Ukraine: Boris Johnson nke mba UK ga-agbajinye Vladimir Putin nke Russia osisi na ntị

Boris Johnson and Valdmir Putin

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto Boris Johnson and Vladimir Putin sere na ọgbakọ ha nwere na Libya n'afọ 2020

Dịka ịhe na-akawanye njọ n'etiti ndị Russia na mba ndị ọzọ na-akwado Ukraine maka egwu mwakpo mba ahụ, onyeisiọchịọchi mba Uk bụ Boris Johnson ejikerela ịkpọ Onyeisi mba Russia n'ekwentị.

Boris chọrọ ịchetere Vladimir Putin mkpa ọ dị ịnọrọ ọdụ kpabie ya bụ okwu na-achọ ịdapụta n'etiti ha na Ukraine ịma ka a ga-esi gbochie ya bụ ọgụ tupu ọdawa tigbuo zogbuo.

Boris na-akwado ị ga hụ Putin na ọdịda anyanwụ nke Iropu maka ya nkata dị oke mkpa nke isiokwu ya bụ ime ka ha na Ukraine kpezie n'udo ghara ọgụ.

Boris sị na ya ga "ekwusi ike ka Putin ghọta mkpa ọ dị ji nwaayọ mezie ya bụ okwu".

O kwukwara na ya ga-agwakwa ndị Russia ka ha buru ngwongwo ha lọghachị azụ".

O kwukwara na UK ga-esite ndị agha ịgbachitere ndị NATO na Russia nwaanwaa buru agha bịa.

Nke bụ eziokwu bụ na Ukraine esoghị na NATO, mana Russia chọrọ ka ndị otu ahụ kwe nkwa na ha agaghị anabata ha n'ụdị na ọ ga-ebute ọgbaaghara na mpaghara ahụ.

A dị mba 30 gụnyere UK na US so NATO, ụfọdụ n'ime ha gbara Russia gburugburu bụ ndị kwere onwe ha nkwa ịgbachitere ibe ha ma ọgụ daa.

Russia ebusala ngwaagha karịrị otu narị puku nakwa ọtụtụ ogbunigwe na-efefe n'oke ala ha na Ukraine, mana ha na-agọsị ike na ha achọghị ịwakpo ha.

Ebe Russia busere ngwaagha kemgbe na ebe ọhụrụ ha batara

Ntụpọ ojii bụ ebe ọhụrụ na batara ebe nke mmemme bụ ebe ha nọbụ

Mapu Ukraine be Russia nọ

N'otu aka ahụ ọdeakwụkwọ mba ofesi ndị UK bụ Liz Truss ga-eme njem na Moscow n'ime izuụka abụọ na-abịa dịka ụlọọrụ nnọchite anya mba Russia na Uk siri kwuo.

Johnson sị ndị agha na ndị isi ọrụ nchekwa ya ka ha bunye ya uche a ga-eji kpezie okwu a bụ nke Russia na-eme ndị mmadụ obi ịwammiri.

Ọ bụ ihe ndị a ka Johnson na-eche na ngwụcha izuuka a nke gụnyere ịbugakwu ndị agha ga-enyere NATO aka.

A na-ebo Chris Brown ebubo idina nwaanyị n'ike

Chris Brown

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwaanyị agbaala Chris Brown bụ otiegwu a ma ama akwụkwọ dịka ọ na-ebo ya ebubo idina ya n'ike.

Nwaanyị ahụ a na-akpọghị ezigbo aha ya, kwuru na Brown tinyeere ya ọgwụ ike mere ka ọ rahụ ụra, ma dina ya n'ike n'elu ụgbọmmiri, n'ụbọchị 30 nke ọnwa Disemba 2020.

N'akwụkwọ nwaanyị ahụ a sị bụ ọgbaegwu gbara ya, ọ na-ekwu ka Brown kwụọ ya nde dọla iri abụọ ($20m).

BBC nwara ịnụta n'ọnụ ndị na-achịkọta mkpa Chris Brown, mana ha asabeghi ruo ugbua.

Chris Brown na onwe ya dere ihe a na-eche bụ ọsịsa ya n'Instagram ya, ebe o kwuru na ọ dịka a na-agba ya akwụkwọ maka na ọ na-etiputa egwu ọhụrụ.

O dere sị "Ọ KWA UNU NA-AHỤ ETU O SI EMEKARỊ... mgbe ọbụla m na-etiputa egwu ọhụrụ maọbụ ewepụta ọrụ ọhụrụ."

Nwaanyị ahụ sị na ọ "na-atụ ụjọ ndụ na ọrụ ya", sị na ya bụ mwakpo mere mgbe ọ gara oringo a kpọrọ n'elu ụgbọmmiri otiegwu ọzọ a kpọrọ Diddy.

Onye bụ Chris Brown?

Chris Brown bụ ode egwu, ọgba egwu nakwa otiegwu a ma ama na mba Amerịka.

O ritela nturugo karịrị otu nde maka itiegwu, nke gụnyere otu Grammy.

N'agbanyeghi na ọ bụ onye aha ya na-ada ụda, o metebuola ọtụtụ ihe aka ndị uweojii ji kpara ya, nke gụnyere ịlụ ọgụ.

Onyeisiala Naịjiria etiela ndị ọkụ gbara ngwongwo ha n'Ọnịcha aka n'obi

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Na Naịjiria, Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ndị ọkụ gbara ngwongwo ha n'ahịa Main Market na Relief dị n'Ọnịcha, aka n'obi.

N'ozi o si n'aka Femi Adesina bụ ọnụ na-ekwuru ya gbasaa, Buhari nyere gọọmentị steeti ahụ na ụlọọrụ gọọmentị etiti ndị ọzọ iwu ka ha gbatara ndị ihe mere ọsọ enyemaka.

Ọ gakwara n'ihu rịọ ndị nkịtị nakwa ndị ọrụ Bekee ka ha gbalịa gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ọkụ na-agba n'Onịcha

Ebe foto si, Screengrab

Amabeghi kpọmkwem ihe butere ya bụ ọkụ gbara na Main Market n'ụbọchị Tọzde, mana ọ bụ tanka bu mmanụ agbịdị dara ada mụnyere ọkụ nke gbara n'ahịa Relief n'ụbọchị Fraịde, Jenụwarị 29 2022,.

Ya bụ tanka dara ebe a na-akpọ Obodoukwu Junction, nso ebe a na-ere ihe ọṅụṅụ na-edozi ahụ bekee kpọrọ 'beverages', n'ahịa Relief.

'Russia iwakpo Ukraine ga-abụkwa ajọ ihe' - Mba Amerịka

Ọchịagha Mark Milley

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ọchịagha Mark Milley sị na ọ ga-adị ezigbo njọ ma Russia wakpoo Ukraine

Na mba Amerịka ka Mark Milley bụ otu ọchịagha mba Amerịka na-ekwu na Russia iwakpo mba Ukraine ga-abụ ajọ mkpamkpa nwereike ibute ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

Russia agọọla na ha achọghị iwakpo Ukraine, mana Ọchịagha Milley sị na ndị agha otu puku narị nọ nso okeala mba Ukraine, bụ nke kachasị kemgbe agha 'Cold War'.