Kaduna Airport Attack: Akụkọ ụgha ndị mmadụ biputere maka ya

Ebe foto si, Getty Images
A chọpụtala na ihe onyonyo ndị mmadụ na-efesa na soshal midia na ọ bụ mwakpo ndị ojiegbe mere n'ọdọụgbọelu Kaduna na Satọde, 26 nke Maachị 2022, bụ onyonyo e sere n'afọ 2018.
Nchọpụta gosiri na ya bụ onyonyo bụ nke e sere oge ndị nkwado otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị gbapụtara ịnabata ya n'okporoụzọ ọdọụgbọelu nke Sultan Abubakar III dị na Sokoto steeti, n'afọ 2018.
Ndị na-ekesa ya bụ ihe onyonyo na Facebook na Whatsapp na-ekwu na ụmụnwoke ndị ahụ e si n'ime ụgbọelu na-anyapụ n'ala sete n'onyonyo, bụ ndị omekome ahụ na-anwa ime ka ụgbọelu ahụ ghara ifepụ.
Ụfọdụ ndị nwere agba kesara ihe onyonyo a
Ụfọdụ ndị nwere agba gụnyere ụfọdụ ndị mgbasa ozi so kesaa ihe onyonyo ụgha a na soshal midia.
Ụlọntaakụkọ Daily Nigerian, nke onye ntaakụkọ na-eme nchọcha na nnyocha bụ Jafaar Jafaar nwe, so na ndị kesara ya bụ ihe onyonyo. Ha arịọla mgbaghara ma wepụ ya.
Onye ọzọ bụ Samuel Aruwan, Kọmishọna na-ahụ maka Nchekwa na Ihe na-eme n'ime ụlọ na Kaduna steeti, ekwukwaala na ihe onyonyo ahụ abụghị nke e che na ọ bụ.
Ngalaba na-ahụ maka nnyocha na mgbagha akụkọ ụgha na BBC chọpụtara na mgbe mbụ ihe onyonyo ahụ gbara na soshal midia bụ n'afọ 2018, mgbe e kere ya na Twitter.
Ndị mmadụ tiri mkpu ihe onyonyo a n'afọ 2018 mgbe o fesara, ha katọrọ omume ndị nkwado onye ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ, nke e mechara chọpụta na ọ bụ Aliyu Wammako bụbụ gọvanọ Sokoto steeti.
Ndị nkwado ya mafere mgbidi ọdọụgbọelu ahụ ma bịa ịnabata ya dịka ụgbọelu ya feturu ma na-anyaru ebe ọ ga-akwụsị.
Etu ndị 'Bandit' siri gbuo otu onye n'ọdọụgbọelu Kaduna
Ndị omekome bụ 'Bandits' n'okwu Bekee wakporo ma gbuo otu onye ọrụ nchekwa na-arụ n'ọdọụgbọelu dị na Kaduna Steeti.
Ọ bụ kọmishọna Samuel Aruwan na-ahụ maka nchekwa obodo nke Kaduna steeti depụtara nke a n'akwụkwọ ozi n'ụbọchị 26 nke ọnwa Maachị afọ 2022.
Aruwan kwuru na ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ ekweghị ndị omekome a mezuo uche obi ha.
O kwuru sị,"Mana ha gbagburu otu onye nchekwa onye hụrụ ha were tiwe mkpu".
Ọ kọwara na ụgbọelu bidoro fepụwa dịka e siri hiwe na mbụ.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai kelere ndị ọrụ nchekwa lusoro ndị a ọgụ ma gosipụta obi mwute ya maka otu onye nwụrụ dịka o zigara ezinụlọ ya ozi iti aka n'obi.
Cheta na ndị omekome a wakporo ụlọakwụkwọ ndị agha bụ Nigerian Defence Academy nke dị na Kaduna steeti ma tọrọ otu onye agha ebe ha gburu mmadụ abụọ n'ọnwa Ọgọst afọ 2021.
Achọtala akụkụ ahụ ụgbọelu ndị agha elu Naijirịa a na-achọ achọ

Ebe foto si, Nigerian Army Facebook
Ndị agha Naijirịa ekwuola na ha achọtala akụkụ ahụ ụgbọelu akara NAF475 furu efu kamgbe ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Maachị.

Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook
Ọ bụ n'oke ọhịa sambisa nke dị na Borno steeti ka ha hụrụ akụkụ ahụ ụgbọelu a nke bu mmadụ abụọ mgbe o furu.

Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook

Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook
Dịka o siri dị, ha ka na-achọkwa ma na-arụ ọrụ ha n'ogige Sambisa.









