Onitsha News: Etu tanker si gbaa ụgbọala 15 ọkụ n'Ọnịcha ụnyahụ

Ụgbọala bu ngwa ahịa suru Ụgbọala bu mmanụ agbịdị n'azụ kpasuru ọkụ gbara ọtụtu ụgbọala n'okporoụzọ awaraawara sị Ọnicha gawa Enugu, na'akụkụ Tarzan Ifeanyichukwu ụnyahụ bụ ụbọchị ụka.
Mmanụ ọkụ ahụ ka na-agbapụ ruo ugbua mana ndị nọ mgbe ihe mere kwuru na ọ bụ otu onye nwụrụ n'ihe mberede a.
Onye ntakụkọ anyị kwuru na ọtụtụ mmadụ na-achọ ụgbọala ha hapụrụ gbalaga ebe ha na-agba ọsọ ndụ.
Ihe ruru ụgbọala iri na ise nke ụlọọrụ Ifeanyichukwu motors gbara ọkụ dịka onye ntaakụkọ anyị sị hụ.

Ọkụ ahụ malitere n'elekere nke atọ nke ehihie gbagide ruo ime abalị ma pụta n'ụtụtụ taa bụ August 16,2021.
Ndị ọrụ gbata gbata biaruru ọzugbo ihe a mere imenyụ ọkụ ahụ ma kechikwa ebe ahụ makana ndị na-achọ ịbia were ohere ahụ kuwe mmanụ ụgbọala.

Ruo ugbua enwebeghị akwụkwọ ozi maọbụ ihe gọọmenti Anambra kwuru maka ọdachị a.
Ndị uweojii ekwubeghị ihe ọbụla maka ya.









