Sit at Home: Ụzọ asatọ ị ga-eji ama na nchekwa adakpọọla n'Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, BBC/screen grab
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Na nchekwa akpụọla afọ n'ala Igbo abụghị okwu iji ugegbe enyo ihe e ji n'aka n'Ọwụwa Anyanwụ dịka okwu gbuo,gbuo gbuo na-ada na mpaghara Igbo dị iche iche.
Ọ malitere n'ogbugbu ndị ọrụ nchekwa mana ugbua, o metụwala imi, metụ anya.
Cheta na ihe niile bidoro ịkawanye njọ kemgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu na ngwụcha ọnwa Juun afọ 2021.
Nke a mere ka otu Ipob kpọọ oku ka ndị mmadụ mee nọrọ n'ụlọ bụ 'Sit-at-Home' iji kwanye ọkụ n'ike ka atọghapụ ya bụ Kanu.
Kemgbe Jenụwarị rue Eprelụ afọ 2022, e gbuola ndị nchekwa iri anọ nakwa ndị nkịtị.
Na nsonso a, e gburu otu nwaada Igbo bụ Gloria Matthew, onye Nkwere n'Imo steeti dịka ya na ọdịnaobi ya, onye 'Southern Kaduna', na-aga ịgbankwụ ha.
Mana ọ bụghị sọ na mmadụ ole e gburula, e nweela ọtụtụ ihe na-egosi na ikwe n'aka agafela nku aka n'Ọwụwa Anyanwụ.
Lee asaa gosiri n'ọnọdụ nchekwa adakpọọla afọ n'Ọwụwa Anyanwụ:
1. Ndị nche anaghị arụzi ọrụ

Kemgbe obodo ji malite dewee jim jim, ndụ ndị ọrụ nchekwa obodo aghọọla ije e ji agba okoso.
Oge tigbuo-zugbo malitere n'Ọwụwa Anyanwụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ndị omekome ahụ na-awakpo, na-egbu bụkarị ndị uweojii na ndị agha na ndị ọrụ nchekwa mkpọrọ.
Otu onye okwu a dọrọ anya achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo sị, "Ha egbuola ọtụtụ ndị uweojii na-egbochi ha ime ihe ha na-eme, ugbua ndị ọzọ ha achọghịzị bụ ndị nche."
Nchọpụta BBC mere gosiri na ọtụtụ otu ndị nche n'obodo dị n'Okpuru Ọchịchị Orsu n'Imo steeti na Okpuru Ọchịchị Nnewi-South,Aguata na Orumba dị n'Anambara steeti anaghị arụzị ọrụ dịka ndị omekome garala dọọ ha aka na ntị ka kwụsị ọrụ.
Onye okwu nche obodo doro anya achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na "Ha gara n'ụlọ n'ụlọ napụchaa ndị nche egbe ha."
Ihe nke a pụtara na ndị ọrụ nchekwa anaghị ewepụtazi obi, arụ ọrụ ha ụzọ zuru oke n'ihi egwu na-achọ ndụ ha, ndị nche obodo na-elebu anya ebe anya ndị uweojii anaghị eru enweghịkwa ike ịrụ ọrụ ha.
Ọbụladị ndị otu nche pụrụ iche gọọmentị ndị Ọwụwa Anyanwụ wepụtara maka nchekwa a kpọrọ "Ebubeagụ" nọ na nsogbu dịka ndị ojiegbe kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' ahapụghị ha aka.
Nke a pụtara na mpụ na arụala ewerela oche eze n'ọtụtụ ebe n'Ọwụwa Anyanwụ.
2. A na-anazị ụtụisi n'ụfọdụ ebe ugbua

Ọ bụ ọrụ dịrị gọọmentị dị iche iche; Etiti, nke steeti nakwa okpuru ọchịchị ịna ụtụisi na ụtụ ndị ọzọ bụ ebe ha si enweta ego ha ji acị obodo ma na-ahazi ewumewu e ji enyere ndụ aka.
Mana ugbua, ọ bụghịzi ihe a na-akụ ka a na-agba dị ka ndị ojiegbe eyi egwu wegharala ọnọdụ.
Otu onye achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC Igbo si,"Ugbua na mpaghara Osumenyi na Amichi be anyị, ị chọọ ịkwa ozu maọbụ mmemme ndị ọzọ, ọ bụụ na i nwere ego, ha ('unknown gunmen') ga-ewetara gị ozi ego ole ị ga-akwụ."
"Ọ bụrụ na ị tụghị ụtụ ahụ, ụbọchị ahụ ha abịa ebe ahụ wụọ ndị ọbịa gị mgbọ."
Nnaemeka Ikerionwu kwuru na a na-ana agbata puku naira 50 na otu nde maka mmemme akwamozu n'ebe ụfọdụ n'okpuru Ọchịchị Nnewi South ugbua.

Ebe foto si, BBC/Facebook
N'ọnwa Febụwarị afọ 2022, ndị bu egbe wụrụ ndị bịara akwamozu otu nwoke n'Ebenebe, dị n'Okpuru Ọchịchị, Awka-North, Anambara steeti merụrụ ọtụtụ ahụ, ebe ụfọdụ nwụrụ anwụ.
A maghị ndị kpara mkpamkpa ahụ, na ihe ha bu n'obi mee ya, mana ụfọdụ na-arụ aka na ọ bụ ndị otu nzuzo mere ya bụ ihe.
Na mpaghara Okpuru Ọchịchị Orsu, Imo steeti, ọtụtụ ndị obodo agbaala ọsọ ndụ gbapụ, ọfọ naanị ndị agadi dịka ndị ojiegbe weghara ụfọdụ mpaghara.
3. Ndị ama (informant) juru ebe nile

Igbo kwuru na ọ bụ oke nọ n'ụlọ gwara nke nọ n'ọhịa na azụ dị na ngịga.
A maghịzị ndị a na-eze, o nweziri ndị kpọrọ ya ọrụ inye ndị omekome ozi banyere ndị nọ n'obodo..
Na nso nso a n'Ọsụmenyi Anambara steeti, ndị bu egbe gburu mmadụ anọ gụnyere otu nwaanyị na-ere nri n'otu ụlọnri n'Osumenyi Anambara steeti.
Onye otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na ọ bụ ndị mgba ama nyere ndị obuegbe ozi wetara ọdachi ahụ.
n'ihi mgbadata ọnụọgụgụ ndị uweojii, na ogige ndị uweojii, ndị omekome ndị ọrụ nchekwa e nyeburu ọsọ n'ala Igbo alachiela were tigbuo zogbuo na-eme n'obodo na-ekuchi mpụ ha na-eme.
Ugbua, iji egbe ezu, ntọ na mwakpo na-arị ibe ya elu.
Otu onye e jidere tie ihe ma kpụrụ ya gaa n'igwe ego 'ATM' werechaa ego dị n'akpaego ya n'ụlọakụ gwara onye ntakụkọ BBC Igbo" Ọ bụ nnwanne nna m mụ na ya so na-arịọ ha,"
Nwa amadị ahụ achọghị ka a kpọ aha ya gara n'ihu sị, " Ọ bụghị otu a, ha gaara ịkpụ aga n'ọhịa Ihiala igbu m."
"Nke ka njọ bụ na o nweghị ogige ndị uweojii ị ga-ewega mkpesa mwakpo."
Ndakpọ nchekwa e mela ka o sie ike ịma ndị omekome na ndị na-eti mkpu nnwereonwe,
4. Ndị mmadụ anaghị enwe ohere ịga ebe masịrị gị

Mgbe obodo dị jụụ, ndị mmadụ na-enwe ohere ị ga ebe masịri ha, oge masịrị.
Ugbua, egwu adagharịa ala, ụbọchị Monde n'izu ọbụla aghọọla aga-aga dịka ndị mmadụ n'anọ n'ụlọ apụghị ama n'ihi mmachi otu alaka Ipob, otu nnwereonwe Biafra tinyere n'Ọwụwa Anyanwụ.
Ụfọdụ ndị pụrụ oge e nwere mmachi 'nọrọụlọ' a ezutela ọnwụ ike maọbụ nnukwu mmerụ ahụ.
N'abalị 25 Eprelu, 2022, ọsọ tara n'Owere,isiobodo Imo steti dịka ndị omekome wụpụtara na mgbe Monde ahụ wụwa mgbọ in'ebe Elekere anọ nke ụbọchị nke mere oke n'ọsọ na ngwere n'ụzọ n'Okporoụzọ .
Ụwa mgbede alawala

Otiegwu Mike tiri n'egwu sị na "ụwa mgbede ka mma, mana ugbua ụwa mgbdee adịla njọ.
Tupu nchekwa adakpọọ, ụmụokorobịa na ụmụagbọghọbịa na-arụ na-eji mgbede ma e mechie ọrụ agwọrị ndụ.
Mana egwu emeela na anaghị a naghịzi aga ije abalị n'Ọwụwa Anyanwụ, ngwọrị ndụ mgbede agbadala.
Dịka Gerard Maduabuchi bụ onye na-achịkọta ụlọ nkwarị 'Young Millenium' dị n'Owere gwara BBC Igbo sị, "Ndị na-abịa agba anyị aka ahịa anaghị abịazi n'ihi egwu."
"Ụfọdụ pụta apụta, ha na-alakpu n'oge n'ihi na ndị ọrụ nchekwa na-enye ha nsogbu."
"Mgbe mbụ, anyị na-eji Elekere isii ụtụtụ emepee ma mechie n'Elekere iri na abụọ nke ime abalị.
"Ugbua anyị na-emepe n'Elekere asatọ, mechie n'Elekere iri na otu nke abalị."
7. Ịbụ ọgaranya aghọọla 'arụ' n'Igbo ugbua

Oge elu bụ ala ọsa, Igbo na-aṅụrịrị ọgaranya,
Ọtụtụ ndị ogbe na-aṅụrị onye kpatara ego n'ihi na nkwenye ọtụtụ bụ, "ọgaranya mụrụ m, ma ya enyela m nri".
Ugbua, ị bụ ọgaranya aghọọla 'nnukwu njọ.'
Otu onye ọrụ Bekee lara ala Igbo nsonsoa gwara onye ntaakụkọ anyị sị, 'Ugbua, ịkwọ nnukwu ụgbọala, ụgbọala e tejiri ugegbe ya, iyi akwa, elekere aka maọbụ akpụkpọ ụkwụ dị oke ọnụahịa aghọọla nsọala."
Nke a mere na ọtụtụ ndị Igbo bi mba ndị ọzọ anaghị enwezị mmasị ịla ụlọ.
N'afọ 2021, e gburu Dkta Chike Akụnyili n'Ọnịcha, Anambara steeti dịka o si mmemme ala.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-ebo ebubo na ndị kpara arụ ahụ chere na ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'ihi na a kwọ ya na nnukwu ụgbọala ma burukwa onyeuweojii.
8. Ụfọdụ ndị nwere agbamakwụkwọ, akwamozu na-emezi ya na mba ọzọ
Omenala na-atọ ndị Igbo ka nnu nke mere na ha ejighị ịga ala Igbo ịga ịgbankwụ maọbụ ili onye nke ha abụghị ihe a na-agbagha agbaha.
Mana ugbua, ụfọdụ ndị kara agba nkwụ n'ala Igbo jizi "idea agbara ehi ọsọ" site n' ime ihe ndị a na mba ndị ọzọ abụghị ala Igbo.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Timothy Ofoegbu kwuru na nsonso a o nwela ịgbankwụ atọ n'ọnwa abụọ ụmụafọ Igbo kpọrọ ya oku ya n'Abuja n'ihi ihe na-emezi n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ebe foto si, Timothy Ofoegbu/Facebook
N' aka nke ọzọ, Igbo nwere omenala na nwaafọ ọbụla nwụọ, ebe ọ sọrọ ya bụrụ, a na-ebula ozu ya ala Igbo.
Dịka Igbo si ekwu ya n'okwu "isi nwa afọ anaghị atọ na mba."
Mana nke a bụzịghị ugbua maka ndị Igbo ugbua a dịka ụfọdụ na-elizi onye nke ha nwụrụ n'ebe ọzọ abụghị ala Igbo iji gbalahụ egwu ịtụnye ndụ ha n'oge akwamozu.














