Sit at home Ipob: Obi agbajọla otu Ipob maka ndị ji aha ha emebi ihe n'ala Igbo

Ipob
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Otu Ipob ezipụtala ozi ọhụrụ taa bụ Tuzde site n'aka Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ha si na iwu ịnọ n'ụlọ nke taa bụ Tuzde gacha, ka ndị mmadụ kwụsị ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.

N'ozi o zipụtere, o kwuru na ha bụ ndị otu Ipob akagbuola atụmatụ ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijiria niile kemgbe ma kwuo na ya bụ iwu ga-adi ire naanị n'ụbọchị ọbụla akpụpụtara onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu ụlọikpe, nke bụ i ji kwanyere ya ugwu ha si ruru ya.

O gakwara n'ihu kwuo na ha ka achọpụta maa taa ndị niile ji aha Ipob akpa mkpa mkpa na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijiria ahụhụ dịka ha akwadoghi ya bụ agwa.

O kwukwara na ga emesi ndị ka ji aka ike gaa n'ihu n'ehiwe ya bụ iwu ịnọ n'ụlọ ike.

Etu Gọvanọ Obiano si jiri aka ya gaa na-akpọku ndị mmadụ ka ha pụta n'ahịa

Willie Obiano

Ebe foto si, ASG

Ugbua ka o doro anya ihe Gọvanọ Willie Obiano nke Anambra steeti na ndị ọrụ ya pụtara ọgbọ ịme ụnyaahụ ebe ndị mmadụ bereebere (kere nkwụcha) maka ọnọdụ onye apụla ezi otu Ipob hiwere n'ala Igbo.

Obiano na ndị ọrụ ya gara Awka na Onitsha ịjị mata ka ndị mmadụ akwanyere ugwu n'okwu ọ gwara ha maka irube isi na ya bụ ọnọdụ onye apụla ezi Ipob hiwere.

N'ọgbakọ ya na ndị ọrụ nchekwa, ndị ọrụ ụlọakụ, ndị otu ọrụ ụgbụala na ndị ọzọ nwere n'izu gara aga, Obiano doro aka na ntị ka ndị mmadụ ghara irube isi na ya bụ oku otu Ipob kpọrọ maka ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde.

Mana ihe ọ hụrụ na Mọnde enyeghị ha obi ụtọ.

Willie Obiano

Ebe foto si, ASG

O kwuru na ọ bụ na-ezia na ndị mmadụ pụtara mana ha apụtachaghị ka o kwesiri.

Dịka ọ gara ya bụ njem nleta n'ụfọdụ ụlọakụ, Obiano rịọrịọ ndị mmadụ ka ha pụtawa na-egwu adịghị.

Ọ sị na "anyị nwere ezigbo okwukwe na ndị uweojii, ndị agha na ndị agha mmiri ga-enye ndị mmadụ ezigbo nchekwa, onweghị onye ga-enye unu nsogbu".

Ọnọdụ onye apụla ezi a Ipob hiwere emekpeela akụnụba steeti ahụ ahụ.

Ya mere Gọvanọ Obiano ji ebe ka ụwa nụrụ olu ya.

Gịnị ga-eme ụmụaka na-ele ule WAEC ndị oji egbe chụsara na Nkume, Njaba, Imo steeti?

Gịnị ga-eme ụmụaka na-ele ule WAEC ndị oji egbe chụsara na Nkume, Njaba, Imo steeti?
Nkọwa foto, Gịnị ga-eme ụmụaka na-ele ule WAEC ndị oji egbe chụsara na Nkume, Njaba, Imo steeti?

Ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ a chụsaala ụmụakwụkwọ nọ n'ule WAEC n'ụlọakwụkwọ Comprehensive Secondary, Nkume dị n'okpuruọchịchị Njaba, Imo steeti.

Ụmụakwụkwọ ahụ nọ n'ule edemede asụsụ Bekee (English) n'ụtụtụ Mọnde mgbe ndị a maghị ndị ha bụ bịara n'ike chụsaa ha.

Onye nọ nso ebe ya bụ ihe mere sị na ụmụaka ahụ na-akwado ịmalite ya bụ ule mgbe ndị ahụ batara.

Onye ahụ sị na "ndị omekome ahụ ji egbe chụsasịa ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha n'ụtụtụ a. Ha malitere gbawa egbe agharaghara na-ekwu na ha agaghị ekwe ka ule gaa n'ihu ebe ahụ".
Nkọwa foto, Onye ahụ sị na "ndị omekome ahụ ji egbe chụsasịa ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha n'ụtụtụ a. Ha malitere gbawa egbe agharaghara na-ekwu na ha agaghị ekwe ka ule gaa n'ihu ebe ahụ".

Onye ahụ sị na "ndị omekome ahụ ji egbe chụsasịa ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha n'ụtụtụ a. Ha malitere gbawa egbe agharaghara na-ekwu na ha agaghị ekwe ka ule gaa n'ihu ebe ahụ".

Ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi malitere iri mbọmbọ ọsọ mgbe ha nụrụ ụda egbe.

Ndị ahụ mụnyere ọgbatumtum ndị mmadụ nọ ebe ahụ ọkụ tupu ha apụọ.

Úlóakwúkwó

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Mike Abatam azaghị ekwentị ya mgbe anyị kpọrọ ya.

Ihe onye ọnụ na-eru n'okwu kwuru

Chijoke Agu

Ebe foto si, Chijoke Agu

Nkọwa foto, Chijoke Agu bụbu kọmishọna ụmụntorobia na egwuregwu n'Enugu steeti sị na ọ chọrọ ka gọomentị gbọo ụmụntorobịa gee ha ntị

Onye ọnụ na-eru n'okwu bụbu Komishọna na-ahụ maka gburu gburu n'Enugwu Steeti bụ Chijioke Agu sị na Gọọmenti Imo steeti kwesiri ịma imi n'ala ịchọpụta ihe ụdị ọgbaaghara ji emekaarị na mpaghara ahụ.

Ọ katọrọ ka e si chụsaa ụmụakwụkwọ na-ele ule Waec bụ nke ndị ọzọ sokwa ele n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka niile.

Mazị Agụ sị "onwe anyị ka anyị na-eme".

Ọ sịkwa na "ọ bụghị site n'ịkwụsị ọrụ mgbe niile ka anyị ga-eji zọta Biafra. Ihe a agaghị enyere anyị aka".

Ọ sị na ya na-arịọ ndị Igbo ka ha wepụ aka enye n'ofe maka na ọ bụzị naanị ugboro atọ ka a na-arụzị ọrụ kwa izu.

Mazị Agụ na-akpọkụ ndị ọnụ na-eru n'ọkwụ ka ha katọwa ihe a na-eme n'ala Igbo maka na ọ bụ onwe anyị ka anyị na-emegide.

Ọ sị na ụmụokorobịa sị na ụzọ ka mma iji weta udo bụ ụmu ntoroọbia iji vootu tụpụ ndị ha achọghị.

"Tigbuo zogbuo abụghị ihe ka mma".

Ihe nwereike ime ụmụakwụkwọ a na-eleghi ule a

Ụmụakwkụkọ na-ele ule

Ebe foto si, Getty Images

Otu onye bu ọdịmma agụmaakwukwọ n'isi na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ụmụakwụkwọ ndị ahụ enwechaghị olileanya, ọgwụla ma Chineke ometuru ndị WAEC aka n'obi.

Ọ sị na ụmụakwụkwọ ahụ nwereike itufu otu afọ ma legharịa ya bụ ule.

Ọ kwuru na "O nweghị ka ha ga-esi banye mahadum na-ejighị "English".

Ọ sị na otu ụzọ ha nwereike iji tinye anya n'okwu a bụ ma ndịisi ụlọakwụkwọ ahụ edegaara ndị ụlọọrụ WAEC akwụkwọ kọwaara ha ka ihe si mee.

Ọ sị na e nwere ohere maka mkpesa n'ịhe gbasara ihe ndakwasị dịka ihe mberede, idemmiri, ọgbaghara maọbụ ihe ndị ọzọ.

Ọ sị na ihe dị otu a mee, WAEC ga-eleba anya n'ihe mere e jiri gbajọọ ule ma yigharịa ya.

Mbọ niile BBC gbara ịnụta n'ọnụ ụlọọrụ WAEC ka ha kwuo maka ya bụ ụmụakwụkwọ kpụrụ afọ n'ala.

"Ka anyị ghara imebi ọdịnịhụ ụmụaka anyị" - Gọọmentị Abia steeti

Ụlọakwụkwọ dị n'Ụmuahia

Gọọmentị Abia steeti si n'ọnụ kọmịshọna mgbasaozi bụ John Okiyi arịọ ndị mmadụ ha ekwela ka ndị agboro n'ezo n'okpuru sit at hone naagha ụmụaka ile ule Waec ha taa.

Ha kwuru na ha gbarụrụ ihu maka na o nweghi onye nwere ikike ịtịnye egwu n'ime ndị mmadụ ruo ịhapụ ihe dị mkpa kla ule ṅgwụcha ụlọakwụkwọ sekọndrị.

"Anyị asịghị onye ọbụla pụta maọbụ nọrọ n'ụlọ kama ka ọ hapụ ịmedige ikike ruru mmadụ ibe ya" ka ha kwuru n'ozi ahụ.

Ha dụrụ nne na nna ndụmọdụ ịhụ na ụmụ ha gara lee ule ahụ ma gwakwa ndị nkuzi ha hụ na nchekwa dịịrị ụmụakwụkwọ rue ngwụcha ule ahụ.

Chi ụbọchị Mọnde ọzọ abọọla dịka ndị mmadụ na-ele anya ịma ma atụmatụ 'Sit at home' nke ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) a ga-eme taa.

Cheta na gọọmentị Imo na Anambra steeti adọọla ndị mmadụ aka na ntị ọ kachasị ndị ụlọakụ, ka ha pụta rụọ ọrụ ha taa dịka ụbọchị ndị ọzọ.

N'otu aka ahụ, ihe ọzọ ka mkpa bụ ule ngwụcha ụlọakwụkwọ ndị Sekọndrị bụ West African Examinations Council (Waec) nke na-aga n'ihu taa dịka ụmụakwụkwọ na-ele Bekee (English).

Cheta na kemgbe Monde ụbọchị itoolu nke ọnwa Ọgọst 2021 ka otu Ipob hibere atụmatụ a iji gosi iwe ha maka Nnamdi Kanu bụ onyendu ha gọọmentị Naịjiria nwụchiri.

N'Abia steeti

Ọdọ ebe a na-abanye ụgbọala n'Umahia

N'Abia steeti n'ụtụtụ a, BBC ahụla ụgbọala ndị nchekwa ruru iri na otu na-eme ngagharị n'Aba road.

Ihe ọzọ anyị chọpụtara bụ na ụlọakụ niile kpọchiri akpọchi mana ndị ọrụ ụlọakụ ahụ nọ n'ime ya.

Isi Gate Aba

Onye ntaakụkọ anyị hụrụ ebe ndị ụgbọ 'Keke' na-agagharị dịka ụfọdụ ndị mmadụ pụtakwara mana o rughi ebe etu ahụ si ekwo ekwo maọbụrụ ụbọchị ọzọ.

Ndị ụgbọala ọzọ pụtakwara ọrụ mana ha ahụghị ndị mmadụ ha ga-ebu n'ụzọ akpọrọ 'Health centre' dị n'Ụmahịa.

N'Imo steeti

N'okporoụzọ si Owere gawa Okigwe

Okporoụzọ si Owere gawa Okigwe tọgbọ chakoo dịka ndị mmadụ nakwa ụgbọala apụtaghị chaachaa.

Okporoụzọ Wetheral n'Imo steeti ahụ

Ọ bụkwa otu ihe n'Imo steeti dịka okporoụzọ a ma ama bụ Wetheral road tọgbọ chakoo.

Naanị ụgbọala ole na ole pụtara n'ụzọ dịka ahụghị ndị mmadụ chaachaa.

N'Anambra steeti

Ụlọakụ dị n'Awka

Nchọpụta anyị gosiri na ụlọakụ dị icheiche n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ agbapeghi chaa chaa.

Nke a mere n'agbanyeghị na gọọmentị steeti ahụ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị si ha pụta rụọ ọrụ ha n'izuụka gara aga.

Ọtụtụ ụlọakụ emepeghị chaachaa

Anyị chọpụtakwara na ọdọ mmanụ ụgbọala ndị nọ n'Awka pụtara ọrụ ha dịka foto a si gosi.

Ụlọọrụ mmanụ ụgbọala dị n'Ọka

Ụmụakwụkwọ pụtakwara ịga ụlọakwụkwọ n'Ọka taa dịka ule Waec na-aga ihu ugbua.

Ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'Ọka

N'Ebonyi steeti

Ebe niile dara juu n'Ebonyi n'ihi oke mmiri ozuzo malitere n'ebe elekere atọ nke etiti abalị zowe ebe ahụ.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Anyị hụrụ ndị ọgbatumtum, ndị ụgbọ Keke, nakwa ndị ụgbọala dị icheiche mana ha pere mpe karịa etu ha si di.

Ụlọ ahịa dị icheiche agbapeghị mana anyị chọpụtara na ụlọakwukwọ mepekwara mana ndị ụmụakwụkwọ pụtara dị obere.

Ụlọakụ ndị dị n'Ebonyi steeti agbapekwaghị dịka ibe ha n'Anambra nakwa n'Imo.