Explosion in Abia State: Etu ọkụ mmanụ agbịdị si gbagbuo di na nwunye na nwa ha

Ebe foto si, Abia State Emergency Agency
Ọnụ ọgụgụ ndị lara mmụọ n'ihe mberede ọkụ ọgbụgba dapụtara n'Obodo Uzuaku na Owaza na ngwụcha izuụka gara aga bụ mmadụ iri ise na abụọ (52).
Ọ bụ ngalaba gbatagbata nke Abia Steeti kwuru nke a dịka ha gachara mee nnyocha miri emi na mpaghara ahụ n'ụbọchị Tuzde, abalị iri nke ọnwa Mee afọ 2022.
Obodo Uzuaku na Owaza dị n'okpuru ọchịchị Ukwa West n'Abia Steeti.
Onyeisi ngalaba a kpọrọ 'Abia State Emergency Management Agency' bụ Sunday Jackson binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ.
Dịka akwụkwọ ozi ahụ si depụta, "mmadụ iri anọ (40) nwurụ n'ọkụ nke gbara n'obodo Uzuaku."

Ebe foto si, Abia State Emergency Agency
"Ihe kpatara ọkụ ahụ bụ ndị na-esimmanụ agbịdị adigboroja."
"Ya bụ ihe mberede mere n'ụbọchị Fraịde, abalị isii nke ọnwa Mee afọ 2022."
"Mmadụ iri atọ (30) merụrụ ahụ na ya bụ ọkụ bụ ndị e bugara n'ụlọọgwụ dị icheiche n'obodo ahụ maka ịnata ọgwụgwọ."
"Ọkụ ahụ mebikwara osisi na ihe ubi niile a kọrọ n'okirikiri ahụ."

Ebe foto si, Abia State Emergency Agency
N'obodo Owaza, ọkụ gbara ebe ahụ n'ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ ụbọchị Satọde, abalị asaa nke ọnwa Mee afọ 2022.
"Mmadụ iri na abụọ nwụrụ ebe mmadụ asatọ ka e bugara ụlọọgwụ," Sunday Jackson depụtara.
"Ọkụ nke a metụtakwara ụlọ ndị mmadụ dị n'okirikiri ebe ahụ, nakwa osisi dị icheiche.
Nke a wetara ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede abụọ ruo isi ise na abụọ.
Ihe ndị obodo kọọrọ BBC gbasara ọdachi a

Ebe foto si, Abia State Emergency Agency
Ndị obodo ahụ gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ihe kpatara ọkụ ahụ bụ okporo igwe (pipeline) ebe mmanụ agbịdị na-esi agafe.
Dịka ha si kwuo, ndị ahụ ọkụ gbagburu gụnyere otu nwoke na nwunye ya na otu nwa nwoke ha.
Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kọọrọ anyị etu ya bụ ihe siri mee.
O kwuru sị: "Okporo a mmanụ agbịdị si agafe bụ ụlọọrụ Shell nwe ya, mana ọ gafeela izuụka olemole mmanụ na-esibeghị na ya gaa."
"N'oge mbụ ndị mmadụ na-esibu n'okporo a na-amịpụta mmanụ agbịdị ha na-esi."

Ebe foto si, Abia State Emergency Agency
"N'ime izuụka a ka mmanụ agbịdị malitekwara ịga n'okporo a ọzọ, mana anyị chọpụtara na e nwere ebe ya bụ mmanụ si ehi ehi."
"Ọtụtụ mmadụ gara si ebe ahụ tapuru atapu na-amị mmanụ, ọ bụ ebe ha na-amị mmanụ a ka ya bụ okporo gbara ka ogbunigwe, gbuo ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ."
"Ụfọdụ ndị ọzọ merụrụ ahụ nwụrụ n'ụlọọgwụ ebe e bugara ha maka ịnata ọgwụgwọ."
Otu n'ime ndị isi obodo ahụ kwuru na ha eliela ndị nke ọkụ gbagburu n'ebe ahụ, ebe ndị nke nwụrụ n'ụlọọgwụ ka ha dọnyere n'ụlọ ozu.
O kwukwara na ụfọdụ ndị merụrụ ahụ na-enweta onwe ha obere obere n'ụlọọgwụ.
"Ihe anyị gụtarala ugbua bụ mmadụ iri ndị nwụrụ anwụ," ka o kwuru.
Ọkụ mmanụ agbịdị emebuola mbụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ?

Imo na Abia Steeti bụ steeti abụọ dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nwere ebe a na-egwupụta mmanụ agbịdị.
N'izuụka abụọ gara aga nnukwu ọkụ gbara n'ogige ebe a na-esi mmanụ ụgbọala adịgboroja n'obodo Ohaji/Egbema n'Imo steeti.
Mmadụ otu narị na iri (110) lara n'iyi n'ọk u ahụ.
Onyeisiala Muhammadu Buhari zipuru ozi iti aka n'obi oge ihe a mere, ma katọọ ndị a na-etinye aka na mmepụta mmanụ agbịdị n'ụzọ adịgboroja.













