Egbema Explosion: A na-akwado ilikọta ozu ndị ahụ ọkụ gbagburu n'Egbema ọnụ

A na-akwado ilikọta ozu ndị ahụ ọkụ gbagburu n'Abaezi dị n'Egbema ọnụ dịka ndị ọrụ gbata gbata si kwuo.
Ifeanyi Nnaji bụ onye nchịkọta ndị ọrụ gbatagbata bụ NEMA n'Imo Steetị gwara BBC Igbo nke a.
Ọ sị na onyeisi ndị ntoroọbịa n'Abaezi na-agba mbọ ịchọta ụgbọala katapila ga-egwu ili ndị ahụ.
Nnaji sị ngwa ngwa nke a mere, na kọmishọna ahụike nakwa ndị ọrụ gbatagbata ga-aga ebe ahụ iji hụ ka e si lie ndị a.
N'aka nke ọzọ ndị nchekwa amalitela ipiogharị n'ime ọhịa iji nyochapụta ọdọ ebe a na-esi mmanụ agbidi adịgboroja dị n'Imo Steetị
Nke a na-abịa dịka ọkụ gbara ọdọ mmanụ adịgboroja dị n'ọhịa Abaezi nke Ohaji-Egbema dị n'Imo Steetị n'abalị Fraịde ma gbuo ihe karịrị mmadụ otu narị.
Kọmishọna mgbasaozi bụ Declan Emelumba wepụtara ozi sị na Gọvano Hope Uzodimma enyela iwu ka e kpochasịa ozu ndị ahụ ọkụ gbara.
Emelumba sị na gọọmentị na-akwado ilikọta ozu mmadụ ahụ karịrị otu narị ọnụ bụ ndị nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba ahụ.
Onyeisiala Buhari etiela mkpu akwa maka ndị ọkụ gbagburu n'Egbema

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari etiela mkpu akwa ma taa ikikere eze maka ndị ọkụ gbagburu n'ebe a na-esi mmanụ agbidi adịgboroja n'Egbema nke Imo Steetị.
N'ozi onye enyemaka ya bụ Garba Shehu wepụtara, Buhari tiri ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ, ndị obodo Ohaji Egbema nakwa gọọmentị Imo Steeti aka n'obi.
Buhari gara n'ihu nye iwu sị ka ndị ọrụ nchekwa chọpụta ma mechie ebe niile a na-esi mmadụ adịgboroja na Naịjirịa.
Ọ gwakwara ndị Eze, ndị ndu ọdịnala, ndị uweojii na ndị DSS ka ha ekwela ka ụdịrị mkpamkpa ahụ kpaa n'obodo ọbụla na Naịjirịa.
Gọọmentị Imo Steeti ga-eli mmadụ 110 nwụrụ n'ọkụ gbara n'obodo Egbema n'igwe

Ebe foto si, Nema/BBC
Onye na-ahụ maka ọrụ gbatagbata nke ụlọọrụ National Emergency Management Agency (Nema) n'Imo steeti bụ Ifeanyị Nnaji gwara BBC Igbo na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n'oke gbara n'ogige adịgboroja ano agbanwe mmanụ agbidi n'Egbema Imo Steti eruola otu narị na iri (110).
O kwuru na gọọmentị Imo Steeti na-eme njikere site na ngalaba Steeti na-ahụ maka ahụike na mbara ezi etu ha ga-esi lie mmadụ a niile nwụrụ n'igwe.
Ka ọ gara ebe ahụ na mgbede ụbọchị Satọde, o kwuru na ọnụọgụgụ ahụ nwere ike ịrịgo n'ụbọchị Sọnde n'ihi na a na-atụ egwu na mmiri dị nso ebe riri ọtụtụ ndị na-agba ọsọ ndụ ha.
O kwukwara na akụkọ na-ekwu na ụfọdụ ndị ọzọ e bugara ụlọọgwụ ịnata ọgwụgwọ alaala mmụọ.
Nnaji kwuru na ndị ọrụ Nema ka na-agba mbọ n'ọrụ nnyocha n'ime mmiri ahụ nakwa ebe ndị ọzọ nọ nso ebe ahụ gburugburu dịka a ka na-achọ ozu ndị mmadụ.

Gọọmentị Imo sị ka a nwụchieonye nwee ụlọọrụ a na-esi mmanụ ebe ọkụ gbara
Gọvernment Imo steeti enyela iwu ka a nwuchie onye nwe ụlọọrụ na-esi mmanụ agbidi na anataghị ikike gọọmentị n'Egbema ebe ọkụ ọgbụgba gbagburu ndị mmadụ n'abalị Fraide.
Ọkụ a malitere n'ebe Elekere Itoolu nke abalị nke a mabeghị ihe kpatara ya gbagburu ọtụtụ ndị mmadụ mana amabeghị ọnụọgụgụ ha ugbua.
Komishona mmanu agbidi n' Imo steeti bụ Goodluck Opiah, onye gara ebe ahụ n'ụtụtụ Satọde kwuru na Gọvanọ Hope Uzodimma enyela inwu ka ndị ọrụ nchekwa nwụchie nwa amadi nwe ụlọ ozi mmanụ agbịdị ahụ anọghị n'iwu a kpọrọ Okenze Onyenwoke.

Ọ tụrụ arịrị maka ọnwụ mberede metụtara ọtụtụ ụmụokorobia bụ ndị o kwuru na amabeghị ole ha dị ma tie ezinaụlọ ndị nwụrụ n'ọkụ ahụ aka n'obi.
Ọ sịrị "N'isi ụtụtụ taa ka anyị nwetara ozi n'ọkụ gbara ndị na-ezu mmanụ ebe a."
"Ihe a bụ ihe mwute ma bụụkwa ịgba akụnaụba mgba okpuru"
"Gọvanọ Hope Uzodimma enyela iwu ka a nwuchie onye nwe ụlọ a na-esiu mmanu na-enweghị ikike."
"Gọọmentị Imo na-eti ezinaụlọ ndị nwụrụ n'ọkụ a aka n'obi.
Ọ gara n'ihu kwuo na "Agaghị m ekwuli ugbua mmadụ ole nwụrụ mana ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya." "Isonye n'ụdị ihe ememilala ọtụtụ ndị ntorobia."
"Ọ ka mma iso ezi ụzọ n'ịchụ nta ego kama ị na-etinye aka n'ihe megidere iwu."
Etu ọkụ si gbagbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'Egbema

Ebe foto si, Fred Martins
Mkpu akwa kpọtụrụ n'obodo Abezi dị n'Egbema n'Imo steeti dịka ọkụ gbagburu ọtụtụ mmadụ amabeghị ọnụọgụgụ ha n'ebe a na-ezi mmanụ agbidi na-enweghị ikike nke gọọmentị'abalị Fraide.
Ọkụ ahụ gbara ọtụtụ ụgbọala ma merụkwara ọtụtụ ndị mmadụ ahụ, ụfọdụ ndị ebugarala ụlọọgwụ dị iche iche.

Ebe foto si, Fred Martins
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọkụ ahụ nke a mabeghị ihe butere ya n'ime ọhịa gbara ebe ndị mmadụ n'eku mmanụ agbidi n'ohi nke Bekee kpọrọ 'oil bunkering'.
Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ n'ụtụtụ Satọde kwuru na ọ gụtara ozu mmadụ iri ise rere pịapịa nke na onye amaghị ha agaghị amali n'ebe ahụ oge o rutere.
Ebee bụ Egbema ihe a na-akpọtụ?
Egbema-West, dị n'Imo steeti dị nso na Pọtakọt Rivas bụ bụ ebe e nwere ụmị mmanụ agbịdị nke NNPC na Shell gbakọrọ aka nwee.
Nke a bụghị mbụ ọkụ ọgbụgba na-eme na mpaghara a n'ihe ihe metụtara iku mmanụ n'ụzọ ezighị ezi.
N'ọnwa Febụwarị afọ 2020, ọkụ gbara na mpaghara ahụ n'ebe a na-akpọ Etekwuru, dịka okporoigwe mmanụ agbịdị gbara n'ihi ihe ndị na-ezu mmanụ na-eme n'ebe ahụ.
N'afọ 2021, ọkụ nke okporo igwe mmanụ gbara butere mmebi ọtụtụ ihe gụnyere ugbo ndị mmadụ, osisi ndị na-enye ego na anụ bi na mmiri na ihe ndị ọzọ n'Obiakpu dịkwa n'Okpuru Ọchịchị Ohaji/Egbema.
Akụkọ na-abịa














