Unknown Gunmen: A gbagbuola ndị uweojii abụọ na mmadụ asatọ ọzọ n'Ebonyi steeti

Ebe foto si, NG Police
Ụzụ akwa na-atụ n''okpuru ọchịchị Ọnịcha nke Ebonyi steeti dịka ndị ojiegbe aga amaghi ndi ha bụ gburu ndị ọkaiwu abụo, ndị uweojii abụọ na ihe ruru mmadụ asaa ndị ọzọ n'obodo Isu nakwa Onicha Igboeze.
Ndị hụrụ ihe a mere na-akọwa na ndị ọkaiwu ahụ ji ụgbọala nke ha a ga mmemme ndị ọkaiwu mgbe ndị ojiegbe amaghị jidere ha n'ụzọ gbuo ha.
Ha kọwakwara na a gbara ụgbọala bu ha ọkụ tupu ha apụọ n'ebe ahụ.
Ọ bụ ụgbọala Lexus ka ndị omekome a ji mee njem ịkpa ike ha.
Ka ha gbuchara ndị ọkaiwu a, ndi omekome ahụ gbara ụgbọala ahụ ha ji bịa ọkụ ma buru ụgbọla ndị ọkaiwu ahụ ha gburu gbalaga.
Ndị uweojii ahụ nwụrụ bụ ndị agbagburu n'Isu mana o dobeghi anya maọbụ n'ụlọọrụ ha kaọbụ na nche ụzọ ka egburu ha.
Akụkọ kwuru na Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na nke a mere n'ezie.
Odah kwukwara na nnyocha na-aga n'ihu ka amata ka ihe si gaa n'ezie.
N'ime ọnwa atọ gara aga ndị ojiegbe aga na ndị ọrụ nchekwa egbuola ọtụtụ mmadụ n'Igboeze.
Na nso nso a, mgbọ tụrụ Elizabeth Agwu bu nwa eze ọdịnala oge ndị uweojii batara obodo ahụ ijide ndị a na-ebo ebubo na ha bụ ndị omekome.
Nwa ada Agwu mechara nwụọ site na mgbọ egbe ahụ tụrụ ya. Otu onye n'ime ndi ahụ ndị uweojii bịara ịnwụchi mechakwara nwụọ.
Tupu nke ahụ emee, mmadụ ndi omekome na-amanye "sit-at-home" gbara mmadụ asaa na-aga njem ọkụ.










