'Unknown Gunmen' agbagbuola onye uweojii na onye nkịtị n'Enugwu

Ebe foto si, Screenshot
Ndị oji egbe a na-amaghị ndị ha bụ agbagboula otu onye uweojii na otu onye nkịtị n'Enugwu taa bụ Tọzde, 10 Febụwarị 2022.
Nke a mere n'ehihie n'ebe elekere atọ, mgbe ndị oji egbe a wakporo ebe ndị uweojii nọ na 'cashew busstop' dị n'ụzọ Kenyatta, Timber shade, Enugwu.
Ndị hụrụ ihe merenụ gwara BBC Igbo na ndị ojiegbe ahụ wuchiri ebe ahụ gbagbuo otu onye uweojii nakwa otu nwoke nkịtị ha na-ajụ ajụjụ.
Ebe ihe a mere bụ ebe ndị uweojii na-anọkarị na-enyocha ụgbọala ndị mmadụ.
BBC Igbo chọpụtara na ndị a ji ụgbọala Sienna na-acha ọbara ọbara wee bịa ebe ahụ kpaa arụ a.
Otu onye uweojii ọzọ merụkwara ahụ nke mere e ji buru ya gawa ụlọọgwụ.
Mana kepukepu na-ekwu na ọ nwụọla kama BBC Igbo achọpụtabeghi maọbụ eziokwu.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii eburula ozu onye otu ha nwụrụ anwụ.
Ndị bi na gburugburu ebe ahụ sị na ndị oji egbe a kpara arụ a n'otu ntabi anya nke bụ tupu ị mara ihe na-eme, ha agbafuola.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe sị na nke a bụ eziokwu, na e gburu ndị uweojii n'Enugwu ma kwuo na ha na-eme nnyocha ka ya bụ mkpamkpa siri mee.
Ndị oji egbe egbuola ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị nkịtị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kamgbe afọ abụọ gara aga.
Ndị ọrụ nchekwa na-ebo otu Ipob/ESN ebubo maka ogbugbu ndị a mana ndị Ipob na nzaghachị sị na aka ha adịghị na ha.
Nke a mere ọtụtụ ji na-ajụ "kedụzie ndị na-akpa arụ a, ọkachasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ?"















