Chukwuma Soludo Visits Nnamdi Kanu: Ihe mụ na ya kpara oge m gara hụ ya na mkpọrọ ụbọchị Fraide

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook
Aka na-achị Anambara steeti bụ Chukwuma Soludo gara hụ onye ndu otu otu nwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Nnamdi Kanu na mkpọrọ DSS ụbọchị Fraide.
Kanu nọ na nga ndị uweojiii nzuzo Naijiria bụ DSS n'ịchafụ kemgbe ọnwa Juunụ afọ 2021 bụ mgbe a nwụchiri ya na mba Kenya, kpụlata ya Naịjirịa, ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmenti.
N'ozi o wepụtara n'ụtụtụ ụbọchịụka, Soludo kwuru na ya gara zute Kanu ka ha kpaa maka etu a ga-esi weta udo na nchekwa tọọrọ atọ n'Ọwụwa Anyanwụ.
Soludo kwuru na Kanu gosiri obi mwute ya n'ụdị gbuo gbuo gbuo, ntọ na mpụ niile na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ nke otu dị iche iche na-eme ma na-ebo ndị otu Ipob.
O kwuru na Kanu kwere nkwa na ya nwetahala ohere ịgbasa ozi nye ndị na-eso ya, na ya ga-agwa ha okwu banyere nke a.

Ebe foto si, Charles Soludo
Soludo kwuru sị: "A gara m hụ Nnamdi Kanu ụnyaahụ bụ Fraide, abalị 13 nke Ọnwa Mee iji kelee ya nakwa dịka ọgbakọ mụ na ndị ọnụ na-eru n'ọkwu n'Ọwụwa Anyanwụ banyere iweta udo tọrọ atọ na ezi nchekwa na mpaghara."
"Ọ nọ ọfụma, anyị kpara nkata miri emi n'obi anụrị."
"O gosiri obi mwute ya n'ihe ọ kpọrọ "ogbugbu merụrụ ala" a na-egbu ndị aka ha dị ọcha; ntọ na ụdị mpụ dị iche iche, nke gụnyere mmachi 'sit-at home' nke ọtụtụ otu dị icheiche na eme na-ebo Ipob."

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook
"Kanu kwere nkwa na ọ nwetahala ohere, na ọ ga-adị ya obi mma igbasa ozi ya ndị na eso ya ka ha chọọ udo."
"Anyị jikọọ aka ọnụ, anyị ga-eweghachi udo, nchekwa na ọganihu na Anambra nakwa Ọwụwa Anyanwụ."
Cheta na kemgbe ọ banyere ọkwa gọvano Anambara steeti n'abalị Maachị 16, afọ 2022,Soludo akpaala mbọ dị iche iche iji hụ na a kwụsịrị nsogbu nchekwa nakwa nọrọnụlọ a na-eme kwa mọnde na steeti ahụ.
Dịka Soludo siri kọwaa, ihe ndị a na-emetụta akụnaụba mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mana ọ mitabeghị mkpụrụ.












