Ipob Sit-at-Home: Ụbọchị abụọ ndị a ka ndị Ipob kanyere ọhụrụ dịka ụbọchị nọrọ n'ụlọ - Emma Powerful

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu Indigenous People of Biafra ekwuola na ọ bụghị ha na-ekesa ozi na-efesa ugbua nke na-ekwu ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ihe ruru abalị anọ.
Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ndị IPOB wepụtara ozi a n'ụtụtụ ụbọchị Satọdee, ma kwuo na ozi ahụ bụ akaọrụ ndị iro Ipob.
O kwuru sị: "Naanị ụbọchị IPOB kanyere ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ bụ ụbọchị 18 na 26 nke ọnwa Mee, nke bụ ụbọchị abụọ a ga-ekpe ikpe Mazi Nnamdi Kanu."
"Ozi ndị ọzọ na-efegharịnụ si n'aka ndị chọrọ itinye nghọtahie n'etiti anyị ma mebie ihe anyị na-achọ."
Kedụ ihe dị n'ime ozi 'sit-at-home' na-efegharị kamgbe ụnyahụ?
Cheta na e nwere ozi na-efegharị na ọba ozi 'whatsapp' nke na-eyi ndị mmadụ egwu ka ha ghara ịpụta ezi malite n'ụbọchị 17 ruo ụbọchị 20 nke ọnwa Mee.
N'ozi ahụ nke BBC Igbo nwetara, otu olu kpọrọ onwe ya Emmanuel Sinbad na-eyi ndị mmadụ egwu ma kwuo na ya ga-egbu onye ọbụla pụtara ezi n'ụbọchị anọ ndị a.
Mana Emma Powerful kwuru na ya bụ ozi esighi n'aka ndị IPOB.
"IPOB abụghị otu na-ezo ezo ekwu okwu, anyị nwere usoro mgbasaozi doro anya," Ka Emma Powerful depụtara n'akwụkwọ ozi ya.
"Usoro mgbasaozi atọ anyị nwere bụ: Radio Biafra; Akwụkwọ ozi si n'aka ode akwụkwọ mgbasaozi IPOB; ozi si n'aka ụlọọrụ isi ụlọọrụ IPOB."
"Ihe anyị chọrọ bụ ọdịmma ndị Biafra niile n'ebe ọbụla ha nọ n'ụwa."
Gịnị bụ Ipob?
Indigenous People of Biafra bụ otu na-achọ nwereonwe nakwa nkewapụta site na mba Naịjirịa.
Onyeisi IPOB bụ Mazi Nnamdi Kanu nọ ugbua n'aka gọọmentị Naịjirịa ebe e ji ya eji ma na-ekpe ya ikpe maka iyi ndụ egwu na mpụ ndị ọzọ.
Kanu hibere otu Ipob n'afọ 2021.
Cheta na gọọmentị Naịjirịa machiri otu IPOB ma kwuo na ha bụ ndị otu oyi ndụ egwu.
Kamgbe a nwụchiri Nnamdi Kanu n'ọnwa June afọ 2021, mwakpo nakwa ogbugbu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa akawanyela njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
N'ọdị nso a, gọọmentị mba UK kwukwara na onye IPOB ọbụla mere ihe butere ọgbaaghara maọbụ nkwafu ọbara, agaghị enwe ike ịgbata ọsọ ndụ na mba ha, nke bekee na-akpọ 'asylum'.
Na nnyocha nke ngalaba nchọpụta okwu ụgha nke BBC mere n'ọdị nso a, ha chọpụtara ọtụtụ ndị otu IPOB bụ ndị na-eji akara soshal midia ha na-agbasa ozi asị nakwa ozi na-ebute ọgbaaghara na igbu mmadụ.
Mana IPOB na-ekwusi ike na otu ha abụghị otu na-akpa aghara, kama ọ bụ ụzọ udo ka ha ji achọ nnwere onwe Biafra.
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Nnamdi "Nwannekaenyi" Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.
Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.
Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.
Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.
N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.
Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.
Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.
A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.
Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.
O kwenyere na ma bụrụ onye ofufe 'Judaism'.
Akụkọ ndị ga-amasị gị
- Sit-at-Home over Nnamdi Kanu's case today: Ndị o ji egbe egbu awakpoola ndịagha n'Aba
- Gọọmentị kwesịrị iji 'sit-at-home' Nnamdi Kanu tinyere wee mụrụ akọ - Fr Ebube Muonso
- Ị ma na "Obi Mgbawa" nwere ike ibutere gị ọnọdụ "Broken Heart Syndrome"?
- Ihe onyeisi British High Commissioner nke Naịjirịa kwuru maka ọnwụ Deborah Samuel









