Etu mmadụ anọ si tufuo ndụ ha oge ndị ekperima wakporo Kajuru, Kaduna steeti
Samuel Aruwan bụ kọmishọna okwu nchekwa dị n'aka na Kaduna steeti kwupụtara nke a n'ụbọchị Sọnde
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chioma Obianinwa
Etu mmadụ anọ si tufuo ndụ ha oge ndị ekperima wakporo Kajuru, Kaduna steeti
Mmadụ anọ tufuru ndụ ha
oge ndị ekperima wakporo okpuru ọchịchị Kajuru dị na Kaduna steeti.
Kọmishọna okwu nchekwa
dị n’aka bụ Samuel Aruwan kwuru na ndị ekperima ahụ gburu mmadụ atọ, ebe ndị
obodo gbakọrọ aka tigbuo otu onye obodo ha a na-eche na ya ndị ekperima ahụ
na-arụkọ ọrụ.
Dịka Aruwan si kwuo, ndị obodo wakporo nwoke a e ji 'doctor' mara, o wee saa asịsa na ọ na-agbara ndị ekperima ama.
"Nwoke ahụ kpọkwara aha onye ọzọ aha ya bụ Fidelis Ali na-agbakwara ndị ekperima ama. Ndị uweojii anwụchiela Ali ugbua ma na-agba ya ajụjụ ọnụ," Aruwan kwuru.
Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Nigeria Airforce bụ Ibikunle Daramola ekwuputela na mmadụ asaa nọ n'ime ụgbọelu ndị agha kpọkasiri taa bụ ụbọchị Februwarị 21 n'Abuja enweghị onye pụtara na ndụ.
O kwukwara na ndị ọrụ gbata gbata eruola ebe ahụ.
Daramola depụtara nke a na twitter ya ma na-ekwukwa na onyeisi ndị agha ụgbọelu enyela iwu ka e nyocha ihe kpatara ya bụ ọdachị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2
Etu ụgbọelu ndị agha si kpọkasịa n'Abuja
Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Hadi Sirika edepụtala na ụgbọelu ndị agha Naịjiria akpọrọ aircraft King Air 350 akpọkasiala dịka o kwuputechara na ingin ya kụrụ ka ọ si Minna abata ọdọụgbọelu dị n'Abuja.
O kwuru na ọ kpọkasiri nke ọjọ ya.
Sirika depụtara n'akara twitter ya ka onye ọbụla ka nọrọ jụụ dịka a na-eche mpụtara nyocha ndị agha na-eme.
O kwuru na etu ọ dị ugbua amabeghị ma mmadụ a ka dị ndụ maọbụ nwụrụ anwụ na ya bụ ọdachị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 3
Nkechi Ugochukwu hụrụ mgbe ihe mberede a mere
Otu nwaagbọghọ aha ya bụ Nkechi Ugochukwu gwara BBC Igbo na ụlọ ya dị na mpaghara Bassa, nke dị nso n'ọdọụgbọelu Abuja.
O kwuru sị: "Ana m anọ n'ime ụlọ m anụ oge ọbụla ụgbọelu na-efeli maọbụ efetu."
"Mana mkpọtụ nke a m bụrụ taa abụghị ụdị mkpọtụ m na-anụbu."
"Oge m pụtara, ahụrụ m na ụgbọelu ahụ amalitela ịgba ọkụ, mana ụgbọala abụọ na-agbanyụ ọkụ bịara malite ịgbanyụ ọkụ ahụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 4
Agbagbuola mmadụ atọ n'ụlọahịa ebe a na-ere egbe
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ atọ anwụọla ebe mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ mgbe ana-agba egbe n’ụlọahịa ebe a na-ere egbe na
Louisiana.
Onye nlekọta ogbe ahụ kwuru na onye mbụ gbapụrụ egbe metụrụ mmadụ
abụọ nke mere ka ndị ọzọ nọ n’ime ụlọahịa egbe ahụ gbapụ egbe nke ha.
Mmadụ abụọ ahụ nakwa onye mbụ ahụ gbapụrụ egbe mechara nwụọ. A
kpọpụtabeghị ndị ha bụ n’ọha.
A malitela nyocha ọdachị a merenụ na 'Jefferson Gun Outlet' dị n’ogbe New Orleans, US.
Mmadụ 645 butere ọrịa covid 19 ụnyahụ na Naịjirịa
Ngalaba Ncdc kwuru na
ha hụrụ ọrịa covid 19 n’ahụ mmadụ narị isii, iri anọ na ise na Naịjirịa.
Imo
steeti chịtara iri abụọ na atọ ebe Abia
chitara iri abụọ na otu.
Mmadụ otu narị, iri abụọ na asatọ na ụma gbakerela ebe mmadụ otu puku , narị asatọ , iri atọ na otu nwụrụla site n'ọrịa a kamgbe ọ batara na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Gọọmenti etiti gbara anyị nkiti- nne na nna ụmụaka Kagara atọọrọ
Ezinụlọ ụmụakwụkwọ Government science College Kagara, Niger
state etiela mkpụ na onwebeghị ihe
gọọmenti etiti gwara ha ruo ugbua,kamgbe ndị omekome tọọrọ ụmụ ha.
Ha gwara ụlọrụ BBC na onwebeghị ihe ndị ntọ ahụ gwara ha nakwa
ihe niile gọọmenti kwere ha na nkwa bụ naanị n’elu soshal midia nakwa akwụkwọ mgbasaozi ka o bere.
Ụgbọelu agbasasiala okpokoro ya n’ebe ndị mmadụ bi
Ebe foto si, BROOMFIELD PD
Ụgbọelu agbasasiala okpokoro ya n’ebe ndị mmadụ bi na Denver dị
na mba US dịka ingine ya kụrụ ka ọ na-achọ ifepụ.
Ụgbọelu Boeing 777 ahụ bu mmadụ narị abụọ, iri atọ na otu nakwa
ndị ọrụ iri mechara jiri nwayọ chịgha azụ n’ọdọụgbọelu Denver na-emerughị onye ọbụla
ahụ.
Ebe foto si, BROOMFIELD PD VIA EPA
Steeti niile dị Naịjirịa were aka ha chekwa ọhia ha- ndị gọvanọ 'South West'
Ndị gọvanọ ọdịda
anyanwụ ekwekọrịtala ka steeti niile dị Naịjirịa were aka ha chekwa ọhịa ha.
Ha kwụrụ na ha
na-akwado mkpebi a si n’aka National Economic Council gbasara maka nchekwa ọhịa
na Naịjirịa ma na-ekwu na hachọrọ ka eme ihe niile iji hụ na ndị si mba ọzọ
ejighị ụzọ ezighị ezi banye ọhịa Naịjịrịa.
Ọ bụ mgbe ha na-eme ọgbakọ n'ụlọọrụ gọọmenti dị Oyo steeti dị n'Ibadan ka onyeisioche otu ahụ bụ gọvanọ Ondo steeti ,Rotimi Akeredolu gwara ndị ntaakụkọ nke a.
Ha kwuru ka gọọmenti etiti kwado ichi ehi nakwa ọrụ ubi ndị ọzọ mana ha kpebiri ka gọọmenti ghara ikwado ichi ehi na-agagharị n'akụkụ Naịjirịa niile.
Ụtụtụ ọma ndị Igbo!
Anyị na-anabata ụnụ n'ụtụtụ na-asịkwa ka udo chukwu chịa na ndụ ụnụ.
Lekwa akụkọ ndị kpụ ọkụ n'ọnụ ugbua na Naịjirịa na mba ụwa.
Ka chi fo nu
Igbo ndị ọ ga-adịrị mma, n'ebe a ka anyị ga-awụsa ọwa taa.
Onye a hụrụ taa, sị hụkwa ya echi.
Ka e mesịa nụ.
Everton asụọla Liverpool ka nri ji, taa ha ka kanda
Ebe foto si, Getty Images
Everton ji Liverpool mee yeye na mgbede Satọde oge ha abụọ takọrọ isi n'asọmpi English Premier Legue.
Asọmpi a bụ nke onye ọbụla kacha lekwasa anya n'ụbọchị Satọde n'ihi na otu bọọlụ abụọ a nọ n'otu mpaghara mba England bụ Merseyside.
Ọkpụ goolu abụọ asataghị ihe ka Everton ji turu ugo na ya bụ asọmpi dịka Richarlison na Sigurdsson nyere goolu n;agba nke mbụ nakwa agba nke abụọ.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Everton emeribeghi Liverpool n'ime afọ 22 gara aga
Nke a bụ nke mbụ Everton na-emeri Liverpool n'ihe karịrị afọ iri abụọ.
Nke a bụkwa nke mbụ a na-emeri Liverpool n'asọmpi anọ ha gbarala n'ụlọ ha bụ Anfield.
Ebe ọkacha njọ bụ na onye ndu ndị Liverpool bụ Jordan Henderson merụkwara ahụ n'asọmpi nke taa iji tinyere ọtụtụ ndị Liverpool merụchara ahụ n'oge a.
Ugbua, Liverpool na Everton nwere akara iri anọ iri anọ, mana Liverpool agbaala otu asọmpi karịa Everton.
Etu Hushpuppi si nyere ndị 'hacker' North Korea aka zuo ụlọakụ ohi
Ebe foto si, HUSHPUPPI
Ngalaba ikpe nkwụmọtọ nke mba Amerịka a kpọrọ 'Department of Justice' akọwaala etu Ramon Abbas (Hushpuppi) si nyere ndị ohi ịntaneetị mba North Korea aka zuo nde kwuru nde dọla n'otu ụlọakụ dị na mba Malta.
DOJ wepụtara nkọwa n'ụbọchị Wenezde ma kwuo na ọ bụ Hushpuppi na otu nwoke onye mba Canada gbakọrọ aka zuo ya bụ ohi nke gbara ọtụtụ gharịị.
Ndị ohi ịntaneetị ahụ a kpọrọ 'hackers' na bekee ji kọmputa ha nọrọ na mba North Korea banye n'ime kọmputa ụlọakụ ahụ dị na Malta ma zuru ego ruru nde dọla iri na anọ na ụma asaa ($14.7 million).
Ọrụ Hushpuppi bụ ịnabata nde dọla ise na ụma isii ($5.6 million) ma zoo ya n'ụlọakụ abụọ dị na Europe.
Ebe foto si, HUSHPUPPI
O teela ndị nnyocha ngalaba Federal Bureau of Investigation (FBI) malitere inyocha Hushpuppi tupu ha emechaa nwuchie ya n'ọnwa Julaị 2020 na Dubai.
Hushpuppi bụ onye a ma ama na-emekasị akụ ma na-atakwa ego arụ.
Ndị na-eso ya n'akara Instagram ya ruru mmadụ nde abụọ na ọkara (2.5 million).
Anyị agaghị akwụ ndị ekperima ụgwọ iji gbapụta ụmụakwụkwọ ha tọọrọ - Lai Mohammed
Mịnịsta mgbasa ozi na ọdịnala bụ lai Mohammed ekwuola na gọọmentị agaghị akwụ ndị ekperima ụgwọ ọbụla iji gbapụta ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Kagara, Niger Steeti.
Lai Mohammed kwuru nke a n'ihi akụkọ na-efegharị ugbua na gọọmentị kwụrụ ndị ekperima tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ nde naịra narị asatọ.
Mohammed kwuru na akụkọ ahụ bụ okpotokpo asị, ma kwukwaa na gọọmentị etinyela atụmatụ dị icheiche iji kwụsị mwakpo na ntọrọ ndị mmadụ.
"Ihe m ga-ekwu bụ na gọọmentị nọ n'elu ya bụ okwu, mana ọ bụghị ihe anyị ga-abịa kọwaa na TV," Lai Mohammed kwuru.
"Gọọmentị agaghị akwụ ndị ekperima ọbụla ụgwọ, dịka anyị akwụghị ụgwọ ọbụla iji gbapụta ụmụakwụkwọ a tọọrọ n'obodo Kankara na Katsina steeti nakwa ụmụakwụkwọ Dapchi dị na Borno steeti.
Anwụchiela ụmụ nwaanyị abụọ maka mmegbu ụmụaka atọ n'Anambra
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii n'Anambra steeti anwụchiela ụmụ nwaanyị abụo maka mmegbu ha megburu ụmụaka atọ.
A chọpụtara ụmụaka atọ n'ime ụlọ ebe ụmụ nwaanyị ahụ kpọchiri ha ogologo oge.
Ndị uweojii chọtakwara ihe ha sị yiri ọgwụ na nsị agwọkọrọ ọnụ n'ime ụlọ ahụ ebe anwụchidere ụmụaka atọ ahụ.
"Anyị hụrụ ha ebe ha dina n'elu ọbara ha ebe agbajiri otu onye aka ....ma merụọ ụfọdụ n'ime ha ahụ" ka ozi ndị uwojii ahụ kwuru.
Ha kwuru na ha ebidola nnyocha pụrụiche ịmata etu ụmụ nwaanyị ahụ si kpaa mkpamkpa di etu a.
"Ọ bụ enyi m nwoke dị afọ 38 nyere m egbe m ji gaa ụlọakwụkwọ" - nwaada ji egbe
Ebe foto si, Cross River Police
Otu
nwata akwụkwọ dị afọ iri na asaa echeere bu egbe gaa ụlọakwụkwọ ịgbagbu onye
nkuzi maka na ọ sị ya kpụọ isi akụwaala akụoyibo nsugbe
Ọ
gwara ndị uweojii na ọ bụ enyi ya nwoke dị afọ iri atọ na asatọ ma jiri ụmụaka
atọ nyere ya egbe ahụ o wegara ụlọakwụkwọ ya.
Ndị
uweojii kọwakwara na o nweghi onye o bu n’uche ịgbagbu n’ihi na enyi ya nwoke
nyere ya egbe ya gaa lụzie ya.
O
jiri ya gaa ụlọakwụkwọ ịgosi ndị enyi ya tupu ejide ya.
Ihe
ọzọ gbakwara ama bụ na nwaada ahụ kwetara na o so n’otu nzuzo ụmụnwaanyị nke
akpọrọ “Sky Queen Confraternity”
Ụlọikpe atụọla otu nwoke nga maka igbu nwaanyị dị ime
Ebe foto si, @Keba99
Otu ụlọikpe atụọla otu nwoke nga afọ iri abụọ maka ịsụkasị otu nwaanyị dị ime mma ma makwunye ya ụdọ n'elu osisi.
Mzikayise Malephane dị afọ 31 sụkasịrị Tshegofatso Pule dị afọ 28 gwara ụlọikpe ahụ na ọ bụ onye bụbu enyi nwoke Pule kwụrụ ya ụgwọ mme nke a.
Cheta na ọnwụ Pule butere ngagharịiwe 'ozuola bụ n'ozuola' n'etiti ụmụnwaanyị mba ahụ n'afọ 2020 nke onyeisiala mba ha tinyekwara ọnụ na ya.
Ndị uweojii si na ha anwụchiela onye bụbu enyi nwoke Pule maka nnyocha.
Kọmiti nyochara mpụ ndị uweojii na-eme na Legọs dịka e mechara ngagharịiwe End SARS nyere mmadụ abụọ ndị uweojii merụrụ ahụ nde naịra iri n'otu n'otu.
Mmadụ abụọ a bụ ezinụlọ Kudirat Adebayo Abayomi onye mgbọ ndị uweojii gburu n'afọ 2017, nakwa Hannah Olugbode onye mgbọ ndị uweoji gbajiri ụkwụ.
Ebe foto si, End Sars
Gọọmenti Legọọs ejila nde N10 tie onye ndị uweojii SARS merụrụ ahụ
Ebe foto si, LASG
Nkọwa foto, Gọọmentii Legọọs ejila nde N10 tie onye ndị uweojii SARS merụrụ ahụ
Ndị otu nnyocha ehibere na Legọs ịhụ maka mkpesa ndị mmadụ kpesara maka ndị ọrụ SARS akụọla nde naịra iri (N10 million) ka ego iti aka n'obi nye onye SARS merụrụahụ. Onyeisi oche Justice Doris Okuwobi jiri aka ya nye ndị kpesara mkpesa a n'anya ndị Gọọmenti Legọs.
O nyere Odz. Hannah Olugbodi, mbọ egbe ndị uweojii SARS merụrụ ahụ.
Gọọmenti Legọs depụtara nke a n'ọba ozi ha na Twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ọ fọtụla obere mana atọhapụbeghị ụmụụlọakwụkwọ atọrọ na Kagara
Ebe foto si, Niger State Government
Nkọwa foto, Gọvanọ Abubakar Bello nke Naija Steei
Gọvanọ Naịja steeti bụ Abubakar Bello, ekwela ndị steeti ya nkwa na ọ naahazi etu ya na ndị na-achị n'obodo ahụ ga-eji akpọpụta ụmụụlọakwụkwọ ndị atọrọ na site na mwakpo mere n'ụbọchị Wenezde (Febụwarị 17, 2021).
Ntọrị ụmụ ndị a na-abịa ọnwa olenole atọrọ ụmụụlọakwụkwọ 300 n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na Kankara, Katsina Steeti.
N'otu aka ahụ onye nnọchịanya ndị mba Britain na Naịjirịa chetara ụmụakwụkwọ Dapchi tụmadị Leah Sharibu ka dị n'aka ndị ntọ.