Nnamdi Kanu Reaction: Etu e si tọọrọ Nnamdi Kanu ga-ewetara Naijiria nsogbu karia nke Umaru Dikko- Prof Bola Akinterinwa

Ebe foto si, NIIA/FG
Ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ bụ Ọkammụta Bola Akinterinwa adọọla aka na ntị na gọọmentị etiti etinyela Naijiria na nsogbu maka etu ha siri tọọrọ Nnamdi Kanu na mba Kenya.
Akinterinwa kwuru na ọchịchị Buhari chere na ọ ga-eji mmaja na iyi egwu manye ụmụ Naijiri ka ha dị n'otu mana ọ gaghị ekwe omume.
"Ọ bụrụ na ọchịchị Buhari na-eche na ha ga-esi na iyi ụmụ Naijiria egwu jikọta Naijiria, ha kwụsị ịrọ nrọ."
Akinterinwa, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ 'Nigerian Institute of International Affairs' kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ akwụkwọ akụkọ 'Punch' nwere ụbọchị Wenezde.
Ọ sịrị na nnwụchi Kanu nke ọ kpọrọ 'ntọrị' megidere iwu mbaụwa dịka agwa ahụ tere mba Briten unyi n'ihu.
"Imebo mba Briten na mba ọzọ agaghị ala na nkịtị."
O kwukwara na ihe ahụ mere abụghị ihe a ga na-ajụ ma o nwere ike ibute nsogbu n'etiti mba na mba, kama na ọ butela nghọtahie n'etiti Naijiria na Briten dịka ọ kwuru na ọ bụ "mwakpo ikike dịịrị mba Briten dịka mba dịịrị onwe ya."

Ebe foto si, Getty Images
Akinterinwa tara Ọkaiwu Naijiria bụ Abubakar Malami ụta sị na ọ kpaghị agwa gosiri na ọ mara maka iwu jịkọrọ mba na mba.
"Ị gaghị anọ na Naijiria na-egosi na ịmaghị iwu mbaụwa ịmata na ịgaghị emenyenwu nwa amala Briten ihere".
"Gọọmentị Naijiria kpebiri ịwakpo ikike ndị Briten, Gọọmentị Briten were na-ekwu sị na anyị enweghị ikike ịwakpo ha dịka mba kwụụrụ onwe ha."
"Ọkaiwu Naijria bụ Malami bụ onye a sịbu na ọ maara maka iwu mana ka o siri matabe iwu mbaụwa edoghị anya maka na ị gaghị emebọ nwa amala mba Briten n'ihi na n'oge a nwụchiri Nnamdi Kanu, o ji akwụkwọ njirimara ya dịka nwamala Briten. Ya bụ nsogbu adịla adị."
Akinterinwa kọwara na nke a nwere ike ịdị ka oge Briten tara ọchịchị Naijiria ahụhụ maka nnwụchi Umaru Dikko na mba Briten n'ụzọ ekwesịghị ekwesị dịka iwu si kwuo.
"Ihe ga-eso ya nwere ike ịkara Naijiria njọ karịa nke mere oge a nwụchiri Umaru Dikko nke butere esemokwu n'etiti Naijiria na mba Briten afọ abụọ."
"Gọọmentị mba Briten nwụchiri mmadụ 77 maka ya bụ ihe, ebe ha tụrụ mmadụ asa mkpọrọ maka ya."
Cheta na n'afọ 1984, ọchịchị Buhari dịka onyeagha nwụchiri Umaru Abdulrahman Dikko bụ onye mịnịsta na-ahụ maka njem n'ọchịchị Shehu Shagarị, gbaa ya ọgwụ ma tinye ya n'igbe, ịtọrọ ya kpọlata ya Naijiria maka ịzara ọnụ ya n'ebubo nrụrụaka.
Mana gọọmentị Briten chọpụtara ma gbochie ha imezu ebumnobi ha dịka ha chọwara nwa amadị ahụ tupu efelata ya n'ime igbe.
'Okwu a metụtara Kenya na Briten na Naijiria'

Ebe foto si, Kenya High Commission
Akinterinwa kwuru na mba Kenya agaghị agọpụli onwe ha n'ihe mere Kanu.
"Kenya kwesịrị ịkọwa ka e siri tọọrọ mmadụ n'ala gị, ị sị na ị maghị."
"Ha agaghị ekwu na ha amaghị ihe mere."
" Gọọmentị Naijiria tọọrọ mmadụ n'ala mba ọzọ nweere onwe ya.
"Naijiria Gọọmentị na Kenya nwere ihe ha ga-asa n'okwu ịkpa nkata tọọrọ mmadụ n'ala ọzọ."
"Briten n'onwe ya nwere ikike ichekwa ya(Nnamdi Kanu) na Briten nakwa ebe ọbụla ọ nọ."
N'okwu nnwụchi Sunday Igboho

Ebe foto si, HTTPS://WWW.INSTAGRAM.COM/SUNDAY_IGBOHO1/
Akinterinwa kwuru na nzọụkwụ ọchịchị Buhari anaghị aga n'anya ya.
"Buhari egosila onwe ya site na nnwụchi Sunday Igboho na Benin Republic dịka onye ga-ekposa Naijiria."
"Nke a bụ n'ihi na dị okenye Yoruba na-ekwubu okwu nhazigharị Naijiria na-ekwuzi okwu nnwereonwe Oduduwa."
"Mwakpo ụlọ ya megidere iwu. E nwetaghị ikike inwụchi ya. Ngagharị ndị otu ya na-eme enweghị tigbuo-zogbuo so ya."
"Ndị ọrụ nchekwa wakporo ya pụtara na-ekwu na ha gburu mmadụ na be ya."
O kwuru na nke a bụ n'ihi aka ike ọchịchị Buhari ji eso nsogbu dịrị Naijiria ugbua kama ime onye ka e mere ibe ya.
'Ọ bụghị eziokwu na agaghị ekewalị Naijiria'
Akinterinwa kwuru na n'agbanyeghị na iwu Naijiria kwuru na agaghị ekewali Naijiria, na akụkọ ihe mere na mba ụwa mgbe ochie gosiri na ọ bụghị eziokwu dịka e nwere mba ndị kewarala.
O kwuru na gọọmentị kwesịrị ịkpọ ụmụ Naijiria oku ka a kparịta ụka ihe a ga-eme ka onye ọbụla nọrọ n'otu, na ọ bụghị ihe ike ga-emeli.
O kwuru na akaike ọchịchị Buhari nwere ike ịkpalite mba ndị kpọrọ ya asị ibido inye ndị na-eti mkpu mmegbu Naijiria nkwado ibute ọgbaghara na Naijiria.
"Onye ọbụla n'ụwa nwere ikike ịchọ nnwereonwe ma ọ bụrụhala na onye ahụ emeghị tigbuo-zọgbuo."













