Fidelis Anosike: Onye ka di Rita Dominic a bụ?

Rita Dominic na Fidelis Anosike

Ebe foto si, Rita Dominic Instagram

Fidelis Anosike na Rita Dominic gbara akwụkwọ n'Imo steeti n'ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelụ 2022, mere ka ndị mmadụ na-achọsi ike ịma onye ọ bụ.

Agbamakwụkwọ ha na-ewu ewu n'ihi na Dominic bụ ome ejije Nollywood a ma ama, ma bụrụkwa onye ndị mmadụ hụrụ n'anya nke ukwuu.

Fidelis Anosike na Rita Dominic

Ịhụnanya a mere ka ndị mmadụ na-agba tọọchị na-achọ ịma onye ọ bụzị nwunye ya si taa gawa n'ihu.

Ihe mere Rita Dominic ji wuwe nso nso a?

N'ọnwa Disemba ka Rita Dominic wepụtara foto onye na-akwado ịlụ ya.

Nke ahụ mere ka ndị mmadụ chọpụta na ọ bụ Fidelis Anosike ma mekwa ọtụtu nọrọ n'elu soshal midia na-eto ya.

Taa bụ Epreelụ 19 ka ya na Fidelis Anosike bụ onye Umueri dị n'Anambra steeti jịkọrọ aka dịka di na nwunye n'ụzọ omenala.

Ọtụtụ ndị na-eme ejije na Nollywood malitere tinyewe foto gosiri na ha awụchiela Imo steeti bụ obodo Rita Dominic ebe a ga-anọ gbaa nkwụ ya.

N'ọnwa Novemba nke afọ 2021 ka ndị mmadụ gụnyere ndị na-eme ejije dugara Dominic akwamozu nne di ya bụ Joy Anosike n'Umueri dị n'okpuruọchịọchị Anambra East.

E mechakwara ndị mmadụ malite kwuwe n'elu soshal midia na ọ dịka Dominic adịla ime maka etu afọ ya si tokopụta n'uwe o yi bia akwamozu nne di ya.

Rita Dominic

Ebe foto si, Instagram

Onye ka Fidelis Anosike bụ?

Fidelis Anosike

Ebe foto si, Fidelis Anosike

  • Anosike bụ onye Umueri dị n'okpuruọchịchị Anambra East
  • Ọ bụ onye hibere otu a kpọrọ Folio Media Group, nke nwezị ụlọntaakụkọ Daily Times Nigeria nke ọ zụtara n'afọ 2005
  • Anosike bụkwa onye ọrụ mgbasaozi site na ibipụta ozi n'akwụkwọ nakwa na ịntanetị
  • Ọ bụ ya (ụlọọrụ ya) na-eme asọmpi Nwaanyị kacha mma na Naịjiria nke ndị mmadụ ma dịka 'Miss Nigeria'.
  • Ọ gara mahadum na University of Benin, ebe ọ nọ nata ọzụzụ na ngalaba 'Creativea and Applied Fine Arts'
  • O mekwara OPM Program na mahadum Harvard Business School
  • Rita Dominic gbara ya n'anwụ dịka onye ọ na-ayị n'ọnwa Disemba afọ 2020
  • Akụkọ na-ekwu na ọ lụbuola nwunye ugboro abụọ n'oge gara ama mana alụmdinanwunye ya na ndị a kụsara nke amaghị ihe kpatara nkụsa a
Onyeisi ụlọọrụ Folio Media Group, nke nwezị ụlọntaakụkọ Daily Times Nigeria

Ebe foto si, Screenshot

Aha onyonyo, Nollywood: 'Ihe nkiri Igbo ga-abụ egwu eji site na ntuziaka m na-eweta' - Ikeagwu
Rita Dominic - Onye ọkaibe n'ọrụ ime ejije na Nollywood

Ebe foto si, Rita Dominic/Instagram

Nkọwa foto, Rita Dominic - Onye ọkaibe n'ọrụ ime ejije na Nollywood

Onye bụ Rita Dominic?

  • Rita Dominic bụ okaibe n'ọrụ ime ejije na ngalaba Nollywood
  • Ọ na-arụ ọrụ dịka onye na-emepụta, onye na-ahazị, nakwa onye na-eme ejije
  • O so na ndị turu ntụala ọrụ ejije nke ọghara ọhụrụ na Naịjirịa
  • Dominic dị afọ 46 dịka a mụrụ ya n'ụbọchị 12 nke ọnwa Jụlaị 1975
  • Ọ bụ onye Aboh Mbaise nke Imo steeti
  • Ọ natara asambodo onye natazurula ọzụzụ dịka onye ejijie na ngalaba Theatre Arts na mahadum nke Port Harcourt n'afọ 1991
  • Ọ mere ihe ejije nke mbụ ya na Nollywood n'afọ 1998 nke a kpọrọ 'A time to Kill'
  • Dominic a natala ọtụtụ nturuugo nakwa ihe nrite n'ọrụ ime ejije
  • Ọ pụtala n'ihe ejije karịrị 100 dịka ọ nọzị n'ọrụ imepụta ejije ugbua
Aha onyonyo, Anita Joseph: 'Umụnwaanyị Nollywood ka enwete ego maka 'nnụkwụ mpa' nọ ha n'akukụ'