Ipob news today: Dịka Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ, ndị na-achị Ipob abaala ịzọ ọchịchị

Ebe foto si, Simon Ekpa/Chika Edoziem/MasterProphet
Kemgbe Maazị Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) laghachịrị na mkpọrọ site na nwuchi gọọmentị Naịjirịa nwuchiri ya, ndị ọ hapụrụ ọchịchị na-adụ onwe aka n'ọnụ na Facebook.
Kepu kepu esemokwu a pụtara ihe nke mbụ n'ọnwa Juaị dịka Simon Ekpa dere n'akara Facebook ya na Maazị Kanu enyeala ya ikike ịgbasa ozi n'ogige Radio Biafra.
Site na nchọpụta BBC Igbo, ụfọdụ ndị so n'ọchịchị Ipob a na-akpọ "Directorate of State" (DOS) na Bekee anabataghị atụmatụ ahụ.
Ndị dị ka Chika Edoziem bu onyeisi ha mechara nye Maazị Ekpa usoro ọ ga-eso tupu e nye ya ohere ịgbasa ozi na Radio Biafra.
Ihe a kpatara na Ekpa ejibeghi ogige Radio Biafra mee mgbasaozi makana ọ sị na agaghị atụrụ ya etu ọ ga-esi gbasaa ozi na Radio Biafraa.
Ọ bụ ogige nke ya a kpọrọ "Enter Biafra" ka o si agbasa ozi.
Ekpa kwukwara na Maazị Edoziem na ndị otu ya sị ya nyefee ha ogige niile o ji agbasa ozi tupu ha e nye ya ohere ịgbasa ozi na Radio Biafra.
Esemokwu banyere atụmatụ sit-at-home

Ebe foto si, Facebook screengrab
Dịka a ka na-ekwu okwu banyere Radio Biafra, okwu dapụtakwara banyere atụmatu ịnọ n'ụlọ ndị Ipob manyere n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Na mbụ, ma Ekpa na ndị DOS kwadoro ya bụ atụmatụ, n'agbanyeghi na nwanne Kanu bụ Kanunta Kanu pụtara kwuo na ezinaụlọ onyeisi Ipob akwadoghi ya.
Kanunta sị na ọ bụ maka etu atụmatụ ahụ ga-esi metụta ụmụakwụkwọ na-ele ule Waec mere ka ha jiri kagbuo ya.
Ka Maazi Kanunta kwuru okwu si n'ọnụ nwanne ya nwoke, ndị DOS ghọọrọ ya ka ahịhịa taa, ma gwa ya na Ipob abụghị ihe ezinaụlọ ya.
Ndị DOS mechara kwenye maka nkagbu atụmatụ ịnọ n'ulọ ahụ mana Maazị Ekpa, site n'ọnụ okwu ya, kwadoro ka atụmatụ a gaa n'ihu.
Na-agbanyeghi na ndị DOS kagburu atụmatu ahụ, ọ gawakwara n'ihu na-adị ire kwa Mọnde ọbụla.
Mazị Ekpa kwuru na etu ahụ o si na-aga n'ihu bụ "auto pilot" mana ụfọdụ ndị Ipob ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka banyere ihe a sị na o gosiri na ndị Ipob anaghịzị ege ndị na-achị ha ntị.
"Egwu dị!"
Otu onye Ipob achọghị ka a kpọọ aha ya sị na dịka ndị Ipob anaghị achọ ka ihe a na-eme pụta ihe, nke bụ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị otu ha anọghị n'ọchịchị na-ahu Ekpa dịka onye nwereike ịnọchi anya Kanu ruo oge ọ pụtara.
Dịka o siri kwuo, "Egwu dị, makana ya bụrụ na ndị mmadụ ejighi ihe DOS kwuru mee ihe, ọ ga-ara ahụ ịhazi ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ."
Okwu a nwa amadị a gwara BBC dịkwa ka ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-akwado Ipob na-ekwu na soshal midia banyere ọnọdụ ọchịchi otu ahụ.
Gịnị ka Ekpa kwuru banyere ọnọdụ a?
Simon Ekpa, dịka ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka, ekweghi ịkpọ okwu aha banyere ọnọdụ ọchịchị Ipob.
Ọ sị na ihe na-eme bụ ihe ha ji "arata ndị ntaakụkọ ka ha kwuwe maka Ipob."
Mana, onye ma maka ihe na-eme n'ime Ipob gwara BBC Igbo na nke ahụ bụ okpotokpo asị.

Ebe foto si, Chika Edoziem/ Facebook
Ọ sị: "Ekpa achọghị ịgwa unu eziokwu makana ọ na-achọ ka a hụta ya dịka onye chọrọ ọganihu Ipob agaghị pụta kwuwe okwu banyere otu ahụ.
"Nke bụ eziokwu bụ na ezigbote esemokwu dị n'etiti ndị a."
Okwu nwamadị a kwuru mechara pụta ihe dịka ndị DOS gụchapụrụ Ekpa n'ime ndị Ipob kpọmkwem ma kwuo na ndi otu ha na Finland amaghị ya dịka onye otu ha.
Ihe mere e ji chụo Nelly Ofoegbu
Dịka okwu na-ada n'etiti Ekpa na ndị DOS, onye nnakọta ego ndi Ipob bụ Nelly Ofoegbu nọkwa na-agwa onye ọbụla chọrọ ige ntị na o nwere ndị isi otu ha na-agba ego otu ahụ n'akpa.
Nwada Ofoegbu sịrị na ọ bụ onye oji ego otu ahụ bụ Nnennaya Anya na ndị ọzọ mere mkpesa e ji mechie ọba akụ Ipob n'Amerịka.
O bokwara ebube na ọtụtụ ego ndị mmadụ tụtara maka iji kwadoo otu nchekwa a kpọrọ Eastern Security Network (ESN) dị n'akpa Odoziakụ Anya na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye mgbasaozi Ipob e ji Prince Darlington maara sọkwa Ofoegbu eti mkpụ maka ego a nke mere otu mpaghara Ipob ji nye ya ezumike nwa mgbenta n'ọnwa Ọgọstụ.
E mechara wepu mmachi ahụ a machiri Prince Darlington dịka Maazị Ekpa katọọrọ atụmatụ ahụ.
Mana, ya bu okwu ka gawakwara n'ihu ma ruo oge ụfọdụ ụmụnwaanyị Ipob n'Amerịka nke gụnyere Ofoegbu, Rita Eze na ndị ọzọ gbakọtara isi were sị na ha na-achọ ịmata isi ihe na-eme n'Ipob.
Mpụtara njem ahụ bụ ozi Rita Eze ziri na ọ na-apụla Maazị Edoziem ọchịchị dịka onyeisi Ipob.

Ebe foto si, Facebook/Other

Ebe foto si, Facebook/other
Ka nke a ka na-eme Nelly Ofoegbu n'onwe ya binyere aka n'akwụkwọ ozi nke sị na ndị Ipob n'Amerịka agbanyela Chika Edoziem na ndị otu ya azụ.

Ebe foto si, Facebook/Other
Ọ bụ ka nke a pụtachara ka Chika Edoziem wepụtara akwụkwọ ozi nke ya, bụ nke sị na Ipob achụọla Nelly Ofoegbu n'ọrụ.

Ebe foto si, Chika Edoziem
Kedụ ebe Master Prophet kwụ?
Nwamadị a na-akpọ onwe ya Master Prophet bụ ọgọ Nnamdi Kanu sokwa n'ime ndi`ị ji soshal midia mere ebe esemokwu banyere Ipob.
Na mbido, Master Prophet gbarụrala ndị DOS ihu maka etu ha si katọọ Kanunta Kanu maka okwu banyere "sit-at-home".
Ugbua, ọ sị na ya na ha na-arụkọ ọrụ iji hu na anapụghị ha ọkwa ha.
Master prophet mere ọtụtụ mkparịtaụka n'akara Facebook ya nakwa Youtube, ebe ọ nọ na-ebo Simon Ekpa, Ifeanyi Ejiofor na ndị ọzọ ebubo na ha chọrọ ịnapụ Chika Edoziem ọkwa ya.

Ebe foto si, Facebook screengrab
Ebe okwu ndị a dị ugbua?
Okwu ndị a ka na-arị onwe ha elu dịka ndị a niile ka na-ebo onwe ha ebubo dị iche iche.
Ọtụtụ ndị otu a na-ekwu okwu na soshal media na-ekwu na ihe a na-eme adịghi ha mma n'obi, ọkachasị ugbua ha si aka ka ji onye isi ha.

Ebe foto si, Screengrab/Facebook
Mana, agbanyeghi nke a, ọgụ a ka na-adasị ike n'Ipob, dị ka ndị mmadụ na-ahọrọ ebe ha ga-akwụ nakwa onye ha ga-akwado.
Onye abụghị onye Ipob gwara BBC okwu sị na ihe a gosiri na otu a enweghi ebe o ji azụ aga ma ya bụrụ na Nnamdi Kanu anọghị ebe ọ ga-anọ na-edu ya nke ọma.
Onye a kwukwara na ụdịrị ihe a emeghị oge Uche Mefor no dịka osote onyeisi Ipob makana ọ bụ onye a ma ama, ma bụkwara onye a na-akwanyere ugwu.
Ọ sị: "Ndị mmadụ amaghị ndị a na-achị Ipob ugbua. Ekpa ka ha nwee ọnụ makana ọ bụ onye nweburu ndi na-eso ya maka ozi ọ na-agbasa na Facebook ma oge Kanu ka nọ n'ezi."
Agbanyeghi ihe a onye kwuru, otu onye Ipob gwara BBC Igbo na ha ga-emecha kpezie okwu a niile dịịrị ha makana "ọ bụ njem mwereonwe Biafra ka mkpa."














