Mother's Day 2019: Ihe mere n'Ụka Nne ndị ụka Katọlik na Anglikan

Ndị nne ụka Katọlik
Nkọwa foto, Ụka nne bụ emume ndị ụka Katọlik ji akwanyere ndị nne ugwu n'ụzọ pụrụ iche

Mmemme ncheta ụbọchị ndị Nne na-ekpo ọkụ tata n'ụka Katọlik n'Nigeria.

Ụkọchukwu na-elekọta St Michaels Parish Asata Enugwu bụ Fada Callistus Anih toro ndị Nne dịka ihe nke ezinaụlọ ha were gwa ha ka ha nọrọ chukwu nso oge ọbụla ka ụmụ ha ghara ịgahie ụzọ.

Fada Anih Kwuputara nke a n'ozioma ụka ọkara maka ndị nne tata.

Ndị nne na-eme ịkwụ na-ahịrị zọọ ka ndịagha
Nkọwa foto, E jiri ọtụtụ ụzọ sị ọṅụ na mmeme ndị nne

Ojikwa ohere ahụ rịọ ndị Nna na ụmụaka ka ha na-enye ndị nne nkwado n'ezinaụlọ ma na-enye ha ugwu kwesiri ekwesi.

Ndị nne yi uwe ejirimara ndị nne ụka katọlik were na-enwe aṅụrị n'uju tata.

Aha onyonyo, Chimamanda bụ onye odeakwụkwọ a ma ama na mbaụwa