Anambra Fire Incident: Etu ọkụ si gbagbuo nwoke kpuru isi n'obodo Umunya

Ụlọ gbara ọkụ

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Ụlọ ebe ọkụ nọrọ gbagbuo Julius Anyadiegwu

Dịka a na-akwado emume ekeresimesi, ihe mberede ọkụ ọgbụgba etinyela ezinụlọ Julius Anyadiegwu n'ihe nnukwu iru uju na anya mmiri.

Ọkụ a gbagburu nna ha bụ Julius Anyadiegwu, onye dị afọ iri isii na itoolu, ma bụrụkwa onye kpuru isi.

Ezinụlọ Anyadiegwu bụ ndị obodo ukunu, Umunya, nke dị n'okpuru ọchịchị Oyi n'Anambra steeti.

Etu ọkụ ahụ siri gbaa

Ụlọ gbara ọkụ

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Ụlọ ebe ọkụ nọrọ gbagbuo Julius Anyadiegwu

Nwunye Julius Anyadiegwu aha ya bụ Blessing, nọkwa n'ime ụlọ ahụ oge ya bụ ọkụ malitere.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ n'ime abalị ka anwụrụ ọkụ ekweghị ya kute ume nke ọma.

Blessing kwuru sị: "Ọ bụ nwa m nwoke, Akachukwu, gbabatara zọpụta m."

"Oge ọ gara ịzọpụta nna ya, ọkụ ahụ akarịala. Ọkụ gbakwara ya ma merụọ ya nnukwu ahụ."

N'ihi oke ọkụ ọgbụgba ahụ, nwa ya enwenwughị ike ịzọpụta nna ya kpuru isi, nke mere ka ya bụ ọkụ gbarie ya.

Ugbua, e burula nwa ya ahụ gawa ụlọọgwụ dị n'Umudioka n'ihi ọkụ nke gbara ya n'ahụ.

Ndị uweojii amalitela inyocha ihe a merenụ iji chọpụta kpọmkwem ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ.

Ụfọdụ ndị obodo Umunya gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụghị ọkụ latrik kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ, n'ihi na o teela aka ndị obodo ha ahụbeghị ọkụ latrik.