Lagos fire: Ọkụ ọgbụgba ataala isi mmadụ abụọ na Legọs

Aha onyonyo, Lagos fire: Ọkụ ọgbụgbọ ataala isi mmadụ abụọ na Legọs

Ndị isi ọrụ sị na ọ bụ ndị ohi mmanụ kpara ya bụ okporo mmanụ ụgbọala dị na Ijegun - Ikotu Legọs aka, mere o jiri bara ọkụ.

Amabeghi ihe ya bụ ọkụ mebiri mana otu onye o metụtara sị na ngwaahịa ya ruru nde naịra atọ na ụma (N3.5M) atọ gbara pịa pịa.

Ụgbụọala dị iri atọ na otu nakwa ụlọahịa dị iri na ise lara na ya bụ ọkụ mana a mabeghi ulọ ndị mmadụ ole o metụtara.

BBC sochiri ndị ya bụ ọkụ gbara n'azụ gaa n'ụlọọgwụ bụ ebe ụfọdụ sị na ya bụ ụlọọgwụ jụrụ ha mgbe ha bịara maka na akwa adịghị, mana ha mechara kpochie ha azụ nye ha ọnọdụ na ụsọ.