Ọkara ndị butere covid-19 n'ụbọchị Monde si Legọs.
Mmadụ otu puku na narị abụọ na anọ ọhụrụ ka a chọtara ọrịa coronavirus n'ahụ ha na Naijiria, dịka ngalaba NCDC na-ahụ maka mgbochi ọrịa si kwuo.
Mmadụ narị isii na iri ise na anọ n'ime ha si Legọs, ebe narị abụọ si Abuja.
N'otu aka ahụ, gọọmentị Legọs steeti enyela iwu ka ụlọakwụkwọ niile dị na steeti ahụ mepee site n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Jenụwarị a.
Kọmishọna agụmakwụkwọ steeti ahụ bụ Folashade Adefisayo kwuputere nke a dịkaọ na-ekwu na ụlọakwụkwọ ndị a ga-esorịrị usoro mgbochi covid-19 niile gọọmentị wepụtara.
Cheta na gọọmentị ahụ kwuburu na ndị ọrụ niile ga-enweike ịmalite ọrụ n'ụbọchị iri na asatọ n'ọnwa a kwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post














