South east attacks: Mwakpo niile mere na mpaghara Ọwụwa anyanwụ a n'izu a

Eze Amukamara

Ebe foto si, Eze Amukamara

Ndị oji egbe a na-akpọ 'unknown gunmen' kpakasịrị mkpamkpa na mpaghara Ọwụwa anyanwụ butere ọnwụ ihe karịrị mmadụ iri na ise n'ime otu izu a.

Ọ kwụsịghị n'ogbugbu ndị mmadụ, a gbakwara ma ụlọ ma ụgbọala ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ n'ime ihe karịrị steeti abụọ na mpaghara Ọwụwa anyanwụ.

Ụfọdụ n'ime ndị nwụrụ n'ogbugbu a gụnyere ndị uweojii na ndị nkịtị.

Mkpamkpa kpara na ebe ọ kpara:

Anambra steeti

N'Anambra steeti, ọ dị ka chi bọọ a nụ ọzọ na steeti a dịka mkpamkpa rịrị ibe ya elu na steeti ahụ site n'izu gara aga banye na nke a.

Ndị omekome wakporo ndị uweojii n'ụzọ si Ọnịcha gawa Owere, nso Ọkịja, n'ụbọchị Tọzde, Ọktoba 7, 2021.

Ozubulu

Ebe foto si, video screengrab

Ihe onyonyo gosiri ụgbọala atọ gụnyere nke ndị uweojii na-agba ọkụ.

BBC Igbo ka na-echebiri ozi si n'aka Tochukwu Ikenganyịa bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ.

Imo steeti

N'Imo steeti, ndị omekome ji egbe wakporo ma mụnye ụlọ nna Vincent Dimkpa bụ onye a ma na soshal midia dịka 'Eze Awọ' ọkụ, n'obodo ha n'Awọ-Ọmamma.

Ha akwụsịghị ebe ahụ, hụ mụnyekwara ụfọdụ ụgbọala ndị ha hụrụ n'ihu ụlọ ya ọkụ.

Ndị omekome ahụ gbara ụlọ nna Dimkpa ọkụ tinyekwara isi gaa n'ụlọ Eze Amukamara n'otu obodo Awọ-Ọmamma ahụ wee gbaa ya ọkụ.

Eze Amukamara

Ebe foto si, Eze Amukamara

Nkọwa foto, Ụlọ Eze Amukamara ndị omekome gbara ọkụ n'Awọ-Ọmamma

Eze Awo gwara BBC na ọ bụ maka okwu ọ na-ekwu kwugide ndị sị na ha na-achọ nnwereonwe Biafra mere e ji wakpoo ụlọ ya.

Ọ sị: "Cheta na ha boro m ebubo na aka m dị n'ọnwụ Ikonso nwanne m. Ụlọ Eze a ha gbakwara ọkụ bụkwa maka ebubo na o suru Ikonso imi."

Enweghi onye nwụrụ na mwakpo a.

N'ụbọchị Mọnde, Ọktoba 4, ndị oji egbe chụsasịrị ndị mmadụ n'Owere, isiobodo Imo steeti, dịka ha na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ.

Ebonyi steeti

N'Ebonyi steeti, ndị oji egbe wakporo ma gbuo ihe ruru mmadụ iri n'ụbọchị Tọzde, Ọktoba 7, 2021.

Ndị ha gburu gụnyere ndị uweojii abụọ, ndị ọkaiwu abụọ na ndị nkịtị ruru mmadụ asatọ, bụ ndị ha wakporo n'ụzọ Ọnịcha Igboeze nakwa mpaghara Isu nke steeti ahụ.

Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na nnyocha ka na a ka na-eme nnyocha ịchọpụta etu ihe mere si mee na ndị mere ya bụ ihe.

Enugwu steeti

N'Enugwu steeti, ndị omekome ji egbe gburu mmadụ abụọ bụ ndị nche, n'Enugu-Ezike dị n'okpuruọchịchị Igbo-Eze.

Ha akwụsịghị ebe ahụ, ha gara n'ihu gbaa ma ụlọ ma ụgbọala ndị nche ahụ ọkụ.

Ndí uweojii ebe ha gara nleta n'Enugu - Ezike

Ebe foto si, Enugu Police

Nkọwa foto, Abubakar Lawal bụ kọmishọna uweojii Enugwu steeti du ndị otu ya gaa Enugu-Ezike ịhụ ihe mere

Amabeghi ndị kpara mkpamkpa a.

Mkpamkpa ndị oji egbe malitere ịga ọkụ ọkụ na mpaghara Ọwụwa anyanwụ n'ime ọnwa ole na ole gara aga n'afọ 2021 a.

Ka ọ dị ugbua, agaghị asị na ọ bụ naanị ndị uweojii ka ha na-egbu, dịka ha na-egbukwa ma ndị nkịtị ma na-agba ma ụlọ ma ụgbọala ọkụ.