Ihe mere Gọvanọ Umahi jiri sị na ọ ga-anwụchi ezinaụlọ ndị 'Unknown Gunmen' n’Ebonyi

Aha onyonyo, Ihe mere Gọvanọ Umahi jiri sị na ọ ga-anwụchị ezinaụlọ ndị 'Unknown Gunmen' n’Ebonyi

Frances Nwaze bụ onye enyemaka gọvanọ David Umahi nke Ebonyi Steeti n’ihe banyere mgbasaozi sị na ọ bụ etu ọnọdụ ugbua siri dị mere gọvanọ ahụ jiri kwuo na ọ ga-amalite ijide ezinaụlọ ndị ji egbe akpa ike na steeti ahụ.

Dịka o siri kwuo, Gọvanọ Umahi gwara ndị na-achị okpuruọchịchị na ọ bụ ha ka ọ dịrị ịgba ama maka ndị na-akpa ike n’ogige ha.

Ọ sị: “Gọvanọ gwara ndị isi okpuruọchịchị, ndị kansịlọ na ndị eze ọdịnala na ọ bụrụ na ha arụghị ọrụ ha site n’ịgbara gọọmentị ama, ọ ga-ata ha ahụhụ site n'ịkwụsịtụ ha ọrụ nwamgbenta.”

Ọ sịkwa na nne na nna kwesịrị ịdụ ụmụaka ha ọdụ banyere itinye aka n’ụzọ na-ezighi ezi.

N’iza ajụjụ banyere ịnwụchi ndị aka ha dị ọcha, Nwaeze sị na ọ bụ etu ọnọdụ siri dịrị ugbua kpatara ya.

Ebonyi steeti so na steeti dị n’Ọwụwa Anyanwụ ndị omekome na-awakpo ma na-egbu mmadụ aghara aghara kemgbe afọ 2021 malitere.