Egbema illegal Refinery Explosion: E liela ozu mmadụ 110 ọkụ gbagburu n'Egbema

Ili ebe e liri ozu ndị nwụrụ

E liela ozu mmadụ otu narị na iri (110) ọkụ gbagburu n'ebe a na-esi mmanụ agbịdị n'ụzọ iwu akwadoghi n'Egbema, Imo Steeti, n'ụbọchị Fraịde ruo Satọde, 23 nke ọnwa Epreelụ 2022.

Dịka e lichara ha, gọọmentị ejirila kemịkal gbaa ebe ahụ (fumigation) iji gbochie ọrịa nwereike isi n'ihe mberede a pụta.

Ndị obodo ahụ kwara arịrị wee na-asị na o ruola ihe dị ka otu afọ ihe a (isi mmanụ n'ụzọ iwu akwadoghi) mewere, na ọ bụrụ na ndị ụlọọrụ mmanụ agbịdị na-abịa amị mmanụ n'obodo ha nyere ndị ntorobia ha ọrụ, na ụdịrị ihe mberede a agaraghị eme.

Ụkọchukwu
Nkọwa foto, Ụkọchukwu bịara kpeere ha ekpere ikpeazụ

Ndị bịara akwamozu a

Ndị haziri olili ahụ gụnyere ndị ọrụ gbatagbata National Emergency Management Agency (NEMA), onyeisioche okpuruọchịchị Ohaji-Egbema bụ Maxwell Amadioha, ndị ọrụ Red Cross na ndị ọzọ.

Ndị ọzọ nọ ebe ahụ bụ Jones Onyeriri bụbu onye omeiwu n'ụlọomeiwu nta, ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị ntoroọbịa obodo Abaezi, Egbema.

Ndi ndu obodo Abaezi nọ ebe a bịara ili ndị a

Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ sị na e cheburu ma a ga-eji igwe katapila gwuo ala ebe a ga-eli ozu ndị a, mana ọ bụzị ndị mmadụ ji aka ha gwuo ala e ji eli ndị ahụ.

Ndị gwuru ili e ji lie ndị ọkụ gbagburu
Nkọwa foto, Ndị gwuru ili e ji lie ndị ọkụ gbagburu
Ndị uweojii nọ ebe a na-eli ozu ndị a

Kedụ etu ihe a siri mee?

Ebe ọkụ gbara n'Egbema

Akụkọ sị na ọkụ gbagburu ndị a ebe ha gara iku mmanụ agbidi n'ogige ebe a na-esi mmanụ agbidi adigboroja dị n'ime ọhịa obodo Abaezi nke Egbema.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọkụ ahụ nke a mabeghị ihe butere ya n'ime ọhịa gbara ebe ndị mmadụ n'eku mmanụ agbidi n'ohi nke Bekee kpọrọ 'oil bunkering'.

Ogige ebe ọkụ gbagburu ndị mmadụ n'Egbema

Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ n'ụtụtụ Satọde kwuru na ọ gụtara ozu mmadụ iri ise rere pịapịa nke na onye amaghị ha agaghị amali n'ebe ahụ oge o rutere.

Onyeisi ụlọọrụ National Emergency Management Agency (NEMA) n'Imo Steetị bụ Ifeanyi Nnaji sị ọ bụ mmadụ otu narị na iri nwụrụ n'ihe mberede ahụ.

Gọọmentị Imo Steetị katọrọ ihe a mere ma sị ka a nwụchie nwoke a sị nwee ebe ahụ a kpọrọ Okenze Onyenwoke.