Rivers State Police Attacks: Ndị ojiegbe gburu ndị uweojii asaa na mwakpo ha mere na Rivers State

Ogige ndị uweojii

Ndị uweojii asaa tufuru ndụ ha na mwakpo ndị ojiegbe mere na Rivers Steeti n'abalị Fraịde.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rịvas Steeti bụ Nnamdị Omoni kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ehihie Satọdee.

Maazị Omoni kwukwara na ndị ekperima ahụ napụrụ ndị uweojii egbe AK47 ise na mwakpo ahụ, mana mmadụ abụọ n'ime ha ka ndị uweojii gbagburu.

Mwakpo ndị ojiegbe na Rivers steeti

Ebe foto si, Ndị uweojii Rivers steeti

Nkọwa foto, Ebe mgbọ tụrụ n'ụgbọala dị n'ogige ndị uweojii dịka ndị ekperima wakporo ha.

Ụlọọrụ ndị uweojii ndị ekperima ahụ wakporo gụnyere:

  • Ndị uweojii na-anọ na akwammiri Choba (choba bridge). Ndị uweojii abụọ nwụrụ.
  • Ụlọọrụ ndị uweojii dị na Rumuji. Ndị uweojii abụọ nwụrụ, ndị ekperima abụọ nwụkwara.
  • Ụlọọrụ ndị uweojii dị na Elimgbu. Ndị uweojii atọ nwụrụ
Mwakpo ndị ojiegbe na Rivers steeti

Ebe foto si, Ndị uweojii Rivers steeti

Nkọwa foto, Ụgbọala dị n'ogige ndị uweojii nke ndị ekperima ahụ mebiri

Onye ntaakụkọ BBC gakwara gakwara n'Elimbu ebe ndị ji egbe wakpokwara ụlọ ndị uweojii.

Dịka o siri kọwa, ndị ji egbe a banyere n'ebe ahụ dịka ọ na-akụ elekere asatọ nke abalị ma gba onye uweojii ha hụrụ ekweghị igosi ha ebe a na-edebe egbe egbe.

O kwuru na onyeisi ndị uweojii n'ebe ahụ gwara ya na otu onye otu ha nwụrụ na mwakpo ahụ.

Ụgbọala ndị uweojii a gbara ọkụ
Nkọwa foto, Ụgbọala ndị uweojii a gbara ọkụ na mwakpo ndị ahụ

Onye ntakụkọ anyị chọpụtara na otu n'ime ndị uweojii ahụ e gburu na Elimgbu bụ onye Ogoja dị na Cross River.

Onye uweojii a bi na Rumuchika nke dị na Elioparanwo na Port Harcout, ebe mkpu akwa na-ada n'ihi ọnwụ ya.

Onyeisi ndị ntorobịa na mpaghara Elimgbu, bụ Morgan Uche gwara BBC na ụmụ okorobia bi na mpaghara ahụ ekpebiela na ha ga-etinyere ndị uweojii aka n'ichekwa ogbe ha.

Uche kwuru na onwebuola oge ha chụrụ ndị ekperima bịara ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii ebe ahụ ọsọ, mana nke a mere ha na mberede n'ihi na o mere n'oge abalị.

Cheta na Gọvanọ Rivers Steeti bụ Nyesom Wike tinyere mmachi mkpagharị na steeti ahụ niile malite n'elekere iri nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ iji belata ọnọdụ enweghị nchekwa.

Ndị ekperima wakpokwara ndị uweojii n'Akwaibom

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii n'Enugwu ji ike na ebube achụ ndị otu ọjọọ ọsọ n'Enugwu

Na nke dịka ibe ya, ndị ekperima wakpokwara ogige ndị uweojii n'Akwa Ibo steeti ma gbuo ụfọdụ n'ime ha.

Ya bụ ihe mere n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde a na ụlọọrụ a kpọrọ 'Ini Divisional Police Headquarters', nke dị n'okpuru ọchịchị Ini na steeti ahụ.

Otu onye nọ na gọọmentị steeti Akwa Ibom gwara ndị ntaakụkọ Premium Times na ndị ekperima ahụ gbara akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ .

Onye ahụ na-achọghị ka akpọọ aha ya kwuru na ndị ekperima ahụ wakporo ndị uweojii ahụ ebe ha na-arahụ ụra ma gbagbuchaa ha.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Akwa Ibom bụ Odiko MacDon gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ mwakpo mere eme n'eziokwu mana o kweghị ekwu ndị uweojii ole nwụrụ na ya.

MacDon kwuru na mmadụ isii nwụrụ na mwakpo ahụ mana ọ bụghị ha niile bụ ndị uweojii.

O kwuru na nwunye otu n'ime ndị uweojii ahụ so na ndị e gburu.