Onitsha Fire: Gọọmentị Anambra steeti agbachiela ọdọ mmanụ ụgbọala gbara ọkụ n'Onitsha

Ọkụ gbara filling station n'Onitsha

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Willie Obiano gara njem nleta n'ebe ọkụ gbara ọdọ mmanụ ụgbọala na Borromeo roundabout, Onitsha

Gọọmentị Anambra steeti agbachiela ma weghara ọdọ mmanụ ụgbọala ahụ gbara ọkụ n'Onitsha ụbọchị Sọnde.

Mgbe Gọvanọ steetị ahụ bụ Willie Obiano gara ebe ahụ iji anya ya hụ ihe mere ka ọnyere iwu ahụ.

Obiano kwuru ka ndị mmadụ kwusi ịrụ ọdọ ụgbọ mmanụ ụgbọala n'akụkụ ebe obibi ndị mmadụ.

A na-akọwa na ọ bụ mgbe ndị nwe ya na-ebutu gasị na-ebe ahụ ka ya bụ Chris Tee na Silver Fuel Station ghọọrọ ọkụ were gbaa pịapịa na Borromeo roundabout.

Lee mkpamkpa ọkụ kpara n'ọdọ mmanụ ụgbọala dị n'Onitsha

Ọkụ gbara ọdọ mmanụ ụgbọala karịrị otu n'Onicha
Nkọwa foto, Ọkụ ahụ malitere gbawa n'elekere asaa nke mgbede December 12, 2021

Onyeisi ndị ọrụ nchekwa mmenyụ ọkụ bụ Martin Agbili zipụtara ozi kwuo na ọ bụ ezikwuo na ọkụ gbara ọdọ mmanụ ụgbọala abụọ bụ 'Chris-Tee na Silver Fueling Stations' dị na Awka road, dịketere Borromeo/Ziks Roundabout, Onitsha.

N'akwụkwọ ozi ya Maazị Agbili kwuru na ha nụrụ ozi gbatagbata maka ọkụ ọgbụgba mere n'ebe ahụ ebe oji ọkara gafee elekere asaa nke abali.

O kwuru na ha mere ngwangwa ziga ụgbọala anọ eji emenyụ ọkụ ebe ahụ.

Ọ gbara ama na enweghi onye ọbụla ọkụ a gbagburu maọbụ merụọ ahụ mana na ya bụ ọkụ gbara ụgbọala 'Tanker' abụọ nakwa ụgbọala nkiti asaa nọ nso ebe ahụ.

Akwụkwọ ozi ya kwukwara na akụkọ ndị na-efeghari na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa na-emenyụ ọkụ sị Delta steetị bụ ndị bịara menyụọ ya bụ ọkụ bụ akụkọ ụgha.

O kwukwara na akụkọ ndị si na ha adighi njikere bịa bụ akụkọ ụgha dịka ọ kwuru na ha nọ n'ịgba mbọ mmenyụ ọkụ a ruo ihe ji ọkara gafee elekere otu nke isi ụtụtụ.

N'okwu ya, o kwuru na ha ka nọ ebe ahụ n'ụtụtụ Mọnde a agba mbọ imenyụcha ọkụ ahụ kpam kpam.

Ihe anya hụrụ ọkụ ọgbụgba a merenụ kọrọ BBC Igbo

Ọkụ gbara ọdọ mmanụ ụgbọala karịrị otu

Ebe foto si, Screen grab

Ihe karịri ụgbọala isii bụ ihe oke ọkụ a gbara ebe ahụ metụtara.

Ndị nọ ebe ahụ mgbe ihe a mere gwara BBC Igbo na tupu ndi ọrụ gbatagbata a bịa na ndị mmadụ gbara mbọ were ikuku e ji emenyụ ọkụ bụ "fire extinguisher" wee belata ya bụ ike ọkụ ahụ.

E kwukwara na ihe so mụbawanye ọkụ ahụ bụ ụgbọala 'tanker' bu mmanụ nọ n'ime ya bụ ọdọ mmanụ ụgbọala.

Ndị ọrụ nchekwa "Rapid Response Squad" awụchịela ebe ahụ ugbua nakwa nke ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bụ "Fire service" dịka a ka na-agba mbọ imenyụ ya bụ ọkụ kpamkpam.

Ọkụ gbara ọdọ mmanụ ụgbọala karịrị otu n'Onicha

BBC Igbo na-agba mbọ ịnọ ọnụ ndị ọrụ nchekwa na nke ndị gbatagbata ịnụ ozi ma ihe mberede a emerụrụ onye ọbụla ahụ.

Dịka ha ka nọ n'ọrụ, ha enwebeghi ohere zipụta ozi banyere nke a.

Ọke ọkụ gbara ebe abụọ a na-emepụta gasị nakwa ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'Ọnịcha, n'ụbọchị Sọnde.

Ihe mberede a malitere n'ebe elekere asaa nke abalị Sọnde bụ December 12, 2021.

Ọkụ a malitere n'elekere asaa nke mgbede December 12, 2021
Nkọwa foto, Ọkụ a malitere n'elekere asaa nke mgbede December 12, 2021

Ndị orụ gbata gbata nyekwara aka imenyụ ya bụ ọkụ.

Ugbua, amabeghi ma ihe a merenụ egburu onye ọbụla maọbụ merụọ ha ahụ.

Amabeghị ihe kpalitere ya bụ ọkụ.