Causes of blindness: 'ịkpa oke megide anyị n'ihi ahụghị ụzọ gbochiri anyị inweta ọrụ'

Aha onyonyo, Ajụrụ iwe anyị n'ọrụ maka na anyị kpuru isi

Maxwell Opara gụchara mahadum tiwaa 'slate' mana ọ rara ya ahụ inweta ọrụ n'ihi na a na-akpagide ya oke n'ihi na ọ naghị ahụ ụzọ.

Opara nwere asambodo 'First Class' na ngalaba 'mgbasaozi 'Mass Communication' na mahadum 'University of Nigeria Nsukka.'

"Abụ m onye ọkaibe na klassị anyị oge m gụchara na mahadum."

" Ihe nọ n'obi m bụ na m gụcha, ụlọakwụkwọ anyị, enye m ọrụ, mana ọ dịghị otu a."

" Mana ndị na-ewe n'ọrụ anaghị ahụ dịka onye ga-arụnwu ya"

E jighị nsogbu anya mụọ Maxwell.

Ọ kọwara na nsogbu anya ya bidoro n'afọ 2012, mgbe ọ nọ na mahadum nke Federal University of Technology - Owerri (Futo).

Nsogbu ahụ mere ka ọ kwụsị ịga ụlọakwụkwọ mgbe ahụ, n'agbanyeghi na ọ nọ na-achọ ịbanye n'afọ nke atọ ya (3rd year).

O mechara legharịa ule e ji abanye mahadum ma banyekwa na nke 'University of Nigeria Nsukka' (UNN) ebe ọ nọ gụchaa n'afọ 2019.

Demola Adeleke na Mercy Nwaigwe

N'agbanyeghị na ha mere ọfụma n'ụzọ pụrụiche na mahadum, otu ihe nagidere ha inweta ọrụ; ịkpa oke megide ha n'isi ha kpuru.

Opara, Adeleke na Nwaigwe gwara BBC Igbo na ha ekpughi isi mgbe a mụrụ ha.

Ha kọwakwara ihe ha gabigara na etu ha siri gbasie mbọ ike n'agụmakwụkwọ ha ma turu ugo lọta.

Opara gụchara jiri 'first class' pụta na mahadum, o che na ọ ga-enweta ọrụ na mahadum ahụ ọ gụrụ, mana nke ahụ enweghi isi.

Nwaigwe kwuru etu o si gaa ịchọ ọrụ, lechaa ule so ya mana ha eweghi ya n'ọrụ mgbe ha chọpụtara na ọ naghị ahụ ụzọ.

O kwuru na ọ chọpụtara na anya na-enye ya nsogbu mgbe ọ nọ n'ụlọakwụkwọ sekọndrị.

Ọ kọwara etu o si mechaa banye n'ụlọakwụkwọ Federal College of Education dị n'Oyo steeti, bụ maka ndị ọpụrụiche, ma mechakwaa gaa mahadum nke University of Lagos, site n'afọ 2014 ruo 2017.

Adeleke kọwara etu o si nweta CGPA 4.4 na mahadum mana ọ rara ya ahụ inweta ọrụ n'ihi na "anaghị ewe ndị dị ka m n'ọrụ".

Nsogbu ikpuisi

Dịka nchọpụta nke akwụkwọ mgbasaozi sayensi bụ 'Investigative Ophthalmology &Visual Science' si kwuo, ihe karịrị mmadụ nde anọ na ụma iri abụọ na ise(4.25m) dị agbata afọ 40 bụ ndị kpuru isi.

Ọtụtụ n'ime ha na-agabi ịkpa oke dị iche iche nakwa nsogbu itinye ha n'uch oge a na-arụ arụmarrụ obodo iji nnyere ndụ ha aka.

Gee ihe ha kwuru n'uju: