Ipob one month sit at home: Ihe Ohaneze, Igbo Ekunie na ndị Igbo ọzọ nwere ikwu maka ya

Aha onyonyo, Ihe ndị Igbo nwere ikwu maka Ipob sit at home otu ọnwa

Ihe onyonyo a na-egosi ihe ndị Igbo nwere ikwu maka etu Indigenous People of Biafra (Ipob) si ekwuputa maka ịnọ n'ụlọ ruo otu ọnwa ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti akpọtaghị Nnamdi Kanu bịa n'ụlọikpe n'Ọktoba 21.

Ndị ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ OhanezendịIgbo, Igbo Ekunie na ndị Igbo nkịtị ekwupụtala uche ha maka iwu ndị Ipob nyere gọọmenti etiti.

N'ozi ha bipụtara, ndị Ohaneze sị na ha echeghị na ọ bụị Ipob nke Nnamdi Kanu hibere kwupụtara nke a.

Ha sị na ha Ipob nke Nnamdi Kanu hibere bụ ọdịnamma ndị Igbo n'obi nke ukwuu.

Otu ọzọ kpọrọ onwe ha Igbo Ekunie kwụ n'ihu mgbe mbụ anwuchịrị Nnamdi kanu n'afọ 2015 dere n'akwụkwọ ozi ha nke onyeisi ha bụ Ichie Chigbo Uzokwelu binyere aka depụtara si ka ndị Ipob kpachapụkwa ụdị uche a.

N'aka ọzọ, ha gwara ndị gọọmenti etiti ka ha gba mbọ hụ na ikpe Nnamdi Kanu gara ọfụma.