Russia and Ukraine conflict 2022: Etu agha Ukraine si emetụta akụnụba Naịjirịa na mbaụwa

Ebe foto si, Reuters
Agha na-ada na Rọshịa dịka ndị agha mba Rọshịa na-abanye mba Yukren n'ike n'ike.
Ọtụtụ mbụ ụwa anabataghị mwakpo a Rọshịa na-awakpo Yukren nke mere ka enye ha ntaramahụhụ nke a na-akpọ "Sanctions" n'okwu Bekee.
Ataramahụhụ ga-emetụta azụmahịa mba Rọshịa nakwa ọtụtụ mba ndị nwere agba na mba ụwa.
Eji mgbere ikuku gasi were mara mba Rọshịa n'ụwa niile kama mkpachị akụnụba ha metụtara mgbere gasị ha.
Dịka a na-ekwu na mgbada dara ibi bụ uru dịnta, BBC Igbo jụrụ ụfọdụ ndị ọkaibe n'ihe banyere akụnụba mba na mba ihe ha nwere ikwu maka etu mba dịka Naijirịa na mba ndị ọzọ ga-esi erite uru n'agha na-ada na mba Yukren.
Mba ndị na-ere mmanụ agbidi na ikuku gasị

Ebe foto si, Getty Images
Kachukwu Ononuju bụ onye ọkankuzi na ihe gbasara akụnaụba sị "ọnwecheghị ụzọ ọjọọ ya bụ agha ga-esi metụta Naịjirịa, kama na ọ ga-emetụta ha n'ụzọ dị mma".
Ọ sị na Naịjiria nwere ohere ịre gasị ha ugbua maka nke ndị Rọshịa bụ nke ndị Nato chabiri okporo paịpụ ha nọ na Nostrum agaghizi na-ere ahịa gasị n'Europe.
Ononuju sị na ya bụ agha ga-eme ahịa egbe na ngwaagha ga-ari elu na mbaụwa nke bụ na ndị niile na-ere ngwaagha ga-agba ezigbo akaahịa ugbua.
Ọ sịkwa na "ihe ahụ Rọshịa na-eme bụ igosi ụwa ngwaagha ha dịka ha na-ebugharị ya".
Kachukwu sịkwa na ọ bụ eziokwu na Rọshịa ga-ata ahụhụ maka mkpachị akụnaụba Nato nyere ha, nke gụnyere ịchabi okporo paịpụ ha ji ebugharị gasị akpọrọ "Nostrum Pipeline"
Ọ gara n'ihu kọwa "mana China nwereike nyere ha aka maka na ha bụ enyi".
Maka ego Crypto

Ebe foto si, Getty Images
Kachukwu kọwara na ọ bụrụ na ya bụ mkpachị jisie Rọshịa ike, na ha nwereike ijikwa ụzọ bụ "Cyrpto Currency" were zụwa ahịa site n'ụzọ zoro ezo.
Otu nwamadi Igbo achọghị ka a kpọọ aha sị na ya bụ agha agaghị emetụ ahịa "crypto currency" n'ụzọ ọbụla ọ gwụchaa ka amalitere igba asiri ya.
N'okwu ya ọ sị "ihe ụwa kwesịrị ima bụ na asịrị ka "crypto currency" ji ere."
O kwusiri ike na ya bụ asịrị ga-eme ka Cryto curency rie elu.
Mana o kwukwara na mba na mba maọbụ ụlọọrụ kọmpini dị ịcheịhe na ibe ya anaghị ekweta iji "crypto currency" azụ ahịa maka na ọ bụ ụzọ azụmahịa ọtụtụ enwetebaghi ntụkwasịobi na ya n'ihe ọ bụ ụzọ azụmahịa zoro ezo.

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị bụ 'Cryptocurrency'?
Cryptocurrency bụ ego ịntanetị enwereike iji zụọ ahịa.
A na-esi naanị n'ụzọ tekụnzụ kọmpụmta wee jiri ya zụọ ahịa.
Ihe dị mkpa ịma maka ego a bụ na enweghịike inwe adịgboroja ya dịka igwe kọmpụta nke Block Chain na-echekwa usoro ya.
Anaghị ejide ego Cryptocurrency n'ụlọakụ ọbụla kama ndị na-eji ya azụ ahịa nwereike isi ụzọ tekụnzụ 'Blockchain' wee zụọ ahịa ma nyefee ego site n'aka fere n'aka.
Marakwana enweghi mba ọchịchị maọbụ gọọmentị ya nwereike itinye maọbụkwa nyochapụta n'uju usoro azụmahịa ya dịka ha anaghi ejikwa ego ndị mmadụ n'ụlọakụ ọbụla.
Nke a mere ụfọdụ gọọmentị mba dị ịcheịche jị adọọ ndị mba ha aka na ntị ka ha hie asaa n'anya n'iji Cryptocurrency zụọ ahịa.
Mba ndị nyere ịdọaka na ntị a gụnyere Naịjirịa, n'ụfọdụ mba ndị ọzọ amachịrị ya amachị.
Mba ndị a gụnyere China, Algeria, Bolivia, Egypt, India, Russia wdgz.
Ufọdụ ụdịrị ego a ama ama na mbaụwa bụ Bitcoin, Ethereum, Stellar na ndị ọzọ.









