Burkina Faso coup: Ecowas ekewapụla Burkina Faso n'otu ha

Ebe foto si, Reuters
Dịka Onitsha na-ebe akwa maka ọkụ ọgbụgba n'Anambra steeti, Onyeisi ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na mba Burkina Faso ekwuola okwu mbụ ya kemgbe ha napụchara ọchịchị n'ike na mba ahụ.
Lt-Col Paul-Henri Damiba bụ onye agha nnupuisi na mba ahụ sị na ha ga-enye hachi ọchịchị n'aka ndị nkịtịti ozugbo ihe dịchara mma.
Cheta na Paul-Henri Damiba na ndị agha ya chụdere gọọmentị Roch Kaboré ụbọchị Mọnde gara aga.
Dimba sị na inwe ha bụ na Kabore na gọọmentị ya enweghị ike ịkwụsị ndị omekatara ihe pụọ ụjọ na-enye obodo ha mmekpe ahụ.
O kwuru okwu mbụ ya tupu ndị isiala mba Ndida anaynwụ Afrịka e nwee nzụkọ mberede bụ ebe ha nọ kpọọ oku katọọ ya bụ mweghara ọchịchị n'ike na mba ahụ.
Ụbọchị Fraịde ka ndị mba Ecowas dị mba iri na ise kpachapụrụ Burkina Faso n'otu ahụ maka akaike ha jiri weghara ọchịchị.
Na mbido ya bụ ọgbakọ na onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo tiri mkpụ sị na " ajọ agwa ọhụrụ ndị agha ịweghara ọchịchị n'ike na mpaghara anyị bụ ihe ọjọọ megide ọchịchị onye kwuo uche ya na West Africa. Ọ na-eche aka mgba nye udo na nchekwa na mpaghara anyị a".
Burkina Faso bụ mba nke atọ e nweghaara ọchịchị n'ike na West Africa mgbe Guinea na Mali mechere nke ha.
Ecowas amachielarị mba ndị a iji mee ka ndị agha ahụ nweghaara ọchịchị mịghachi mma ha n'ọbọ.
N'okwu ya, ya bụ nwaadị gbara afị iri anọ na otu bụ Lt-Col Damiba kwere ndị mbaụwa nkwa na ha ga-enyechị ọchịch n'aka ndị nkịtị mgbe ihe niile haziri onwe ya".
Ọ sị na ya na ndị nnọchịte anya mgbara ọrụ niile ga-ezoko iji mara mgbe ya bụ ọchịchị ga-agafe aka.
Akụkọ gbasara Burkina Faso dị na mgbada akụkọ a
Etu ọkụ si gbapịa ụlọ ndị mmadụ oge Tanker bu mmanụ ụgbọala dara n'Onitsha

Otu nnukwu ụgbọala bu mmanụ 'petrol' adaala ma kpata nnukwu ọkụ ọgbụgba n'okporoụzọ awarawara si Ọnịcha gawa Owere, taa bụ Fraịde.
Onye hụrụ ihe a merenụ kwuru na ya bụ ụgbọala dara na mpaghara a na-akpọ Obodoukwu 'junction'.
Ya bụ ọkụ ọgbụgba si n'ụgbọala ahụ banye n'ime ụlọ ndị mmadụ nakwa ụlọahịa dị n'okirikiri ahụ.
Ọkụ ahụ ka na-agba dịka onye ntaakụkọ anyị na-ezitere anyị ozi.
Oge onye ntaakụkọ anyị nọ ebe ahụ, ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ abaịbeghị.
Otu onye aha ya bụ tinyekwara onyonyo ọkụ ahụ n'akara twitter ya ma kwuo na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ abịabeghị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
O nwebeghị onye ma kpọmkwem ihe kpatara ụgbọala 'tanker' ahụ ji daa.
Mpaghara ebe ọkụ a na-agba bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-anọ.

Ebe foto si, Screengrab
Ọ dị nso na nnukwu ahịa a na-akpọ 'Relief Market', ebe a na-ere ihe ọṅụṅụ na-edozi ahụ bekee kpọrọ 'beverages'.
Enwekwara ọdọ ụgbọala nakwa ụlkọakụ n'okirikiri ahụ.
BBC amatabeghị kpọmkwem ma o nwere onye merụrụ ahụ n'ọkụ ọgbụgba ahụ.
Lee etu ya bụ ọkụ si mebie ụlọ nakwa ụlọahịa ndị mmadụ:

Ebe foto si, Screen grab




Akụkọ ka na-abịa.
Ọchịagha nọ n'isi mweghara ọchịchị nke mba Burkina Faso ezipụtala ozi nke mbụ ya

Ebe foto si, Reuters
Ọchịagha nọ n'isi mweghara ọchịchị e mere na mba Burkina Faso n'ụbọchị Mọnde bụ Paul-Henri Damiba ezịpụla ozi nke mbụ ya nye ndị mba ahụ n'ụbọchị Tụzde.
N'ihe onyonyo o zipụrụ site na ụlọọrụ mgbasa ozi gọọmentị mba ahụ, o kwuru na ihe mere o ji weghara ọchịchị n'ike ebe ahụ bụ maka na Onyeisiala ọchụpụrụ bụ Roch Kaboré mere oke anya ụra na ibuso ndị agha nnupụisi alakụba na-akpa ike ebe ahụ agha.
N'ozi ya, o kwuru,"Mgbe oge ya ruru, aga m enye ohere ka ndị mba anyị mee mkpebi etu ndị nkiti ga-esi lọghachịte n'ọchịchị"
Damiba dị afọ 41 kwuru na ya na ndị nwere agba na mba ahụ na ngalaba gọọmentị dị ịcheịche ga-enwe mkparịtaụka maka etu ha ga-esi hazigharịa mba ha maka ọganihu.
O kwukwara sị, "A na m arịo mba ndị dị ịcheịche ka ha tinyere anyị aka na-ihazi mba anyị ka anyị nwee ike pụta na ọgbaghara anyị nọ ngwangwa".
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mba ụwa dị ịcheịche katọrọ mweghara ọchịchị ndị agha mere ebe ahụ.
Cheta na Damiba bu agha mba ahụ na-ebuso ndị agha nnupụisi ebe ahụ n'isi kamgbe, nke mere o ji dee akwụkwọ maka nke a n'afọ gara aga.
Mweghara ọchịchị si n'aka ndịagha emela na mba Afrịka dị ịcheịche na nso nso a nke gụnyere:
•Mba Sudan - Epreelụ, 2021
•Guinea - Septemba, 2021
•Mali - Mee, 2021
•Chad - Epreelụ, 2021
Mba France adọọla mba Kenya aka na ntị maka mwakpoo

Ebe foto si, Reuters
Ụlọ nnọchịte anya mba France na Kenya adọla ha aka na ntị maka mwakpoo ha atụ anya ndị oyi ndụ egwu ga-eme na Kenya n'oge na adighị anya. Ozi ha kwuru na mwakpoo a nwereike ịkacha metụta ndị mbịarambrịa sị mba ofesi.
Ụlọ nnnọchịte anya a gwara mba Kenya n'ụbọchị Tọọzde ka ha kee nkwụcha hụ na atụmatụ ndị oyi ndụ egwu emezughị na mba ha.
Ozi a gara n'ihu kwuo na ndị oyi ndụ egwu a zitere ọtụtụ ozi mmaji na iyi ndụ egwu nye ha ma kwuo na ha nwereike iwakpoo ebe mepere emepe ebe ndị mbịarambịa sị mba ofesi kacha aga nke gụnyere ụlọezumike, ụlọ egwuregwu, ebe a na-ere nrị, ebe a na-ekpori ndụ nakwa n'ụlọahịa ndị nọ n'isi obodo mba ahụ bụ Nairobi.
Mba Netherlands na mba Germany etinyekwala ọnụ n'okwu a gwaa ndị mba ha nọ na Kenya ka ha kpachapụ anya n'oge a dị egwu.
Ndị uweojii mba Kenya ekwuola na ha kwụ chịm n'ọrụ nchekwa ịhụ na Kenya nwere ncxhekwa zuru oke.














