Russia Ukraine invasion: Nwaanyị onye Russia anwụchiri nwa ya n'agha chọrọ ka a kpọnyekwa ya nwa ya

Ebe foto si, Empics
- Onye dere ya, Timur Sazonov
- Ndị mere akụkọ a, BBC Russia
N'ụbọchị Tọzde, abalị 24 nke ọnwa Febrụwarị bụ ụbọchị mbụ a wakporo Ukraine, e wepụtara foto nwoke abụọ yi akwa ndị agha Russia n'akara Facebook onyeisi agha mba Ukraine bụ Valeriy Zaluzny.
Ọ bụ mgbe nke a mere ka Natalya Deineka kwuru ọ matara na e jidela nwa ya nwoke n'agha.
Na nkata ya na BBC Russia nwere, nwaanyị ahụ gbara afọ 40, kwuru na ọ bụ nwanne ya nwaanyị gwara ya maka foto ahụ.
Natalia amatabeghị ebe okwu kwụ ugbua dịka o si metụta ọnọdụ nwa ya nwoke.

Ebe foto si, AFP
Natalia sịrị, "Akpọtụrụ m otu onyeagha ya na ya nọ n'otu gwa ya ihe mere."
"Ọ gwara m na a ga-eme nchọpụta mara ma anwụchiri Rafik ka ọ bụ na anwụchighị ya, mana o nwebeghị onye gwara m nke bụ nke."
Mana ndị isi agha agọghị agụgọ na nwokorobịa ahụ dị afọ 19 banyere amị ihe erubeghị otu afọ ugbua, tupu eziga ya n'ihu agha na Ukraine.
'Ọ maghị na a ga-akpọga ha ebe ahụ'
Natalia sị na nwa ya bụ injinia n'otu agha 4th Guards (Kantemirovskaya) Tank Division, amaghị na a ga-ezipu ya gawa Ukraine.

"Ọ maghị na a ga-eduga ha ebe ahụ. Ọ bụ ka ha rutere ka ha matara."
Ụbọchị ikpeazụ Natalia na nwa ya bụ Rafik nwere mkparịtaụka bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Febụwarị ebe ọ gwara ya na ndị otu agha ha nọ nsọ okeala Ukraine.
"Ajụrụ m ya ihe mere na ọ gwaghị m na atụgara ya na ngalaba ọzọ, ya asaa m sị, "Achọghị m ka ị tụwa uche. Enyela onwe gị nsogbu". Ọ sị m na nsogbu adịghị.
Oge foto ahụ wuwere, ụlọọrụ Onyonyo nke mba Russia (Russia-24) kwuru na ọ bụ "akụkọ ụgha".
Ebe ego na-abata ya aka kwa daa
Natalia kwuru na ya akpọtụla ọtụtụ otu gụnyere otu otu abụghị nke gọọmentị na Russia jikọrọ ndị nne ụmụ ha bụ ndịagha a kpọrọ "Committee of Soldiers' Mothers".
"Ha nara m ozi maka nwa m ma rue ugbua, o nwebeghị ihe m nụrụ."
"Amaghị m ihe m ga-eme. O nweghị ihe ụlọntakụkọ na-ekwu maka ndị nke anyị e jidere n'agha. Ka ọ bụ na ha amaghị?"
Natalia kwuru na nwa ya banyere ọrụ amị n'ọnwa Juun afọ 2021 dịka onye adọkpụnyere n'ọrụ agha, nke dịka iwu ala Russia siri dị, o kwesịghị iziga ihu agha.
Mana enyi nwaanyị Rafik bụ Liliya, gwara BBC Russia na Rafik malitere ọrụ dịka onye ọrụ ngo agha n'ọnwa Disemba iji nweta ego ọ ga-eji na-elekọta ezinaụlọ ọ na-akwado imalite n'ọdịnihu, n'agbanyeghị na ọ rịọrọ ya agala.

Nne Rafik kọwara na nwa ya nwoke na-agụbu n'ụlọakwụkwọ nka ọrụ ugbo tupu ọ kwụsị, banye amị n'ihi na ọ hụrụ amị dịka ọrụ ga-enye ya ego.
"A na-enye onyeagha ụlọ, i nwetakwa ụgwọ ọnwa. O nweghị ọrụ ọzọ dị n'obodo ugbua."
"Ọ bụghị na ọrụ agha amasịka nwa m nwoke. Kama ọ bụ ohere ịkwụrụ onwe ya inweta ọrụ ebe ego ga na-abata ya aka kwa daa."
Rafik bụ otu n'ime ụmụ atọ Natalia mụrụ, onye ya na ya nọ dịka di na nwaanyị ugbua nwekwara ụmụ atọ.
'Nwa m agaghị ebe ahụ na mkpebi okwu aka nke ya'
Oge a jụrụ ya ihe o chere maka mwakpo Russia mere Ukraine, Natalie kwuru na ya anaghị eso okwu ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụ ige ozi ntaakụkọ.
"Iji gwa gị eziokwu, aghọtaghị m ihe butere ihe ndị a niile."
"N'ala anyị, ụfọdụ enweghị ihe ha na-eri. Aghọtaghị m agha ọbụla maọbụ ihe ndịagha na-eme."
Ọ nọkwataghị dịka ọ gụrụ ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nwa ya ezigara ebe a na-alụ agha, ọkachasị dị na-eyi egwu ihe a ga-eme Rafik na ndị agha Russia ndị ọzọ e jidere n'Ukraine.
"Nwa m agaghị ebe ahụ n'onwe ya, ọ bụ onyeisi agha zigara ya ebe ahụ."
"Maka gịnị? Enweghị m ike ịkọwa. Anyị; ma mụ ma nwa m achọghị ya."
Ọ jụrụ sị, "Kedụ ọnụụzọ m ga-akụ aka ka a kpọnyekwa m nwa m?"














