Precious Okeke: Ihe ndị uweojii kwuru maka Precious Okeke, nwagbọghọ a hụrụ ozu ya n'ụlọ enyi ya nwoke

Precious Okeke na enyi ya nwoke

Ebe foto si, Precious Okeke-Facebook

Ndị uweojii Legos, ekwuola na ha ka na-enyocha okwu banyere nwokorobia a na-enyo na o gburu enyi ya nwaanyị na mpaghara Ajah dị na steeti ahụ.

A nwuchiri Ifeanyị Okafor maka ọnwụ Precious Okeke gbara afọ 24 bụ onye a hụrụ ozu ya n'ụlọ ya na Legọs na nsonso a.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na Njoku gburu enyi ya nwaanyị bụ Precious,Okeke, dobe ozu ya n'ụsekwu ya ebe ọ na-edina ozu ya dịka dibia gwara ya tupu isi ozu ahụ agbaa ya ama nke mere ka ndị uweojii bịa nwuchie ya.

E kwuru na ọ bụ isi ozu ndị agbata obi nụrụ mere ka ha bekuuo ndị uweojii bụ ndị bịara nyocha ọnụụlọ ndị mmadụ bi na ngwuru ahụ were hụ ozu nwadaa ahụ n'usekwu enyi ya nwoke, onye ha gara n'ihu nwuchie.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC n'ezie na a hụrụ ozu Precious n'ụlọ enyi ya nwoke mana o nweghị ihe gosiri na nwoke ahụ na-edina ozu nwada ahụ dika akụkọ na-efegharị si kwuo.

Ọ kọwara na ọ bụ ndị agbataobi wetara ozi na ha nụrụ ajọ isi na ngwuru ha bi na ya.

Oge ndị uweojii gara nyocha ebe ahụ, ha hụrụ ozu nwa ada Peace Okeke nke mere ka ha nwuchie enyi ya nwoke dịka nnyocha ya bụ okwu na-aga n'ihu.

Ọ sịrị, "Ndị agbataobi kpọrọ ndị uweojii kwuo na ihe na-esi n'otu ụlọ."

"Oge ndị uweojii ruru ebe ahụ, ha hụrụ ozu maliterela ire."

"Anyị nwụchiri onye nwe ọnụụlọ ahụ bụ Ifeanyị Njoku, onye kwuru n'ezie na ọ bụ enyi ya nwaanyị."

"Mana ọ sịrị na ya egbughị ya, kama na ọ dara ada kụọ isi n'aja, nwụọ."

Hundeyin gara n'ihu kwuo na akụkọ ahụ nwere rịkọm: "mana nsogbu dị na ya bụ na mmadụ nwụrụ na be gị, nọọ abalị ise, o nweghị onye ị gwara?"

O kwuru na ya enweghị ike ikwu ebe nnyocha ahụ kwụ ugbua ganye na ya ajụọ ngalaba uweojii ọ dị n'aka ese ọzọ.

Ihe ndị ma Precious okeke kwuru

Precious Okeke

Ebe foto si, Precious Okeke-Facebook

Ọtụtụ ndị ya na ya gụkọrọ akwụkwọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ banyere nwada Precious Okeke ekweghị atụnye ọnụ n'okwu.

Ma lee ihe ụfọdụ ihe BBC Igbo chọpụtara maka ya:

  • Ọ bụ onye Arochukwu dị n'Abia steeti
  • Precious Okeke pụtara na mahadum 'Abia State University' ,Uturu na nsonso a
  • Ọtụtụ ndị ma ya n'ụlọ akwụkwọ ahụ kọwara ya dịka onye na-emesapụ ahụ.