Unknown Gunmen Attack: Etu ndị omekome ji egbe si wakpoo ndị uweojii n'ụzọ si Ọnịcha gawa Owere

Ebe foto si, Video Screengrab
Ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ a na-akpọkarị "Unknown Gunmen" wakporo ndị uweojii n'ụzọ si Ọnịcha gawa Owere.
Mwakpo a mere n'ụzọ si Ọnịcha gawa Owere, na mpaghara Ọkịja.
Ihe onyonyo gosiri ya bụ mwakpo na-egosi ụgbọala ndị uweojii atọ na-agba ọkụ nakwa ụgbọala ndị nkịtị na-agba ọkụ.
Onye uweojii achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na mwakpo ahụ tara isi otu onye uweojii, ebe mmadụ atọ n'ime ndị oji egbe ahụ nwụrụ na ya.
BBC Igbo enwetebeghi akaebe banyere ihe a onye uweojii a kwuru.

Onye uweojii ahụ sị na ndị omekome ahụ burula ozu ndị otu ha nwụrụ anwụ gbalaga.
Ọ sịkwa na ndị nkịtị na-agara onwe ha nwụkwara na mwakpo ahụ.
Ndị uweojii nwetere ụgbọala Toyota abụọ dịka mwakpo ahụ mechara.

Ebe foto si, video screengrab
Dịka anyị na-ede akụkọ a, anyị amabeghị ma ndị uweojii ahụ anọ njem n'oge mwakpo a mere kaọbụ n'ọgbọ nchekwa Bekee kpọrọ "checkpoint" ka ha nọ.
Mwakpo a na-abịa dịka o mere abalị abụọ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Baba Alkali tinyere Maazị Echeng Eworo Echeng dịka onyeisi ndị uweojii n'Anambara.
Ndị ojiegbe mekwara mwakpo n'Ebonyi ebe ha gburu ndị uweojii nakwa ndị ọkaiwu.








