Soludo n'ihu ugbua dịka ọ na-akwado iwere ọchịchị, nke pụtara na o kwesịrị iji ehihie chọwa ewu ojii.

Ụfọdụ ihe ndị ahụ ga-echere Soludo aka mgba gụnyere:

1. Ndị ya na ya zọrọ ọkwa Ọchịchị

Ndị zọrọ ọkwa gọvanọ Anambara steeti

N'oge a na-achụ nta vootu, ndị na-azọ ọkwa ọchịchị na-atakọta isi ugboro ugboro.

Mgbe ụfọdụ, ha na-agbasa ozi ọjọọ maọbụ kpaa nkata megide ibe ha nke nwere ike ibute iwe n'etiti onye na ibe ya maọbụ n'etiti ndị na-eso ha.

Mana ndị ma ihe ekwe na-akụ n'okwu ọchịchị obodo na-ekwu na nkịta daara ibe ya bụ n'ụwa na-atọ ụtọ, na o kwesịrị ka gọvanọ ọhụrụ na ndị ya na ya zọkọrọ ọkwa gọvanọ kpaa udo.

Aha onyonyo, Charles Soludo: Oji onye n'ala ji onwe ya n'okwu 'sit-at-home' ndị Ipob

Dịka onye nhazi 'VoteNotFight Initiative' bụ Nonso Orakwe siri kwuo, "Soludo na ndị ya na ha so sọọ mpi ọchịchị kwesịrị ịkpa udo, o tikwazie ha aka n'obi, ka iwe dị ha n'obi dajụọ".

Orakwe kwukwara na ọ dị mkpa ka ya na ndị ahụ nọrọ tụọ alo," ka ọ nata ha ihe ha chọburu imere ndị Anambra tinyekwu na nke ya nwa ji eji".

Soludo

N'otu aka ahụ, Dọkịta Dennis Ekemezie nke 'Centre For Transperency And Advocay (CTA)Abuja, kọwara ya otu a: "Soludo ga-agba mbọ chịkọta ndị Anambara ọnụ."

Dr Ekemezie kwuru na ọ dị mkpa Soludo inwe ọgbakọ mmadụ iri na asatọ zọrọ ọkwa gọvanọ nakwa nke ndị Anambara niile.

Ọ sịrị: "Nke mbụ bụ na ọ ga-agba mbọ chịkọta ndị Anambra niile ọnụ ka ha bụrụkwa otu maka na ndọrọndọrọ tisara mmadụ nile."

"Ọ dị mkpa ịkpọ ọgbakọ ndị Anambara Bekee kpọrọ'development summit' ka ha soro tụọ alo maka ọganihu steeti ha, ka atụmatụ a ga-ewepụta bụrụ ọhazurumee."

2. Ụdị ndị ọ ga-ahọ ka ha soro ya chịa ọchịchị

Charles Soludo

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook

Ihe ọzọ ga-echere Charles Soludo aka mgba bụ ụdị ndị ọ ga-ahọ n'ọrụ dịka ndị ime`obi ya nakwa ọrụ ndị ọzọ.

Ụdị ndị ọ ga-ahọ n'ọrụ ga-egosi ma ọ ga-emejupụta nkwa o kwere ndị Anambara oge ọ na-achụ nta vootu.

Orakwe sịrị, "Ndị ọ họrọ ga-abụ 'professionals'?"

"Ihe nwere ike i chere ya aka mgba bụ 'Amara m Maazị A, ọ rụrụ APGA ọrụ'.

Orakwe dọrọ Soludo aka na ntị ka o zeere itinye ndị mmadụ n'ọrụ n'ihi na ha rụụrụ pati ya bụ APGA ọrụ.

3. Ọnọdụ ndakpọ nchekwa Obodo

Ụgbọala a gbara ọkụ n'Abatete
Nkọwa foto, Ụgbọala a gbara ọkụ na mwakpo e mere n'Abatete

Kemgbe mbido afọ 2021, ọnọdụ nchekwa danyụrụ ka ọkụ n'Anambara nakwa steeti ndị ọzọ dị n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka oke ogbugbu mmadụ na mmebi akụ na ụba na-arị ibe ya elu.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na igbo ya bụ nsogbu bụ ihe kachasị mkpa Soludo ga-egboro ndị Anambara.

Nke a bụ n'ihi na enweghị nchekwa, azụmahịa, mmepe na mwulite obodo agaghị adị.

Dkta Dennis Ekemezie

Ebe foto si, Dennis Ekemezie

Nkọwa foto, Dkta Dennis Ekemezie bụ ọkachamara n'okwu ndọrọndọro ọchịchị obodo marụbuo dịka diretọ n'ụlọọrụ National Orientation Agency(NOA)

Ekemezie sị, "Ọ ga-agbarịrị mbọ hụ na nchekwa dị."

"Ndị uweojii kwesịrị inwe ihe nchekwa a na-enye ndị uweojii ji rụọ ọrụ."

4. Ndakpọ Okporoụzọ

Ụzọ ọjọọ Ụmụnya

Na-agbanyeghị na ọchịchị Peter Obi na nke Chris Ngige rụrụ ndị Anmabra ọtụtụ okporoụzọ, ụzọ ọjọ sọkachasị n'ime ime obodo so na ihe ndị na-agba ndị Anambra anya mmiri.

Orakwe kwuru na ọnụ ọchị ga-awa ndị Anambra ma Soludo were aka dimkpa bagide nsogbu ajọ ọnọdụ okporoụzọ n'Anambara steeti.

"Anyị enweghị ụzọ n'ebe niile n'Anambara. Ị banye n"ime ime obodo ebe e si ebupụta nri ebuga n'obodo ndị mepere emepe, ị hụ na ọ ga-adị mkpa ma ọ rụọ ụzọ n'ime obodo nakwa ebe mepere emepe."

"Ngwangwa o mere nke a obi ga-ebido tọwa ndị mmadụ ụtọ."

5. Azụmahịa, Mmepụta Ngwahịa

Ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Anambara steeti bụ steeti e ji azụmahịa na mmepụta ngwaahịa were mara.

A na-ele Soludo anya ihiwe ọnọdụ ga-akwado azụmahia na mmepụta ngwahịa.

Mana oke ụtụ a na-ana ndị na-azụ ahịa nakwa ndị ojiegoachụego bụ nke ndị eji okwu ha agba izu na steeti ahụ sị na ọjọgburu udele sigbuo nkapị n'isi.

5. Ịkpata ego n'akpa gọọmentị

Ego Naíjiría

Ebe foto si, Getty Images

Ụbọchị siri ike ugbua na Naijiria dịka ịkpata ego na-ara gọọmentị etiti ahụ n'ihi etu ọnọdụ akụnaụba siri dakpọọ.

Nke a pụtara na gọọmentị steeti anaghị enwetaz i akatamkpo ego dị mkpa maka mmepe site n'aka Gọọmenti etiti.

Ya mere dịka Dkta Ekemezie siri kọwaa,"Ọ dị mkpa ka ọ hazie ụzọ ọ ga-esi na-enweta ego."

6. Ọrụ ugbo

Ndí ọrụugbo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndí ọrụugbo

A ma Anambra steeti dịka na-akọpụta nri dịka ji,osikapa na akwụkwọ nri mana Orakwe kwuru na gọọmenti Soludo kwesịrị itinye anya ka Anambara ga-esi na-akọpụta nri zuuru ndị Anambara, ma na- enyekwa mba gbara ha gburugburu nri.

7. Ndị ntorobịa

Ndị na-eme ngaghrịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Tigbuo- zogbuo na-eme na Anambara steeti nakwa n'Ọwụwa Anyanwụ gbadoro ụkwụ na ndị ntorobịa enweghị ọrụ.

Orakwe na Ekemezie na-atụ anya na Soludo ga-elebanye na ihe gbasara ndị ntorobia iji mata ihe ndị bụ mkpa ha ma nyekwa ha ọrụ maọbụ nkwado iji kwụrụ onwe ha.

Orakwe sịrị, "Inye ọrụ abụghị naanị ịbanye n'ọrụ gọọmentị ka ọ bụ mgbazinye ego maka ndị chọrọ ịnọrọ onwe ha arụ nke ha."

"Ịkwado ọrụ ugbo ka ndị ntorobịa tinyewe anya n' ọrụ ụgbọ."

Ịkwụsị ọnọdụ 'sit-at-home'

Ahịa Onitsha

Ebe foto si, Getty Images

E nwere olileanya na Soludo ga-eweghachite Mọnde dịka ụbọchi ọrụ.

N'Anambra steeti nakwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ, ndị otu na-achọ ikewapụ na Naịjirịa, bụ 'Indigenous People of Biafra', na-amanye ndị mmadụ ka ha ghara ịpụta ezi ụbọchị Mọnde ọbụla.

Nke a bụ ụzọ ha si egosi iwe ha maka nnwuchi gọọmentị Naịjirịa nwuchiri onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Mana ndị ọkachamara n'okwu akụnụba na-ekwu na ya bụ ọnọdọ 'sit-at-home' akụtuola akụnụba Anambra steeti nakwa nke Ọwụwa Anyanwụ.

Dịka ọkammụta n'okwu akunuba, a na-eche na Soludo agaghị agba nkịtị ka ọnọdụ a dịrị gawa n'ihu.

Maka Soludo...

Chukwuma Soludo

Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Soludo

Tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị, Chukwuma Soludo arụọla ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa.

Ọ rụkwaala ọrụ dịka ọkammụta na mahadum Naịjirịa dị na Nsukka, nakwa mahadum dị icheiche na mba Amerịka na UK.

Aha onyonyo, Charles Soludo: Oji onye n'ala ji onwe ya n'okwu 'sit-at-home' ndị Ipob

Soludo, onye a mụrụ n'obodo Isuofia, Anambra steeti, bụkwa otu n'ime ndị ndụmọdụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'okwu akụnụba.

A mụrụ Ọkammụta Soludo n'afọ 1960.