Sit-at-Home over Nnamdi Kanu's case today : Ndị o ji egbe egbu awakpoola ndịagha n'Aba

Ndị ojiegbe a na-enyo na ha bụ ndị otu /Ipob /ESN awakpoola ndị agha n'Aba Abịa steeti n'ụtụtụ taa bụ Fraide, gbaa ụgbọala ha ọkụ.
Taa bụ Eprelu 6, afọ 2022, bụ ụbọchị e hiwere ikpe onye ndu otu Ipob Kanu maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa ntaka ịkwatu gọọmentị Naijiria nke mere otu Ipob tinyere iwu nọrọnụlọ na steeti nile dị Ọwụwa Anyanwụ.
Onye ntaakụkọ anyị nọ Aba kwuru na ya bụ mwakpo mere n'ọjikọ okporoụzọ a ma ama bụ Tonimas Junction dị n'Okpuru Ọchịchị Osis ọma n'Okporoụzọ awara awara si Enugwu gawa Pọtakọt.
O kwuru na ndị ojiegbe ahụ pụtara wakpo ndị agha nọ n'ụgbọala ha ji agagharị na ntụmadị, ma malite kwawa ha mgbo.
Ndịagha ahụ hapụrụ ụgbọala ha gbawara, nke nyere ndị ojiegbe ahụ ohere isunye ụgbọala ha ọkụ.
BBC enweghị ike inweta olu ọnụ na-ekwuru ndị agha na steeti ahụ mana onye agha welitere isi gwara onye ntaakụkọ anyị na ya bụ ihe mere n'ezie n'ebe elekere atọ nke isi ụtụ mana o nweghị onye nwụrụ.
O kwuru na ọ bụ dịka ndị ọrụagha na-apụ ịkpagharị maka ichekwa obodo dịka ha si eme ụbọchị ọbụla e nwere nọrọụlọ ka ya bụ ọdachi mere.
Ọnọdụ'Sit-at-Home' n'Ọwụwa-Anyanwụ dịka a na-ekpe ikpe Nnamdi Kanu taa

Dịka a na-ekpe ikpe Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu 'ndigenous People of Biafra' (IPOB) taa, ọtụtụ ndị mmadụ aputaghị ezi dịka e ji ya akwado Nnamdi Kanu oge ikpe ya.
Ụfọdụ ebe n'isi obodo Abia Steeti bụ Ụmụahịa tọgbọ chakoo dịka ndị mmadụ apụtaghị ezi, lee ihe onye ntaakụkọ anyị hụrụ mgbe ọ gagharịrị n'Ụmụahịa.
Ụmụahịa Abia Steeti













Enugwu Steeti
Lee ka Enugwu Steeti dị taa bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Aprel a afọ 2022.
Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị iji hụ etụ ezi Enugwu Steeti dị.
Dịka esi eme mgbe ọbụla, a na-ehiwe ọnọdụ onye-apụtala -ezi nke bụ Sit-At-Home na Bekke iji kwado onyeisi otu Piob bụ Nnamdi Kanu dịka a na-ekpe ya ikpe.
Lee ọnọdụ NOWAS dị na Timber n'ahịa Timber Shed, dị na Transekulu Enugwu steeti.






















