Chinelo Megafu Burial: Agbagharala m ndị niile chịrị nwa m ọchị na Twitter - Ifeanyi Megafu

Ebe foto si, Screengrab
Ifeanyi Megafu bụ nna Chinelo Megafu ekwuola na ya agbagharala ndị niile chịrị nwa ya ọchị ma kwaa ya emu oge o tiri mkpu enyemaka na Twitter tupu ọ nwụọ.
O kwuru nke a n'emume akwamozu Chinelo Megafu, nke e mere n'ụlọụka Shepherd Hill Baptist Church dị n'Obanikoro, Legọs, taa bụ Tọzde, Eprel 21.
Chinelo Megafu bụ dọkịta ahụ tụfuru ndụ ya oge ndị ekperima wakporo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna n'ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị afọ 2022.
Mmadụ asatọ nwụrụ na mwakpo a ebe ndị ekperima ahụ tọọrọ ọtụtụ ndị ọzọ.
N'okwu ya n'emume akwamozu ahụ, Ifeanyi Megafu kwuru na ọ kpọrọ nwa ya nwaanyị bụ Chinel n'ụbọchị 28 nke Maachị mana ọ zaghị ekwe ntị ya.
"N'echi ya ka m nụrụ akụkọ ihe a merenụ, na nwa m nwụrụ na mwakpo ndị ekperima n'ụgbọoloko na-aga Kaduna," Ifeanyi Megafu kwuru.
"Amachaghị m maka soshal midiz, ya mere anụghị maka ihe merenụ nke ọma, mana ọ bụ ka abalị olemole gachara ka m nụrụ akụkọ etu ndị mmadụ si kpaso ya akwa oge o tiri mkpu enyemaka na Twitter."
"Ọ dị nnukwu mwute na ọtụtụ ndị mmadụ nwere ụdị obi ọjọọ dị otu a."
"Mana agbagharala m ndị niile kwara Chinelo emu na soshal midia."
"Agbagharala obodo (Naịjirịa) gbachiri nkịtị ka ụdị ihe dị otu a mee."
"Ọ bụ eziokwu na ndị ekperima ahụ gbapụrụ ọnụ egbe wee zunahụ anyị nwa anyị."
"Mana Chinelo n'onwe ya gbapụkwara ọnụ egbe nke ya site n'ozi ikpeazụ o zipụrụ tupu ọ nwụọ."
Mụ na Chinelo kwekọrịtara na anyị ga-agụkọ egwu n'ụbọchị agbamakwụkwọ ya

Ebe foto si, Screengrab
Ifeanyi Megafu kwuru na ya na ada ya nwaanyị bụ Chinelo kwekọrịtara na ha ga-etikọ egwu ọnụ n'ụbọchị agbamakwụkwọ ya.
"Mụ na Chinelo ma etu esi afụ opi ike 'saxophone'," Megafu kwuru.
"N'oge emere akwamozu nne m, bụ mama nnukwu Chinelo, mụ na ya ji 'saxophone' gụọ egwu."
"Anyị kwekọrịtara na anyị ga-emekwa ya ọzọ n'ụbọchị agbamakwụkwọ ya."
"Mana nke a agahị enwezi isi ugbua."
"Ọ bụ ya mere m ji malite okwu m site n'ịfụ 'saxophone' iji mezuo nkwa m kwere nwa m."

Ebe foto si, Screengrab
Ifeanyi Megafu kwuru na ọtụtụ ndị ntaakụkọ akpọọla ya ka ha na ya nwee mkparịtaụka, mana o kweghị.
"Okwu a m na-ekwu n'elu 'altar' ebe a bụ mkparịtaụka m ga-enye ndị ntaakụkọ ọbụla. Onweghị ihe ọzọ m ga-agwa ndị ntaakụkọ," o kwuru.
Ọ gakwara n'hu kọwaa etu otu onye ọrụ gọọmentị si kpọọ ya iji tie ya na ezinụlọ ya aka n'obi.
"Mana ọtụtụ ihe niile o kwuru bụ ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, etinyeghị m uche n'okwu ya maka na abụghị m onye ndọrọndọrọ ọchịchị, nwa m Chinelo abụkwaghị."
Ihe dị mkpa gbasara ndụ Chinelo Nwando Megafu

Ebe foto si, Screengrab
- A mụrụ Chinelo Megafu n'abalị iri abụọ na isiinke ọnwa Ọkụtoba afọ 1992.
- Nne na nna ya bụ ndị Onitsha, Anambra Steeti.
- Ọ bụ Chinelo bụ nwa mbụ nne na nna ya mụrụ.
- Ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị na 'St Saviours Primary School', Legos.
- Akwụkwọ Sekọndịrị ya bụ n'ụlọakwụkwọ 'Queens College' Legọs.
- Ọ gụrụ Mahadum na mahadum Port Harcourt, ebe o nwetara ọzụzụ dịka dọkịta.
- Chinelo rụrụ ọrụ otu afọ n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti a kpọrọ 'National Hospital' n'Abuja malite na 2018 ruo 2019.
- N'oge o ji otu afọ fee ala Naịjirịa, Dọkịta Chinelo rụrụ ọrụ na ngalaba ahụike nke Kaduna steeti.
- O mechara nweta ọrụ n'ụlọọgwụ 'St Gerald's Catholic Hospital' na Kaduna.








