Kebbi state: Ndị omekome agbagbuola ihe ruru ndị nchekwa 19

Ndị ọrụ nchekwa

Ebe foto si, Getty Images

Ndị omekome amabeghi ndị ha bụ, ji ọgbatumtum wakpoo obodo Kanya, dị na Kebbi steeti oge osote gọvanọ steeti ahụ bụ Samaila Yombe Dabai gara njem nleta n'obodo ahụ n'ụbọchị Tuzde, abalị asatọ nke ọnwa Maachị 2022, ma gbuo ihe ruru ndị ọrụ nchekwa 19.

Dịka ụlọntaakụkọ AFP siri kwuo, ndị e gburu gụnyere ndịagha 13, ndị uweojii ise nakwa otu onye nche.

Dabai gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa a na ndị omekome a kwakọrịtara mgbọ butere ọnwụ ọtụtụ, mana o kweghi ekwu ọnụọgụgụ ndị nwụrụ.

Dabai kwukwara na o merụghị ahụ na ya bụ mwakpo.

Ha kwukwara na ndị omekome a zuru ngwanri nakwa ụmụanụmanụ.

Mwakpo a na-abịa ka ọ gachara naanị otu ụbọchị ndị ojiegbe gbagburu ihe karịrị ndị nche 60 n'otu mpaghara ahụ.

Ndị omekome na-ebu egbe a ma dịka "bandits" na-egbukarị ma na-atọkarịkwa mmadụ ma na-ezukwa ehi na mpaghara ugwu Naịjiria.

Ndị ọrụ nchekwa kwuru na ha na-achụrụ ndị omekome a banye n'ebe ha na-ezo n'ime ọhịa.

Ọnwụ egbuola Joseph Egbunike, osote onyeisi ndị uweojii

Joseph Egbunike

Ebe foto si, NPF

Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba ekwuola n'ezie na osote onyeisi ndị uweojii bụ Joseph Egbunike nke nọ n'isi nnyocha ndị ekperema a kpọrọ 'Criminal Investigation Department' alaala mmụọ.

Egbunike bụ onye nọ n'isi okwu nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa tupu ọ nwụọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi gbara ama na ọ lara mmụọ n'ụlọọgwụ National Hospital nke Abuja n'ụbọchị Tuzde dika ọ dara obere ahụ.

Cheta na Egbunike so na ndị nọ n'isi okwu nyocha a na-eme ogbo ya bụ Abba Karị make ebubo nrụrụaaka na ibu ọgwụ ike.