Russia and Ukraine conflict: Kedụ ihe Nato na-eme maka mwakpo Russia?

Ebe foto si, Getty Images
Mba ndị dị n'otu Nato na-ebunye mba Yukren ngwaagha ọnụahịa ya dara nde kwuru nde dọla iji nyere ha aka n'ọgụ megide Rọshịa.
Ngwaagha ndị a gụnyere ụgbọagha na egbe ọdị-na-mba-ejere-mba-ozi (heavy artillery).
Gịnị bụdị Natọ?
Nato bụ aha ịchafụ otu Bekee kpọrọ 'North Atlantic Treaty Organization' nke bụ otu agha mba iri na abụọ gụnyere Amerịka, Briten, Kanada na Frans hiwere n'afọ 1949 ka a lụchara Agha Mbaụwa nke Abụọ..
Ndị nọ n'otu a kwekọrịtara ịgbatara ibe ha ọsọ enyemaka n'oke ọbụla mba ọzọ na-ebuso ha agha.
Ebumnobi Nato na mbụ bụ ịkwụsị mgbasa akpamike Rọshịa na Yurop.
N'aka nke ọzọ, Soviet Union hiwere otu agha nke ha nke jikọrọ mba ndị dị 'Ọwụwa Anyanwụ Yurop kwenyere na kọmunizm nke ha kpọrọ 'Warsaw Pact' na Bekee.
Ka Soviet Union dara n'afọ 1991, ụfọdụ mba ndị sonyere na 'Warsaw Pact' gbahapụrụ ya sonye Nato.
Sweden na Finland enwere ike ịbanye Nato?
Ndịisi ọrụ Amerịka na-atụ anya na Sweden na Finland ga-achọ isonye n'ọnwa Juun.
Ọ bụrụ na ha sonye, nke a ga-ewelite ọnụọgụgụ mba so na Nato rue mba 32.
Rọshịa adọọla mba abụọ ndị a aka na ntị ka ha ghara ịbanye Nato.
Mana ndị isi nchekwa mba Amerịka kwuru na mwakpo Rọshịa wakporo Yukren bụ "nnukwu nzọhịe ụkwụ" nke nwere ike ime ka Nato nweta ndị ọhụrụ.


Kedụ ihe kpatara na Nato ezigaghị ndịagha ha Ukraine?
Maka na Yukren anọghị na Nato, iwu ejighị otu ahụ ịgbatara Yukren ọsọ enyemaka.
Mba ndị dị na Nato na-atụ egwu ibuso ndị agha Rọshia nọ Yukren agha, ọ ga-ebute agha n'etiti Rọshịa na mba ndị dị n'Ọdida Anyanwụ Yurop.
Nato sị na ndị otu "Anyị kwesiri ike inye Yukren nkwado nile any nwere ike ya "mana hụ na agha ahụ agafeghị karịa Yukren".
Ya mere Nato jiri jụ ịnabata iwu na o nweghị ụgbọelu ga-efefe na Yukren.
Mana otu ahụ kwadoro nhibe ihu ọgụ nke ndịagha mba anọ na mba Slovakia, Hungary, Bulgaria na Romania - atọ n'ime ha bụ ndị agbataobi Yukren - nke a ga-abawanye ike Nato na mpaghara ahụ.
Kedụ ihe Roshia ejighị chọọ Nato?
Nato nyere Yukren ohere isonye otu ahụ n'afọ 2008. Ka Rọshịa weghachara Crimea n'afọ 2014, Yukren kpọrọ okwu isonye okwu dị oke mkpa.
Mana nke a emezubeghị n'ihi na Rọshịa achọghị ya achọ.
Otu n'ihe Rọshịa chọrọ tupu ha wakpoo Yukren bụ na Yukren agaghị enwelata ohere ịbanye Nato, bụ ihe Natọ anabataghị.
Rọshịa kwenyere na Nato na-etipata mpahara ha bụ Rọshia nwere agba site n'ịdọrọ ndị ọhụrụ site n'Ọwụwa Anyanwụ Yurop dị n'azụ ụlọ ha.
Onyeisiala Yukren bụ Zelensky ekwetala na mba ha agaghị aba Nato ugbua , sị, " O doro anya na Yukren abụghị onye otu Nato. Anyị ghọtara nke a."
Ndịagha ole ka Nato nwere n' Ọwụwa Anyanwu Yurope?

Ebe foto si, Getty Images
Tupu Nato ezipu ndịagha ha zipuru na nso nso a, Nato nwere ndị agha na mba dị na Baltic dị n'Ugwu rue Romania dị na Ndida.
Ndịagha Nato nọwara ebe ahụ mn'afọ 2014, Rọshịa weghara Crimea, ime mgbaama ma e nwee mwakpo Rọshịa.
Natọ ezigaala ndị agha 40,000 bụ ndị ga-aza oku na mba dị 'Ọdịda Anyanwụ Yurop dị nso na Rọshia na Yukren.
Ha nwekwara ụgbọelu agha 100 kere nkwụcha nakwa ụgbọmmiri 120 n-akpagharị oke Osimiri Mediterranean.
Amerika ekwuola na ha ga-ezigakwu ndị agha Yurop isonye ndịagha Nato hiwerela n'Estonia,Latvia,Lithuania na Poland.
Ngwagha ndị Briten na mba ndị ọzọ zigarala Yukren
- Briten ezigarala Yukren puku kwukru puk i igwe na-egbochi ogbunigwe na mgbọ ịtụ ụgbọ.
- Amerịka ezigakwala ụgbọ na-egbochi ogbunigwe maọbụ mgbọ ịtụ ụgbọelu nke ego ya ruru ijeri dọla atọ.
- Slovakia ezigala ụgbọ nchekwa ụgbọelu nke nwere ike ịgbarị ụgbọelu nọ kilometa 400
- Netherland, Amerika,Briten nakwa Canada na-akwado iziga egbe egbe ọdị-na-mba-ejere-mba-ozi
- Otu 'European Uniọn' kwuru na ha ga-emefu ihe ruru nde Yuro 450 n'iziga ngwaagha na Yukren. Nke a bụ mbụ otu a naenye aka ibuga ngwa agha n'ebe a na-alụ agha.














