Kennedy Nzechukwu bụ onye akpụ n'ọnụ ugbua n'asọmpị UFC 259

Kennedy Nzechukwu

Ebe foto si, UFC Website

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Kennedy Nzechukwu kụrụ Carlos Ulberg n'asọmpị 'light heavyweight' UFC 259 iji nwete mbụgo.

Nke a mere dịka a na-atụ anya na Israel Adesanya ga-echịpịa Jan Blachowicz ọnụ n'ogo nke ha UFC 259 mana nke a emeghị.

Nzechukwu alụọla ọgụ UFC ugboro atọ ugbua , nke mbụ bụ ya na Paul Craig onye mba Scotland kwatara ya, nke abụọ bụ ya na Darko Stosic na Newark, New Jersey .

Nke a o meriri Carlos Ulberg na Las Vegas bụ ọgụ atọ ya na UFC 259 kamgbe ọnwa iri na asaa o kwụsịrị isonye n'ọgụ UFC maka ahụ o meruru.

Mmeri a tinyere oke ọnụ n'ọnụ ụmụ Naịjirịa dịka ha na-ekwu na ọ bụ eziokwu na Israel Adesanya emerighị n'asọmpị UFC 259 n'ogo nke ya na Jan Blachowicz kwatara mana mmeri Nzechukwu na-akasi ha obi ugbua.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Ihe ikwesiri ịma maka nwa afọ Igbo ụwa kpụ n'ọnụ ugbua na UFC 259

Nzechukwu bụ nwa Imo steeti dị n'ala Naịjirịa.

A mụrụ ya n'ọnwa June 13, n'afọ 1992.

Nzechukwu na ndị bee si Naịjirịa gawa nba Amerịka n'afọ 2010 dịka Wikipedia si depụta.

Nne ya mechara gaa debanye aha ya n'egwuregwu 'Mixed Martial Arts n'afọ 2015' mgbe ọ nọ na kọleji.

O mechara si n'ụlọakwụkwụ kọleji mgbe nne ya bidoro rịawa ọrịa.