Ihe Somadina kwuru maka Regina Daniels, ESN na Biafra

Somadina Adinma /Regina Daniels

Ebe foto si, Somadina Adinma /Regina Daniels Instagram page

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Somadina Adinma gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị mmadụ na-ebugharị okwu na o nwere ihe jịkọrọ Regina Daniels na-emekwa ihe nkiri na Nollywood.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere taa bụ ụbọchị March 7, 2021.

Ndị nso nso Adinma jụrụ ya ma obi agbawara ya mgbe Regina Daniels lụrụ di, ọ zara si na ọ maghị maka ihe ha na-ekwu.

O kwuru na ọ bụ ihe nkiri ya na Regina mekọrọ bụ ihe butere ndị mmadụ ikwu na ha na-ayị ka enyi nwoke na enyi nwaanyị.

O mechara kwuo ka ndị mmadụ kwụsị ijụ ya maka Regina makana ọ lụlọla di.

Ihe Somadina kwuru maka ESN

Somadina kwuru na atụmaatụ Eastern Security Network abụghị ihe dị njọ makana o chere na ndị wepụtara ya , hibere ya maka iweta ezi nchekwa ala Igbo.

Somadina kwurukwara na okwu Biafra dimma mana ọ ga-adị mma ka ekwekọrịta ụzọ dị onye Igbo ọbụla mma n'etu e si achọ ya ụ Biafra.

N'okwu ya, "akwụnyeghị m na nkewa Naịjirịa, mana a mara ihe ga-adị ndị be anyị mma, si mee ya."

Aha onyonyo, Ihe mere m jiri akwado 'social media bill' - Ned Nwoko

Somadina kwuru na ọ ga-achọ ị na-akpa ajọ agwa n'ihe nkiri makana o teela o mewere agwa onye ọma emeka n'ihe nkiri.

Adinma kwuru na e nye ya ohere ịbụ gọvanọ Anambra steeti bụ steeti ya, ọ ga-eji aka abụọ nara ya.

O kwuru na ọ kwenyere n'omenaala ma kwenyekwa n'ọkpukperechi Christ makana n'okwu ya, akwụkwọ nsọ kwuru ka e nye Ceasar ihe dịrị Ceasar ma nye Chukwu nke ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ada Jesus Comedy sị na ya arịọla ndị niile ya mejọrọ mgbaghara