Nnamdi Kanu: Etu e si tọhapụ Maria Ezediaro ndị uweojii nwụchiri maka ịkwado onye ndu Ipob

Nnamdi Kanu na Maria Ezediaro

Ebe foto si, Getty/Ifeanyi Ejiofor

A tọhapụla otu nnenwaanyị e jichiri kemgbe otu afọ maka ịkwado Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob).

Ndị uweojii pụrụ iche nke Abba Kyari bụ onyeuweojii a kwusịị ọrụ n'ike nọbu n'isi ya nwụchiri Oriaku Maria Ezediaro na ndị ọzọ n'Imo steeti afọ gara aha kpụrụ ya gaa Abuja ebe a kpochiri ya n'ogige ha rue ụbọchị Tozde a tohapụrụ ya.

N'ozi nke Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu wepụtara ụbọchị ọzde, o kwuru na nntọhapụ Ezediaro sochiri akwụkwọ ya tinyere n'ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja .

Ejofor kwuru sị, " Anyị tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe na-ekwu ka enye ya ikike dịrị ya dịka mmadụ, nwagwagwa ahụ ndị IRt gbara ọsọ kpụpụ ya n'ụlọikpe na-ebo ya ebubo achịtaghị aja."

"Na-agbayeghị nke a, Iwu mala Naijirai wụrụ ha ụkwụ n'ala ma nye iwu ka adọghapụ nwaanyị ahụ na-eneyghị ọnọdụ ọbụla."

Cheta na a nwuchiela ọtụtụ ndị mmadụ a na-ebo ebubo na- ha na-akwado Nnamdi Kanu maọbụ nnwereonwe Biafra kemgbe mkpu Biafra rịwa elu ọzọ kemgbe afọ 2015.

N'afọ 2017, gọọmentị Naijiria machiri otu Ipob so n'otu bu iti mkpu nnwereonwe Biafra n'isi ma gunye ha n'otu oyinduegwu (terrorist group).

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: