Ihe Somadina kwuru maka Regina Daniels, ESN na Biafra

Ebe foto si, Somadina Adinma /Regina Daniels Instagram page
Somadina Adinma gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị mmadụ na-ebugharị okwu na o nwere ihe jịkọrọ Regina Daniels na-emekwa ihe nkiri na Nollywood.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere taa bụ ụbọchị March 7, 2021.
Ndị nso nso Adinma jụrụ ya ma obi agbawara ya mgbe Regina Daniels lụrụ di, ọ zara si na ọ maghị maka ihe ha na-ekwu.
O kwuru na ọ bụ ihe nkiri ya na Regina mekọrọ bụ ihe butere ndị mmadụ ikwu na ha na-ayị ka enyi nwoke na enyi nwaanyị.
O mechara kwuo ka ndị mmadụ kwụsị ijụ ya maka Regina makana ọ lụlọla di.
Ihe Somadina kwuru maka ESN
Somadina kwuru na atụmaatụ Eastern Security Network abụghị ihe dị njọ makana o chere na ndị wepụtara ya , hibere ya maka iweta ezi nchekwa ala Igbo.
Somadina kwurukwara na okwu Biafra dimma mana ọ ga-adị mma ka ekwekọrịta ụzọ dị onye Igbo ọbụla mma n'etu e si achọ ya ụ Biafra.
N'okwu ya, "akwụnyeghị m na nkewa Naịjirịa, mana a mara ihe ga-adị ndị be anyị mma, si mee ya."
Somadina kwuru na ọ ga-achọ ị na-akpa ajọ agwa n'ihe nkiri makana o teela o mewere agwa onye ọma emeka n'ihe nkiri.
Adinma kwuru na e nye ya ohere ịbụ gọvanọ Anambra steeti bụ steeti ya, ọ ga-eji aka abụọ nara ya.
O kwuru na ọ kwenyere n'omenaala ma kwenyekwa n'ọkpukperechi Christ makana n'okwu ya, akwụkwọ nsọ kwuru ka e nye Ceasar ihe dịrị Ceasar ma nye Chukwu nke ya.











