Ozalla/Agbani Enugu attack: Etu ndị ekperima si gbuo otu onye, gbaa onye ọzọ egbe, ma tọrọ nwaanyị uweojii n'Enugwu

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii Enugwu steeti na-ekwu na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ gbagburu otu nwa okorobịa aha ya bụ Stephen Ajah.
Ọ bụ Daniel Ndukwe, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zigaara ndị ntaakụkọ n'ụbochị Mọnde.
O kwuru na ya bụ ihe mere n'okporoụzọ Ozalla/Agbani nke dị n'okpuruọchịchị Nkanu West.
Ndukwe sị na "ndị uweojii buru nwoke ahụ gaa ụlọọgwụ ebe dọkịta nọrọ kwuo na ọ laala mmụọ."
"Adọnyela ozu ya n'ụlọ ozu, dịka nnyocha malitere n'uju iji nwuchie ndị kpara arụ ahụ."
Ndị ojiegbe tọọrọ nwaanyị onye uweojii

Ebe foto si, Reuters
Daniel Ndukwe kwukwara na ndị omekome wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị na Umulokpa, n'okpuru ọchịchị Uzo-Uwani, n'ụbọchị Satọde, abalị itoolu nke ọnwa Ọkutoba.
Ọ sị na ndị ekperima mere mwakpo ahụ buru ibu n'ọnụọgụgụ, ma gbakwaa ọtụtụ ụgbọala ndị uweojii ọkụ.
"Onyeisi ndị uweojii EnugwuSteeti bụ Abubakar Lawal enyela ndị ngalaba CID iwu ka ha chọta nwaanyị onye uweojii ahụ na-efu efu," Ndukwe depụtara.
"A na-akpọku ọhaneze ka ha nyere ndị uweojii aka site n'inye ha akụkọ ga-enyere ha aka ịchọta onye uweojii ahụ na-efu efu ma nwuchikwaa ndị ji ya."
"Onye chọrọ izitere anyị ozi ga-eme nke a site n'akara email: [email protected], maọbụ kpọọ akara ekwentị ndị a: 008032003702, 08075390883.
'Unknown gunmen' gbara onye ọrụ ahụike egbe n'Enugwu

Ndi ojiegbe amaghi ndi ha bu agbaala otu onye oru UNTH Ituku Ozalla Enugwu egbe taa dịka o si ọrụ ala.
Onye ọrụ ahụike ahụ kwuru na ọ bụ oge ọ gbasara oru abali wee na ala ka o zutere ndi ojiegbe ahu na mpaghara 'Four Corner Junction' di n'Enugwu.
O kwukwara na ndị ahụ ji ọgbaatumtum chụrụ ya ọsọ tupu ha gbaa ya egbe n'azụ.
Ka ọ di ugbua nwoke ahụ nọ n'ụlọọgwụ UNTH anata ọgwụgwọ.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ebe n'ala Igbo debere iwu 'Sit-at-home' nke otu Ipob hibere ebe ndị ọzọ pụtara gaa mkpa ha.
Ọ bụkwa Monde nke ugboro iri ka ọ bụ taa
Ọsọ tara n'Ụmụahịa n'ihi ụjọ 'unknown gunmen'

Ọtụtụ ndị mepere ọnụụlọahịa ha ji ọsọ kpọchie ya dịka ha na-atụ ụjọ ndị oji egbe a ma dịka 'unknown gunmen'.
Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ nụrụ kepu kepu na ndị oji egbe a abatala n'Ụmụahịa, isiobodo Abịa steeti.
Ndị mmadụ gbara ọsọ a dịka o ji ebe nkeji iri atọ gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ Mọnde a, dịka ọ bụ naanị ndị keke na ụfọdụ ndị nkịtị na-akwọ ụgbọala ha n'ụzọ.
Otu onye na-anya Keke gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọ hụrụ ebe ndị mmadụ na-awụ Ben Johnson n'ihi nke a.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụkwara ka ụlọọrụ gọọmentị ndị mepeburu emepe si mechie ozugbo, n'ihi ụjọ mwakpo.
Ọ hụkwara ka ụgbọala ndị nchekwa ruru ebe 12 na-anyagharị na mpaghara Ụmụahịa.
A na-eme 'sit at home' na mpaghara Ọwụwa anyanwụ taa?

Okwu ọtụtụ ndị kpụ n'ọnụ na mpaghara Ọwụwa anyanwụ n'ụtụtụ Mọnde, 11 nke ọnwa Ọktoba 2021, bụ ma a ka na-eme 'sit at home' nke ndị Ipob tinyere.
Dịka ndị otu Indigenous People of Biafra tinyere iwu onye ọbụla nọrọ n'ụlọ kwa Mọnde ọbụla, ụfọdụ ndị mmadụ gere ntị nọrọ n'ụlọ ebe ndị ọzọ na-agara mkpa ha.
Ebe ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'ebe dị ka Ụmụahịa bụ isiobodo Abịa steeti, ndị ọzọ nọ n'ụlọ na mpaghara Owere, isiobodo Imo steeti.
Etu 'sit at home' si aga
Abịa steeti
Ndị mmadụ na-agara mkpa ha na mpaghara dị iche iche n'Ụmụahịa.
Site n'Abịa tower ruo ụzọ Health Center, ruo Nsukka street, ruo ụzọ Ikot Ekpene, ruo ụzọ Ụmụwaya, ma ụgbọala ma mmadụ na-aga n'ụzọ.

Ndị ahịa na ụlọakwụkwọ mepere, mana ọdọụgbọala gụnyere nke Abia Line mechiri emechi.
Ụfọdụ ndị ụlọakụ na-enyocha ndị mmadụ tupu e kwe ha bata.


Anambra steeti
N'Ọka bụ isiobodo Anambra steeti, ahịa na-azụ, ụgbọala na ndị ji ụkwụ na-agarakwa mkpa ha.


Imo steeti
Ụzọ tọgbọ chakoo n'Owere, isiobodo Imo steeti n'ụtụtụ Mọnde a.




Ebonyi steeti
N'Abakaliki, isiobodo Ebonyi steeti, azụmahịa alọghachịtala n'ike nike dịka ndị mmadụ pụtawara imepe ụlọahịa ha.
Ụlọakụ, ụlọakwụkwọ mepechara ebe ụgbọala na ọgbatumtum na-agagharị n'ụzọ na-enweghi nsogbu ọbụla.




Enugwu steeti
N'Enugwu, isiobodo Enugwu steeti, ụzọ tọgbọ chakoo dịka ndị mmadụ rubere isi n'iwu nọrọ n'ụlọ.



Delta steeti
N'Asaba, isiobodo Delta steeti, ndị mmadụ na-agara mkpa ha, mana ndị mmadụ ejighi ike esi ebe ahụ aga Ọnịcha taa.
Nke a mere ka ụzọ Head Bridge tọgbọrọ chakoo.


Akụkọ ka na-abịa












