Kaduna Train attack: Ndị 'Bandits' nwere komishona ha na-akpọ aha mgbe ha wakporo anyị

Aha onyonyo, Ndị 'Bandits' nwere komishona ha na-akpọ aha mgbe ha wakporo anyị – Onye nọ ụgbọoloko ahụ

Otu nwoke nọ n’ime ụgbọoloko ndị ekperima wakporo na Kaduna n’ụbọchị Mọnde gara aga akọwala etu ya na ije si jee.

Nwa amadi aha ya bụ Umeasiagbu Ifeanyi kwuru na ọ tụghị anya na ihe dị etu a ga-eme maka na ọ nọ n’ụra mgbe ndị ekperima ahụ tụrụ ogbunigwe ma malite ịkwa mgbọ n’ime ụgbọoloko ahụ.

O kwuru na ndị ekperima ahụ kwara mgbọ ihe karịrị otu awa.

"N'uche m, ndị ahụ nwere onye na-agbara ha ama banyere ihe na-eme n'ime ụgbọoloko ahụ," Umeasiegbu kwuru.

"Enwere otu onye ha na-akpọ aha ya n'ime ụgbọoloko ahụ, onye ahụ bụ kọmịshọna."

Nwamadị a gwara BBC Igbo etu ndị agha Naịjirịa siri mecha bịa gbapụta ha n’ime ihe ọdachị a.

Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo a bụ mmadụ asatọ ebe a sị na mmadụ 41 merụrụ ahụ.

Ọnọdụ ime ụgbọoloko ahụ ndị ekperima wakporo

Ebe foto si, NRC

Nkọwa foto, Ọnọdụ ime ụgbọoloko ahụ ndị ekperima wakporo

Kedụ ka ihe a si me kpọm kwem?

Akụkọ kwuru n’ụbọchị Mọnde na ndi omekome wakporo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna ma tọrọ ọtụtụ mmadụ na-eme njem ebe ahụ.

Anya hụrụnụ na-ekwu na ya bụ ụgbọoloko si n'okporo ya fepụ oge ogbunigwe ndị ekperima ahụ debere n'ụzọ ya gbara.

Akụkọ kwuru na ndị nọ n'ime ụgbọoloko ahụ karịrị narị itoolu, mana akwụkwọ gọọmentị zipụtara kwuru na ọ bụ mmadụ 398 debanyere aha ha iso mee ya bụ njem.

Ihe a mere n'elekere asatọ nke mgbede Mọnde bụ March 28, 2022.

Ihe gọọmentị Naịjirịa mere maka mwakpo a?

Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo na aka na-achị Kaduna Steeti bụ Nasir El-Rufai gara njem nleta n'ụlọọgwụ ebe e bugara ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ.

Minista na-ahụ maka njem na Naịjịrịa bụ Rotimi Amaechi kwuru n’ụbọchị Tuzde na obi gbawara ya maka ihe a merenụ.

Amaechi kwukwara na ya arịọbuola gọọmentị ka etinye tekunzu iji wulite nchekwa n'okporo ụgbọoloko ahụ, mana mkpesa ya amịtaghị mkpuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị na ndị agha enweela nzuko iji hụ na ụgbọelu ndị agha ga na-eso ụgbọoloko na-eme njem iji nye ya nchekwa.

Ndị uweojii Naịjirịa kwukwara n’ụbọchị Satọdee na ha ga-eziga ndị otu ha n’okpuruụzọ Abuja-Kaduna maka ọrụ nchekwa pụrụiche.

Nke a bụ maka na ndị ekperima ‘bandits’ na-akpakarị ike ọjọọ n'okporoụzọ ahụ, na-ezu ohi ma na-atọrọkwa ndịmmadụ.