Mother's Day Ugboro ole ka a na-emedị ụbọchị ndị nne n'afọ?

Taa bụ ụka, abalị asatọ nke ọnwa Mee afọ 2022, ncheta ndị nne na-akpọtụ ọzọ n'ebe nile.
Nke a kpatara ụfọdụ ji ajụ ajụjụ sị: "ugboro ole ka a na-emedị ụbọchị ndị nne n'ime otu afọ?"
Ụbọchị ndị nne, Bekee kpọrọ 'Mother''s Day" bụ ụbọchị e ji akwanyere ndị nne ugwu pụrụ iche na mba dị icheiche n'ụwa maka ọrụ ha n'ezinaụlọ, ọkachasị na ịzụlite ụmụaka nakwa ileta di ha anya.
A na-eme emume a n'ọnwa Maachị maọbụ na May.

N'abalị asatọ nke ọnwa Maachị afọ ọbụla, a na-eme ncheta ụbọchị Ụmụnwaanyị n'ụwa nke a na-akpọ "International Women's Day" na bekee.
Nke a bụ ncheta ụmụnwaanyị niile, agbanyeghị okwukwe maọbụ okpukperechi ha.
Na Naijiria ọ na-ahịa ahụ ịgụkọta ugboro ole a na-eme emume ndị nne n'afọ n'ihi na ụka dị iche iche nwere ụbọchị ha ji eme nke ha.

Ndị ụka Anglikan mere ụka nne nke afọ 2022 n'abalị 27 nke ọnwa Maachị.
N'aka nke ọzọ, ndị ụka Katọlik mere nne nke ha n'abalị 24 nke ọnwa Eprelu 2022.
Dịka ụbọchị ndị nne na-ewu, ụfọdụ ụmụnwoke na-ata aka n'eze sị na agbanyeghị na ndị nna na-agba mbọ ịkpata ihe ezinaụlọ ga-eri ma na-echekwa ezinaụlọ ha, anaghị echeta ha ruo ka e si echeta ụmụnwaanyị.
Naanị otu ụbọchị were anya a na-echeta ndị nna bụ n'abalị March 19.
Amaechi Theo Vincent, onyeisi otu ụmụnwaanyị "Catholic Women Association" nke ụlọụka Our Lady of Lourdes Catholic Church, Coker, Lagos, kọwara na ihe e ji nwee ọtụtụ ụbọchị ndị nne na Naijiria bụ n'ihi na ụka Kraisti na Naijiria enweghị ụbọchị ha jikọrọ ọnụ wepụta maka ndị nne.
"O nwe ka ụwa nile ga-esi ebukọta ya ọnụ, ọ ga-adị mma mana ọ bụ maka ụka dị iche iche nwere ụbọchị nke ha."
Ebe ka emume ndị nne si malite?

Ebe foto si, Getty Images
A na-emebu emume dị iche iche iji kwanyere ụmụnwaanyị ugwu kemgbe gboo.
Ndị ụka Kraistị na-emekwa ụka nne (Mothering Sunday) nke na-abụkarị ụka nke anọ n'oge 'Lent' bụ oge ndị mmadụ na-aga sonye n'ofufe nru pụrụ iche n'ụlọụka ebe ha nọrọ too.
Ma na mba Amerịka, ncheta ndị nne malitere n'oge agha Amerịka, bụ oge otu nwaanyị a kpọrọ Ann Reeve Jarvis hibere otu "Mothers' Day Work Clubs'.
O hibere otu a iji kụziere ụmụnwaanyị etu ha ga-esi eleta ụmụ ha na mpaghara West Virginia n'afọ
Jarvis haziri ụbọchị "enyi ndị nne" a kpọrọ 'Mothers' Friendship Day' bụ ụbọchị ndị nne na ndị agha gbakọrọ iji kwalite udo.
Ka ọ nwụchara, nwa ya nwaanyị malitere 'Mother's Day' site n'ụka a kara n'ụlọụka nne ya na-aga oge ọ dị ndụ iji mee ncheta nne ya n'abalị 12 nke ọnwa Mee afọ 1907.
O ji flawa dị ọcha were merube ụbọchị ahụ.
Ka nke a gachara, ọtụtụ steeti na Amerika malitere idopụ ụbọchị ahụ kwa afọ iji cheta ọrụ ndị nne na-arụ.
N'afọ 1914 Onyeisiala Amerika bụ Woodrow Wilson tinyere ya n'iwu nke mere ya ụbọchị ezumike n'Amerika iji jaa ndị nne ike.
Ugbua e jizi flawa dị mmeemmee maọbụ uhie ọcha (pink) echeta ndị nne dị ndụ.













