Osisioma Pipeline explosion: Mkpu ka na-ada n'obodo

Ụlọomeiwu ukwu Naijiria enyela iwu ka ebido nyocha ihe mere na n'Osisioma Abia steeti, ebe ọkụ gbagburu ihe karịrị mmadụ 150.
Sinetọ na-anochite mpaghara ahụ bụ Theoodre Orji onye welitere okwu ahụ n'ọgbakọ ha n'ụlọomewu sineti ụbọchị Wenezde, rụrụ ụlọọrụ NNPC aka n'ọdachi ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Sinetọ ndị Igbo tụnyere ọnụ gụnyere Victor Umeh na Mao Ohuabunwa.
Ha kwuru na ọ bụ maka NNPC na DPR ndị ọ dịrị hapụrụ ọrụ idozi okporo mmanụ ahụ oge ọ gbapuru na agbanyeghị na e wetara ha ozi mere ka ọdachi ahụ mee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3
Akwa arịrị na-ari onwe ya elu n'obodo Ụmụduru na Ụmụimo dị n'okpuru ọchịchị Osisioma, n'Abia steetị ugbua n'ihi na ihe karịrị mmadụ ole na ole nara n'iyi na ọkụ.
Ya bụ ọkụ kpara mkpamkpa ahụ na ụbọchị Fraịde gara aga, oge ọkụ bara okporo igwe na-ebụ mmanụ agbịdị.

Mgbe BBC rutere na Umuduru ebe ndị nwụrụ anwụ ka n'ọnụ ọgụ, ọtụtụ ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ kwara arịrị na otela ha jiri na-agwa ụmụ ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọghọọ aka mmadụ.
Dịka ndị gọọmenti siri bupusịa ozu ndị nwụrụ anwụ, ọtụtụ ngwongwo ha ji amị mmanụ ka tọgbọrọ ebe ahụ.
Obodo nke abụọ ya bụ okporo Igwe mmanụ ghọrọ ọkụ bụ, Umuimo.
N'Umuimo, ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ gbara ọkụ.

Otu nwoke ụlọ ya gbara ọkụ bụ Chuks benson Uzoije kwara arịrị na mmadụ atọ nọ n'ụlọ ya ka ọkụ gbagburu ụbọchị ahụ.
Ndị ahụ ọkụ gbara bụ di na nwunye na otu nwa aghọghọ bi n'ụlọ ya.
O kwuru na kamgbe Fraịde izuụka gara aga ọkụ a gbara na ya na arahụ n'ụlọ onye ọzọ, ma yirikwa nanị otu akwa.

Ụmụ nne ya bụ nwoke ndị nwanyị mmadụ atọ siri Legọs nakwa Calabar ebe ha na di ha bi were bịa ịhụrụ ụlọ nna ha juputara na anya mmiri n' ụlọ nna ha adịghịzịkwa.