Kedụ ihe jikọrọ Cameroon na Nigeriana nnwụchi Nnamdi Kanu?

Nnamdi Kanu na ọkọlọtọ Kamerun

Ebe foto si, Getty Images/Nigeria Government

Kemgbe mba Cameroon ekelera Naịjirịa maka nnwụchigharị Nnamdi Kanu, ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụị n'ọnụ bụ :LKeedụ sakramentị jịkọrọ Cameroon na Naijria n'okwu gbasara Nnamdi Kanu?

Nke a bụ n'ihi na naanị ihe ụfọdụ ma maka nnwuchi Kanu bụ na ụfọdụ gụnyere ndị ezinaụlọ Kanu na-arụ mba Kernya aka.

Mana ụbọchị Tuzde, Felix Mbayu, onye na-anọchị anya Onyeisiala Kamerun bụ Paul Biaya butere Onyeisiala Muhammad Buhari ukpa ekele maka nnwuchiri a nwuchiri Kanu oge ọ bịara hụ ya n'obi gọọmenti n'Abuja.

Nke a pụtara ihe n'ozi ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina wepụtaran'akara Facebook ya.

Adesina kwuru na Buhari gwara Felix Mbuya sị, "Onye ya na agbataobi ya adịghị na mma ga-enwe nsogbu."

" Ọdịmma anyị na Cameroon malitere oge m nọ n'ọrụ ndị agha. Mba ụnụ nyere anyị aka oge Agha."

N'ọsịsa ya, Mbayu kwuru na obi dị Onyeisiala mba Cameroun bụ Paul Biya ụtọ n'ihe ndị Naijiria na-eme n'Afrịka, sị na agbata obi ha bụ abụghị naanị n'okeala na ihe mere gboo, "kama nsogbu chere anyị aka mgba jikọrọ anyị."

Mbayu , onye jara Naijiria ikpe maka iji ndị uweojii mba ụwa a kpọrọ 'Interpol' were kpachikọ Kanu sịrị: "Nsogbu ndị a metụtara nchekwa ọkachasị dị mkpa na anyị jịọrọ aka chọwa ụzọ mgbapụta."

Mbayu kwuru na "ọchịchị Biya na-ele anya na ndị na-eti mkpu ka e nye ha Ambazonia na mba Cameroon agaghị ahụ ebe mgbakwasị ụkwụ na Naijiria, " dịka ọ rụtụrụ aka na ụfọdụ ndị na-achọ isi n'ọgbaghara dị na mba abụọ ndị a kposaa akụkụ ala ha ebe ndị a na-asụ Bekee.

Akụkọ Igbo

Cheta onye ndu ndị otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwubuola n'ozi mgbasaozi ya, na otu Ipob na ndị Ambazonia na-enwe mmekọrịta maka ọganihu ebumnobi ha nke bụ nnwereonwe site na mba ha nọbu na ya.

Kedụ ndị bụ ndị Ambazonia a na-arụ aka?

Ndị kpọrọ onwe ha otu Amabzonia

Ebe foto si, BBC/Screenshot

Ambazonia bụ otu malitere na mba Cameroun site n'ebubo mmegbu ha na-ebo gọọmentị mba ahụ.

Ebe ahụ a na-akpọ kwa 'Amba Land' bụ ebe ndị na-asụ Bekee kachasị biri na mba ahụ.

Ha kacha biri na mpaghara Ugwu Cameroun.

Ọ bụ n'afọ 2017 ka otu onye na-edu ndị na-eti mkpu nnwereonwe a bụ Sisiku Ayuk Tabe kwuputara na Ambazonia bụ mba kwụrụ onwe ya esoghizi na Cameroun.

Gọọmentị Etiti Cameroun kwukwara na ha ekweghi na nkwuputa ma rue n'ọnwa Nọvemba 2017 malite agha megide ndị 'Ambazonia'

E mechara ha nwuchie Tabe ma tụọ ya na mmadụ itoolu ọzọ nga mkpụrụ ọka n'afọ 2019. E boro ha ebubo ịgba mgba okpuru.