Russia and Ukraine conflict 2022: Mba Briten ga-eji mmachi kara aka sochi Russia - Boris Johnson

Boris Johnson

Ebe foto si, AFP/REUTERS

Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson ekwuola na mba ahụ ga-adọnyere mba Ukraine ukwu iji merie ihe ọ kpọrọ mkpagbu megide ọchịchị onyekwuoucheya nke mba Russia.

N'ozi o ziri n'ehihie Tọzde, Johnson kwuru na Briten ga-apịa Russia mmachi dị icheiche ma nyekwa.

Johnson sịrị na "mwakpo Ukraine abughị nanị Ukraine ka a wakporo, ọ bụ mwakpo megide ọchịchị onyekwuoucheya nke bụ ikike Briten ga-akwadosi ike."

Ogbunigwe ndị Russia egbuola ndị mmadụ na Yukraine - Ndị uweojii Ukraine

Ndị uweojii na-enyocha ogbunigwe.

Ebe foto si, Reuters

Ndị uweojii mba Ukraine ekwuola na mmadụ asaa anwụọla site na ogbunigwe ndị agha mba Russia turu.

Mwakpo Russia wakporo ogige ndịagha dị na Podilsk butere ọnwụ mmadụ isii ebe otu onye merụrụ ahụ.

Otu onye ọzọ nwụrụ na obodo Mariupol ebe mmadụ iri na itolu bụ ndị a na-achọ achọ.

Onyeisi Ukraine depụtara n'akara Twitter ya
Nkọwa foto, Onyeisi Ukraine depụtara n'akara Twitter ya

N'aka nke ọzọ ka ndị agha mba Ukraine na-ekwu na ha egbochiela ndị agha elu mba Russia kama ndị agha alu Russia na-ekwu na ha akaala nku ndị agha elu mba Ukraine.

Dịka ọ dị ugbua, akụkọ si Ukraine na-ekwu na ndị agha Russia si mpaghara dị iche iche awakpo ha.

Ebe ha si abata gụnyere Belarus na Crimea.

Onyeisiala Rọshịa Vladimir Putin

Ebe foto si, TASS via Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Rọshịa Vladimir Putin

Mba Amerịka ekwuola na nzụkọ Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na nke mba Rọshịa bụ Valdimir Putin kwesịrị ịnwe agaghịzị enwe isi dịka ha na-ekwu na mba Rụshịa ebidola ịluso mba Yukren ọgụ.

Biden kwuru na Amerịka ebidola ntaramahụhụ ha ga-ata Rọshịa dịka ọ na-ekwu na mba Rọshịa abanyela Yukren ma sị na ha ga-atụkwasị ya ọzọ ma ha gaa n'ihu bata kwuo Yukren.

Biden gwara ndị ntaakụkọ na ntaramahụhụ a ga-emetụta ngalaba ụlọakụ Rọshịa ma tinye kwa ndị ji ego na ezinụlọ ha ma ndị ọrụ gọọmentị mba Rọshịa.

Okwu a bidoro dịka Putin nyere iwu ka ndị agha Rọshịa banye mpaghara nnupụisi Donetsk na Luhansk nọ na Yukren.

A hụrụ ikuku ojii na-apụta n';akụkụ ọdọ ụgbọelu ka onyeisiala Rọshịa bụ Onyeisiala Vladimir Putin nyere ohere ka agha n'ọwụwa anyanwụ Yukraine, na Mariupol, 24 Febụwarị 2022

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ana-ahụ ka ikuku si ọnọdụ ndị agha apụta n'akụkụ ọdo ụgbọelu n'obodo Mariupol.

Dịka o siri dị, awa iri atọ na isii agachaala kamgbe Putin nyere iwu ka ndị agha Rọshịa ọ si na-echekwa udo gaa Rọshịa, mana enweghị ihe gosiri na ha abatala.

Etu ọ dị ugbua, enweghị ihe na-egosi na ntaramahụhụ a na-ehiwe Rọshịa na-emetụta ha.

Anwụrụ ọkụ sitere na ọdọ ụgbọleu ndị agh dị na Chhuyev mpaghara ọwụwa anyanwụ Ukraine

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Anwụrụ ọkụ sitere na ọdọ ụgbọleu ndị agh dị na Chhuyev mpaghara ọwụwa anyanwụ Ukraine

Lee etu ndị mmadụ sị agbapụ isi obodo Ukraine bụ Kyiv

Ndị mmadụ na-agbapụ isi obodo Ukraine

Ebe foto si, Reuters

Ụzọ akpọchiela n'isi obodo Yukren bụ Kyiv dịka ụgbọala kwụ n'ahịrị ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ maka ọgụ mba Rọshịa na-aluso Yukren.

N'ebe ndị ọzọ ka ndị mmadụ kwụ n'ahịrị n'ọdọ ụgbọala achọ ụzọ ha si apụ.

N'aka nke ọzọ ka gọọmentị Yukren na-ekwu ka ndị mmadụ hara ịtụ ụjọ n'ihi na ọ bụ ihe ndị Rọshịa chọrọ.

Lee foto ka ndị mmadụ sị akwado ịpụ Kyiv

Ndị mmadụ kwụ n'ahịrị akwado ịpụ Kyiv

Ebe foto si, Getty Images

Ndị mmadụ kwụ n'ahịrị akwado ịpụ Kyiv

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụgbọla akwụ n'ahịrị achọ ịpụ Kyiv
Ndị mmadụ kwụ n'ahịrị akwado ịpụ Kyiv

Ebe foto si, Getty Images

Ndị mmadụ kwụ n'ahịrị akwado ịpụ Kyiv

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị gaara zoo n'ọdọ ụgbọ oloko
Onye na-achọ ịpụ Kyiv

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ akwakọọlwa ngwongwo ha

Ihe kwesịrị ịma maka Rshịa na Yukren

Mba Yukren banyere Soviet Union n'afọ 1922.

Mgbe oke ụkpa jidere mba Yukren nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ nwụọ, Onyeisiala Soviet Union oge ahụ bụ Joseph Stalin kpọorọ ọtụtụ ndị mba Rọshịa na ndị mba ọzọ nọ na Soviet Union were kpọga ha mpaghara Yukren iji mjipụta ndụ nwụrụ nụ.

Onye agha

Ebe foto si, Reuters

Soviet Union daara n'afọ 1991 nke mere ka Yukren nwere onwe ha.

O siri ike ịchịkọta mba Yukren maka na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba Yukren nwere mmasị ịnọnye Rọshịa.

Eserese na-akọwa ikikere ndị Rọshịa na ndị Yukren
Nkọwa foto, Ikikere ndị Rọshịa na ndị Yukren

Gịnị bụ 'Minsk Agreement'?

Minsk agreement dị ụzọ abụọ, lee nọwa ha ebe a:

'Minsk Agreement' nke mbụ

Mba Yukren na ndị chọrọ nwere onwe nke mba Rụshịa na-akwado nwere nkwekọrịta iri na abụọ nke ga-ebute udo n'ọnwa Sepụtemba afọ 2014.

Nkwekọrịta a gụnyere ịweghachi ndị ejidere n'agha, iwebata enyemaka na ịwepụ nnukwu ngwa ọgụ.

Kama nke a enweghị isi dịka mpaghara abụọ a erubeghị ya isi.

'Minsk Agreement' nke abụọ

Ọ bụ ndị nnọchite anya mba Rọshịa, mba Yukren, otu Organisation for Security and Cooperation (OSCE) na ndị isi otu nnupuisi Donetsk na Luhansk binyere aka na nkwekọrịta iri na atọ n'ọnwa Febuwarị afọ 2015

Ndị ọchịchị Fransị, Jamanị, Rọshịa na Yukren bịakọrọ ọnụ na obodo Minsk were kwado nkwekọrịta a.